Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Mụọ-ozi nile


Mụọ-ozi nile

Enwere ụdị ndị abụọ n’ime elu-igwe ndị a na-akpọ ndị mụọ-ozi; ndị ahụ nke bụ mụọ nile na ndị ahụ nke nwere arụ nke anụ arụ na ọkpụkpụ. Mụọ-ozi nile bụ ndị mụọ na-enwetabeghị arụ nke anụ arụ na ọkpụkpụ, ma-ọbụ ha abụrụ mụọ nile ndị na-enwetala n’otu oge arụ na-anwụ anwụ na ha na-echere mbilite n’ọnwụ. Mụọ-ozi nile ndị nwere arụ nke anụ arụ na ọkpụkpụ a bụrụla ndị biliworo site n’ọnwụ ma-ọbụ ndị enwogharịworo enwogha.

E nwere ọtụtụ nrụ-aka n’akwụkwọ-nsọ nile banyere ọrụ ndị mụọ-ozi. Mgbe ụfọdụ ndị mụọ-ozi na-ekwu okwu jiri olu-okwu egbe-elu-igwe mgbe ha na-enyefe ozi nile nke Chineke (Mosaịa 27:11–16). Ndị ezi-omume bụ mmadụ na-anwụ anwụ ka e nwere ike ịkpọ ndị mụọ-ozi (NAJS, Jen. 19:15). Ụfọdụ ndị mụọ-ozi na-eje ozi gburu-gburu oche-eze Chineke n’ime elu-igwe (Alma 36:22).

Akwụkwọ-nso nile na-ekwu kwa banyere mụọ-ozi nile nke ekwensu. Ndị a bu mụọ-ozi ahụ nile ndị soro Lusifa, ma e wee chụpụ ha site n’iru Chineke n’ime ndụ tutu e nwee anụ arụ, ma tụda ha n’elu ụwa (Mkpu. 12:1–9; 2 Nif. 9:9, 16; OznỌd. 29:36–37).