Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ịdị-ọcha na adịghị ọcha


Ịdị-ọcha na adịghị ọcha

N’ime Testament Ochie, Onye-nwe kpugheere Moses na ndị Israel agba ochie na ọ bụ nanị ụfọdụ nri ka e chere dị ọcha ma-ọbụ n’okwu nile ọzọ, kwesịrị ka e rie erie. Ikpa oke ndị Israel mere n’etiti ịdị ọcha na-adịgh-ọcha nwere nnukwu mmetụta n’okpukpe chi na ibi ndụ ha. Anụmanụ ụfọdụ, anụ ufe, na azụ ka e weere dị ọcha na kwe nnabata iri-eri, ebe ndị ọzọ nile na-adịgh-ọcha na egbochiri ha (Lev. 11; Deut. 14:3–20). Ụfọdụ ndị nrịrịa ka e chekwara na ha adịgh-ọcha.

N’echiche nke mụọ, ịdị ọcha bụ inwere onwe site na mmehie na ọchịchọ nile nke mmehie. N’echịche nke a okwu ahụ ka a na-eji akọwa onye ahụ na-eme ezigbo omume, na nwee obi na-enweghi ntụpọ (Abụọma 24:4). Ndị ọgbụgba-ndụ Chineke oge nile na-anata ntuzi-aka nile pụrụ iche ka ha na-adị ọcha (3 Nif. 20:41; OznỌd. 38:42; 133:5).