Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Smith, Joseph Nta


Smith, Joseph Nta

Onye-amụma ahụ a họọrọ ka o weghachi ezi Nzukọ-nsọ nke Jisus Kraịst n’elu ụwa. A mụrụ Joseph Smith na Steeti nke Vermont dị n’ime United Steeti nile nke Amerika na o bikwara ndụ site 1805 ruo 1844.

Na afọ 1820, Chineke Nna na Jisus Kraịst pụtakwutere Joseph, ọ mụtakwara n’ọdịghị otu n’ime nzukọ-nsọ nile n’elu ụwa bụụrụ ezi-okwu (A—JS 1:1–20). E mesịa onye mụọ-ozi Moronaị letara ya, onye kpugheere ya ebe nzolite nke epekele ọla-edo nile nke nwere akụkọ-ndekọta nke ndị mgbe ochie mba ukwu Amerịka (A—JS 1:29–54).

Joseph tụgharịrị asụsụ nke epekele ọla-edo nile ahụ na n’ime afọ 1830 bipụtara ha dịka Akwụkwọ nke Mọmọn (A—JS 1:66–67, 75). N’afọ 1829, ọ natara ikike nke ọkwa nchụ-aja site n’aka Jọn ome baptism na site n’aka Pịta, Jemes na Jọn (OznỌd. 13; 27:12; 128:20; A—JS 1:68–70).

Dịka Chineke duziri ụzọ, na 6 Epril 1830, Joseph na ọtụtụ ndị ọzọ haziri Nzukọ-nsọ nke Jisus Kraịst nke e weghachiri azụ (OznỌd. 20:1–4). N’okpuru nduzi nke Joseph, Nzukọ-nsọ toro n’ime Canada, England, na na mpaghara ọwụwa-anyanwụ nke United Steeti nile, nke ka nke n’ime Ohio, Missouri, na Illinois. Mkpagbu di-egwu sogidere Joseph na Ndị-nsọ n’ebe-obula ha nọdụrụ. Na 27 Jun 1844, Joseph na nwanne ya nwoke Hyrum bụụrụ ndị e gburu-egbu n’ihi okwukwe ha n’ime Ụlọ-Mkpọrọ Carthage, Illinois, di n’ime United Steeti nile nke Amerika.

Akwụkwọ-nsọ nke Onye-amụma Joseph Smith wepụtara

Joseph tụgharịrị asụsụ mpaghara nile nke epekele ọla-edo ahụ nke e nyere ya site n’aka mụọ-ozi Moronaị, ntụgharị asụsụ ahụ bụ nke e bipụtara n’afọ 1830 dịka Akwụkwọ nke Mọmọn. Ọ natakwara ọtụtụ mkpughe nile site n’aka Onye-nwe na-akapụta ntọ-ala ozizi nile na nhazi nke Nzukọ-nsọ ahụ. Ọtụtụ n’ime mkpughe ndị a ka a chịkọtara n’ime ihe nke matara ugbụ a dịka Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile. Ọ bụụrụ kwa ya hụrụ maka iwepụta Ọla Pel nke Oke Ọnụ-ahịa, nke na-enwe ntụgharị asụsụ nile nwere nkwalite nke Mụọ Nsọ nke ụfọdụ n’ime edemede nile nke Moses, Abraham, na Matiu, nhọrọ nile sitere n’akụkọ nke onwe ya na ịgba-ama, na ndepụta iri na atọ nke ozizi na nkwenye nke Nzukọ-nsọ kweere.