Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Nauvoo, Illinois (USA)


Nauvoo, Illinois (USA)

Otu nnukwu obodo dị mkpa nke Ndị-nsọ Ụbọchị ndị Ikpe-azụ a hiwere n’afọ 1839 na Steeti nke Illinois. A ga-ahụ ya n’elu Osimiri Mississippi, ihe fọdụrụ ntakịrị ka ọ bụrụ narị kilomita atọ na iri abụọ na mgbago osimiri ahụ site na St. Louis.

N’ihi mkpagbu nile n’ime Steeti nke Missouri, Ndị-nsọ gara ịhe dika narị Kịlomita ato na iri abụọ na mpaghara elu elu ọwụwa anyanwụ, ofe Osimiri Mississippi ahụ na baa n’ime Illinois, ebe ha chọtara ọnọdụ nile kacha ikwado ha. E mesịa Ndị-nsọ zụrụ ala n’ebe dị nso na nnukwu obodo nke Commerce na-emepeghị emepe. Ala nke a bụ ọzara apịtị n’ozuzu nke nwere nanị ụlọ ole na ole dị mfe. Ndị-nsọ mịchapụtara mmiri n’ala ahụ ma rụpụta ebe obibi nile. Joseph Smith kpọbatara ezi na ụlọ ya n’ime otu ebe-obibi e ji osisi rụọ. Aha nnukwu obodo ahụ bụ Commerce ka a gbanwere ka ọ bụrụ Nauvoo, isoro okwu Hibru ahụ maka “mma”.

Ọtụtụ nkeji nke Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile ka e dekọtara n’ime Nauvoo (OznỌd. 124–129, 132, 135). A gwara ndị nsọ ka ha wuo temple na Nauvoo (OznỌd. 124:26–27). Ha wuru temple ahụ na hazie stek nile nke Zaịọn tutu ha a bụrụ ndị a chụpụrụ site n’ebe obibi ha nile n’afọ 1846. Dịka nsonazụ mkpagbu ahụ, Ndị-nsọ hapụrụ ebe ahụ na gaa njem ha mpaghara ọdịda-anyanwụ.