Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Osimiri Jọdan


Osimiri Jọdan

Osimiri Jọdan sitere n’oke osimiri nke Galili na-asọ rute na n’Oke Osimiri Nwụrụ-anwụ. Osimiri ahụ dị otu nari kilomita na iri isii n’ogologo, na ọbụ nchịkọta ọtụtụ mmiri si na nkume nke ugwu Hemọn na-asọpụta mejupụtara ya. Ọ bụ osimiri kachasị ịdị mkpa n’Israel.

Ihe abụọ mere eme dị mkpa metụtara osimiri a bụ nkewa nke Onye-nwe kewara osimiri ahụ maka ngafe nke Israel (Josh. 3:14–17), na ime baptism nke Jisus Kraịst (Mat. 3:13–17; 1 Nif. 10:9).