Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Iwu nke Moses


Iwu nke Moses

Chineke nyere ụlọ nke Israel iwu nile site n’aka Moses iji dochie iwu nke kacha elu bụ nke ha na-adawori irubere isi (Ọpụ. 34; NAJS, Ọpụ. 34:1–2; NAJS, Deut. 10:2). Iwu nke Moses jupụtara na ọtụtụ ụkpụrụ nile, usoro nile, mme mme nile, omenala nile, na akara nile iji chetara ndị mmadụ banyere ọrụ nile kwesịrị ha na ihe nile dịịrị ha. Ọ gụnyere iwu nke mụọ ime ihe ọma, ime ezi-omume, okpukpere chi, na iwu-nsọ nile nke ihe a na-ahụ anya na omume nile—gụnye kwa ịchụ-aja nile (Lev. 1–7) ndị nzube ha bụ ichetara ndị mmadụ maka Chineke na ọrụ ha n’ebe ọ nọ (Mosa. 13:30). Okwukwe, nchegharị, ime baptism n’ime mmiri, na nsacha nke mmehie nile bụụrụ mpaghara iwu ahụ, dịka ọ dịịrị n’íwu-nsọ iri na ọtụtụ iwu-nsọ nile nke nwere nnukwu uru ime ezi-omume na mụọ ime ihe ọma. Ọtụtụ n’ime iwu mmemme mezuru n’ọnwụ na mbilite n’ọnwụ nke Jisus Kraịst, nke kwụsịrị ịchụ-aja site n’ịkwafu ọbara (Alma 34:13–14). E siri n’okpuru ọkwa nchụ-aja Erọn lekọta iwu ahụ, na ọ bụụrụ ozi-ọma nke njikere nke ga-eweta ndị nile natara ya nye Kraịst.