Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Lụọ Alụlụ, Ọlụlụ di na nwunye


Lụọ Alụlụ, Ọlụlụ di na nwunye

Ọgbụgba-ndụ iwu kwadoro ma-ọbụ nkwekọrịta n’etiti otu nwoke na otu nwanyị nke na-eme ha di na nwunye. Ọlụlụ di na nwunye bụ ihe Chineke chiri echi (OznỌd. 49:15).

Ọgbụgba-ndụ ọhụrụ na mgbe nile na-adigide nke ọlụlụ di na nwunye

Ọlụlụ di na nwunye e mere n’okpuru iwu nke ozi-ọma na nke ọkwa nchụ-aja dị nsọ bụ maka ndụ nke arụ na anwụ-anwụ na maka ebighi-ebi. Ndị nwoke na ndị nwanyị tozuru oke, e si otua rachie n’ime temple n’ọlụlụ di na nwunye nwere ike ịga n’iru dịka di na nwunye n’ime ebighi-ebi nile.

Ọlụlụ di na nwunye n’ime okwukwe dị iche iche

Alụlụ n’etiti onye nwoke na onye nwanyị nke okpukpe-chi na omume dị iche iche.

Alụlụ ọtụtụ nwunye

Alụlụ nke otu di nye-nwunye abụọ ma-ọbụ karịa. Ọbụ ihe iwu kwadoro maka otu nwoke inwe otu nwunye, ewezuga ma Onye-nwe nyere iwu-nsọ n’ụdị ọzọ site na mkpughe (Jekọb 2:27–30). Site na mkpughe e mere omume nke alụlụ ọtụtụ nwunye n’oge nile nke Testament Ochie na na mmalite ụbọchị nile nke Nzukọ-nsọ e weghachiri site na nduzi ụzọ nke onye-amụma onye jidere ọtụghe-ụzọ nke Ọkwa Nchụ-aja (OznỌd. 132:34–40, 45). A naghịkwa eme omume ahụ n’ime Nzukọ-nsọ (OznỌd. IỌỤ—1); taa, ọ gaghị ekwe omume bụ onye nwere karịa otu nwunye ịbụ onye-otu n’ime Nzukọ nke Jisus Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a.