Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Leviticọs


Leviticọs

Otu akwụkwọ n’ime Testament Ochie nke na-akọ banyere ọrụ nile nke onye nchụ-aja n’Israel. O kwusịrị ike banyere ịdị nsọ nke Chineke n’usoro iwu nile nke ndị ya ga-esi ebi ndụ iji bịa dịrị nsọ. Ebumn’uche ya bụ ịkụzi usoro iwu nile nke mụọ ime ihe ọma na ezi-okwu nke okpukpere chi nile nke iwu Moses site n’usoro mme-mme. Moses dere akwụkwọ nke Leviticọs.

Isi nile nke 1–7 na-akọwa emume nsọ nile nke ichụ-aja. Isi nile nke 8–10 na-akọwa nke ọma usoro mme-mme ahụ e esi edo ndị nchụ-aja nsọ. Isi nke 11 na-akọwa ihe e nwere ike ma-ọbụ na-enweghi ike rie na ihe dị-ọcha ma-ọbụ na-adịghị-ọcha. Isi nke 12 kpara nkata banyere ndịnyom mgbe ha mụrụ nwa ọhụrụ. Isi nile nke 13–15 bụ iwu nile metụtara mme-mme adịghị-ọcha. Isi nke 16 nwere usoro mme-mme ahụ a na-eso n’ụbọchị aja mgbaghara mmehie. Isi nile nke 17–26 nwere usoro iwu nile nke iwu nile gbasara okpukpere chi na mme-mme ọdịnala nile. Isi nke 27 na-akọwa na Onye-nwe nyere Israel iwu ka ha nyefechaa Onye-nwe ihe-ubi ha nile, igwe anụ ha nile na igwe anụmanụ ha nile.