Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Bible


Bible

Nchịkọta edemede nile nke ndị Hibru na ndị otu Kraịst nke ihe dị n’ime ya bụ mkpughe nile di nsọ. Okwu ahụ bible pụtara “akwụkwọ nile ahụ”. Bible bụ ọrụ ọtụtụ ndị amụma na ndị ode akwụkwọ nwere nkwalite nke mụọ n’okpuru omume nke ike na-arụ ọrụ nke Mụọ Nsọ (2 Pita 1:21).

Bible nke ndị otu Kraịst nwere nkewa abụọ a maara dịka Testament nile nke Ochie na nke Ọhụrụ. Testament Ochie ka ihe mejupụtara ya bụ akwụkwọ nile nke akwụkwọ nsọ e jiri n’etiti ndị Juu nke Palestain n’oge ije-ozị Onye-nwe n’arụ na-anwụ anwụ. Ihe dị n’ime Testament Ọhụrụ bụ edemede nke Ọgbọ Ndị-ozi ma a nabatara na ha nwekwara ụdị ịdị nsọ na ikike dịka akwụkwọ nsọ nile nke ndị Juu. Akwụkwọ nile nke Testament Ochie ka e weere site na akwụkwọ agụmagụ nke mba ahụ dọtịri gafee ọtụtụ narị afọ, na a kachasị ide ha n’asụsụ Hibru, ebe akwụkwọ nile nke Testament Ọhụrụ bụ ọrụ nke otu ọgbọ na e dere ha nanị na Grik.

N’ime Testament Ochie, okwu ahụ testament na Hibru nọchitere anya okwu pụtara “ọgbụgba-ndụ”. Ọgbụgba-ndụ Ochie bụ iwu ahụ nke enyere Moses mgbe Israel jụrụ uju nke ozi-ọma ahụ nke ndị nke Chineke ji site na mmalite nke ndụ arụ na-anwụ anwụ. Ọgbụgba-ndụ Ọhụrụ bụ ozi-ọma ahụ dịka Jisus Kraịst kuziri ya.

N’ime Bible Hibru (Testament Ochie) e kewasịrị akwụkwọ ya nile ụzọ atọ, Iwu ahụ, ndị amụma, na edemede nile ahụ. Bible nke ụwa ndị otu Kraịst na-eji, haziri akwụkwọ ahụ nile ka isi-ọkwu siri dị, dịka nke akụkọ, nke ábụ̀ na nke amụma.

Akwụkwọ nile dị n’ime Testament Ọhụrụ n’ọha dị n’usoro a: Ozi-ọma anọ nile, na Ọlụ-Ndị-Ozi; Akwụkwọ ozi nile nke Pọl; Akwụkwọ ozi nile ọha nke Jemes, Pịta, na Jud, na Mkpughe nke Jọn.

Nzukọ nke Jisus Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a na-akwanyere ugwu na-asọpụrụ Bible ma na-ekwusikwa ike na Onye-nwe na-aga n’iru na-enyekwasị mkpughe ndị ọzọ site n’aka ndị amụma ya n’ụbọchị ikpe azụ nile nke na-akwado na na-emesikwa ike nkọwa Bible maka mmeso Chineke na-ebe mmadụ nọ.