Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Mụọ Nsọ


Mụọ Nsọ

Onye nke atọ na Chukwu (1 Jọn 5:7; OznỌd. 20:28). Ọ bụ onye nke bụ mụọ, na-enweghị arụ nke anụ arụ na ọkpụkpụ nile (OznỌd. 130:22). Kwa mgbe, kwa mgbe a na-atunye Mụọ Nsọ dịka Mụọ ahụ, ma-ọbụ Mụọ nke Chineke.

Mụọ Nsọ na-arụ ọtụtụ ọrụ dị oke mkpa n’ime atụmatụ nke nzọpụta. (1) Ọ na-agba aka-ebe banyere Nna na Ọkpara ahụ (1 Ndị-Kọ 12:3; 3 Nif. 28:11; Ita 12:41). (2) Ọ na-ekpughe ezi-okwu nke ihe nile (Jọn 14:26; 16:13; Moro. 10:5; OznỌd. 39:6). (3) Ọ na-edo ndị ahụ nile na-echegharịwo nsọ na mewo kwa baptism (Jọn 3:5; 3 Nif. 27:20; Moses 6:64–68). (4) Ọ bụ ya bụ Mụọ Nsọ nke Nkwa (OznỌd. 76:50–53; 132:7, 18–19, 26).

Ike nke Mụọ Nsọ nwere ike ịbịakwasị mmadụ tutu baptism ma gbaa aka-ebe na ozi-ọma ahụ bụ ezi-okwu. Mana ikwesị ekwesị nke mmadụ inwe nsiso nke Mụọ Nsọ na-esepụghị aka mgbe ọbụla onye ahụ tozuru oke, bụ onyinye e nwere ike ịnata nanị site na-ibikwasị aka abuọ n’isi site n’onye ji Ọkwa Nchụ-aja Melkizedek mgbe e mesịrị baptism e nwetara ikike ime baa n’ime ezi Nzukọ-nsọ nke Jisus Kraịst.

Jisus kụziri na a ga-agbaghara mmehie nile ewezuga ikwuhie Chineke megide Mụọ Nsọ (Mat. 12:31–32; Mak 3:28–29; Luk 12:10; Ndị-Hib. 6:4–8; OznỌd. 76:34–35).