Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Baptism maka ụmụ-aka amụrụ ọhụrụ


Baptism maka ụmụ-aka amụrụ ọhụrụ

Omume nke na-abaghị uru bụ nke ime ụmụ-ntakịrị a mụrụ ọhụrụ baptism bụ ndị na-erubeghị afọ nke nkọwasị, nke bụ itoru afọ asatọ. Onye-nwe megidere ime ụmụ-aka a mụrụ ọhụrụ baptism (Moro. 8:10–21). Ụmụ-ntakịrị dị-ọcha na-ọmụmụ ha na-enweghị mmehie. Setan enweghị ike ịnwa ụmụ-ntakịrị ruo mgbe ha ga-etozu ikwuru ọnụ ha, (OznỌd. 29:46–47) ya mere ha enweghị mkpa ichegharị ma-ọbụ ime ha baptism. E kwesịrị ka e mee ụmụ-ntakịrị baptism mgbe ha nọrọ afọ asatọ (OznỌd. 68:25–27).