Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Mụọ


Mụọ

Mpaghara nke onye dị ndụ nke dị-adị tutu ọmụmụ nke arụ na-anwụ anwụ nke na-ebi n’ime-arụ nke a na-ahụ anya n’ime oge ịnwụ anwụ, na nke na-anọgide mgbe mmadụ nwụsịrị dịka onye nọdụrụ iche ruo na mbilite n’ọnwụ. Ihe dum dị ndụ, mmadụ, anụmanụ na ahịhịa nile—bụụrụ mụọ nile tutu ụdị ndụ ọbụla a dịrị n’elu ụwa (Jen. 2:4–5; Moses 3:4–7). Arụ nke mụọ áhụ̀ na-adị dịka arụ nke a na-ahụ anya (1 Nif. 11:11; Ita 3:15–16; OznỌd. 77:2; OznỌd. 129). Mụọ bụ íhé, kama ọ dị mma karịa ma-ọbụ enweghị ntụpọ karịa ihe eji mee ihe na-anwụ anwụ ma-ọbụ íhé OznỌd. 131:7.

Mmadụ ọbụla bụ nwa-nwoke ma-ọbụ nwa nwanyị nke Chineke mụrụ, ebe ọbụ na a mụrụ ya dịka mụọ nye Nne na Nna nke Elu-igwe tutu nne na nna na-anwụ anwụ a mụọ ya n’elu ụwa (Ndị-Hib. 12:9). Onye ọbụla n’elu ụwa nwere arụ nke mụọ na-adịghị anwu-anwu tinyere arụ nke anụ arụ na ọkpụkpụ. Dịka a kọwara ya oge nile ụfọdụ n’ime akwụkwọ-nsọ, mụọ ahụ na arụ nke arụ a na-ahụ anya na-ejikọta ọnụ bụrụ mkpụrụ-obi (Jen. 2:7; OznỌd. 88:15; Moses 3:7, 9, 19; Abr. 5:7). Mụọ nwere ike ibi ndụ na-ejighị arụ nke arụ ana-ahụ anya, kama arụ nke arụ ana-ahụ anya enweghị ike ibi ndụ na-ejighị mụọ ahụ (Jemes 2:26). Ọnwụ nke arụ bụ nkewa nke mụọ site na arụ. Na mbilite n’ọnwụ mụọ ahụ ka a na-ejikọtagharị ya na otu arụ ana-ahụ anya nke anụ arụ na ọkpụkpụ ahụ nke o nweere dịka nke na-anwụ-anwụ, nwere kwa ọdị iche abụọ pụtara ìhè; ha agaghị ekewa ọzọ, na arụ nke arụ a na-ahụ anya ga-adị anwụghị-anwụ na zuo-oke (Alma 11:45; OznỌd. 138:16–17).

Ajọọ mụọ nile