Inwere onwe site na mmehie ma-ọbụ ikpe ọmụma nke mụọ; enweghị-ụta. Mmadụ na-aghọ onye na-enweghị ntụpọ mgbe echiche na omume ya nile dị ọcha n’ụzọ ọbụla. Onye meworo mmehie nwere ike ị̀ghọ onye na-enweghị ntụpọ site n’okwukwe na Jisus Kraịst, nchegharị na ịnata emume-nsọ nile nke ozi-ọma.
Onye ahụ nke nwere obu-aka abụọ dị ọcha na obi na-enweghị ntụpọ ga-anata ngọzi nile nke Onye-nwe, Abụọma 24:3–5 .
Dị nụ ọcha unu ndị na-ebu ngwa-ọrụ nile nke Onye-nwe, Aịsa. 52:11 (OznỌd. 133:4–5 ).
Ngọzi na-adịrị ndị na-enweghị ntụpọ n’obi, Mat. 5:8 (3 Nif. 12:8 ).
Ka ha ra bụ ihe na-enweghị ntụpọ, na-echenụ maka ihe ndị a nile, Ndị-Fil. 4:8 (Ndep. Ok 1:13 ).
Unu nile ndị na-enweghị ntụpọ n’obi, welite isi unu ma nabata okwu mmasị nke Chineke, Jekọb 3:2–3 .
Unu nwere ike ilekwasị Chineke anya n’ụbọchị ahụ jiri obi na-enweghị ntụpọ na aka nile dị ọcha? Alma 5:19 .
Ebe ha dịworo-ọcha na-enweghị ntụpọ n’iru Chineke, ha enweghị ike ilekwasị mmehie anya ma ọ bụghị ma-ọbụ n’ịkpọ nnukwu asị, Alma 13:12 .
Ka a sachaa unu dịka Kraịst siri dị na-enweghị ntụpọ, Moro. 7:48 (Mọm. 9:6 ).
Kraịst ga-akwado nye onwe ya ndị na-enweghị ntụpọ, OznỌd. 43:14 .
Onye-nwe nyere iwu na-aga ewụ ulọ na Zaịọn n’ime ebe ndị dị ọcha n’obi ga-ahụ Chineke, OznỌd. 97:10–17 .
Nke a bụ Zaịọn—ndị ahụ dị ọcha n’obi, OznỌd. 97:21 .