Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Taịtọs, Akwụkwọ-ozi e degaara


Taịtọs, Akwụkwọ-ozi e degaara

Mgbe inwere-onwe nke na-agaghị adịgide nke Pọl nwere site na mkpọrọ ndị Rom, o dere akwụkwọ-ozi ahụ nye Taịtọs, onye nọọrọ na Kret. Leta ahụ kparịtara ụka zuru-ezu banyere ajụjụ nile metụtara ezigbo ọzụzụ n’ime na nhazi nke Nzukọ-nsọ.

Isi nke 1 nwere ekele nke Pọl ya na kwa nkụzi nile na ntozu nile n’ọha maka ndị ụkọchukwu na-elekota ngalaba Nzukọ-nsọ. Isi nile nke 2–3 nwere ọha nkụzi nile na ozi nile nke onwe nye Taịtọs banyere mmeso kwesịrị ọgbakọ dị iche iche n’ime Nzukọ-nsọ nke ndị Kret. Pọl gbara Ndị-nsọ ahụ ume ka ha merie nduhie, na-adị nwayọọ na kwesi ntụkwasị-obị na idozi iru n’ezi ọrụ nile.