Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 124


Nkeji 124

Mkpughe e nyere Joseph Smith Onye-amụma, na Nauvoo, Illinois, 19 Jenuarị 1841 (History of the Church, 4:274–286). N’ihi mbawanye nke mkpagbu na usọrọ nile, ịwụ n’akwadoghi megide ha site n’aka ndị-ọrụ ọha-na-eze, ndị nsọ abụrụwo ndị akwagidere ịhapụ Missouri, iwu-nke-mkpochapụ bụ nke Lilburn W. Boggs, onye na-achị ala nke Missouri nyere, nke enyere oge ya ka 27 Oktoba 1838, mere ha enweghị ohere nhọrọ-ozo (History of the Church, 3:175). Na 1841, mgbe e nyere mkpughe nke a, obodo ukwu nke Nauvoo, nke nọọrọ ebe ọnụmara ahụ a na-akpọ Commerce, Illinois, bụ nke ndị nsọ wuworo, na ebe a ka ehiwere isi ụlo-ọrụ nke Nzukọ-nsọ.

1–14, Joseph Smith ka e nyere iwụ ịma ọkwa-dị mkpa nke ozi-ọma nye onye-isi nduzi nke United States, ndị na-achị ala nile, na ndị-ọchịchị, nke mba nile; 15–21, Hyrum Smith, David W. Patten, Joseph Smith Ukwu na ndị-ọzọ n’etiti ndị dị ndụ na ndị nwụrụ-anwụ ka a gọziri maka izu-oke na ezigbo-omume nile; 22–28, Ndị-nsọ ka enyere iwu ịrụ, otu ụlọ maka ịnabata ndị ọbịa, na otu Temple na Nauvoo; 29–36, Baptism maka ndị nwụrụ-anwụ ga-abụ ihe a ga-eme n’ime temple nile; 37–44, Ndị nke Onye-nwe na-ewu temple nile oge nile iji mee emume ndị nzukọ dị-nsọ; 45–55, Ndị-nsọ ka-atọhapụrụ site na iwu temple na Ógbè Jackson n’ihi ọchịchị aka-ike nke, ndị iro ha; 56–83, Ntụzi-aka nile ka e nyere maka owuwu nke Ụlọ Nauvoo; 84–96, Hyrum Smith ka akpọrọ ị bụ onye-isi ezi na ụlọ, ị nata ọtụghe ụzọ nile, na ị nọchi-anya Oliver Cowdery; 97–122, William Law na ndị ọzọ ka enyere ndụmọdụ n’ọkwa-ọrụ ha nile; 123–145, Ndị-ọrụ zụrụ ọha na ndị ụlọ ka akpọrọ aha-ha, ya na ọrụ ha nile na mmekọrita nke ọnụ-ọgụgụ-juru-aka nile.

1 N’ezie, otu a ka Onye-nwe kwụrụ nye gị nwa odibo m Joseph Smith, obi dị m ụtọ na onyinye na nnabata gị nile, nke ị meworo; n’ihi ihe dị otu a ka m ji kpọlite gị, ka m wee gosipụta amamihe m site na ihe nile an’adịghị ike nke ụwa.

2 Ekpere gị nile bụ ihe anabatara n’iru m, ma n’azịza nye ha a si m gị, na-akpọrọ gị ọsọ-ọsọ ka ị maa ọkwa-dị mkpa nke ọzi-ọma, na nke astek nke m hiwere ịbụ ịsị nkume-njikọ nke Zaịọn, nke a ga-eji nlere-anya nke dịka nke òbi-eze asacha-ọcha.

3 Ịma ọkwa nke a ka a ga-eme nye andị-eze nile nke ụwa, n’akụkụ anọ ya, nye onye-isi ala a họtara dị nsọpụrụ, na ndị ọchịchị ọha-na-eze dị nsọpụrụ nke mba ahụ unu nọ n’ime ya, na nye mba nile nke ụwa gbasasịrị n’elu ụwa.

4 Ka e dee ya na mụọ nke aịdị-nwayọ na site n’ike nke Mụọ Nsọ nke ga-adị n’ime gị n’oge nke ị na-ede ya.

5 N’ihi a ga-enye gị ya site na Mụọ Nsọ ị mara uche m gbasara ndị-eze ahụ na ikike nile, ọbụna ihe na-aga ịdakwasị ha oge na-abia.

6 N’ihi, lee, a gam akpọkụ ha na nso a ige-ntị na ìhè na ebube nke Zaịọn, n’ihi oge akara aka eruwo inye ya amara.

7 Ị ga-akpọku ha, ya mere, jiri ịma-ọkwa na-ada ụda, na jiri ịgba-ama gị, n’atụghị ha ụjọ, n’ihi ha dịka aahịhịa ma ebube ha nile dịka okoko osisi nke n’ada ọsọ-ọsọ, ka ha kwa ghara inwe-ụta—

8 Ma ka m wee leta ha n’ụbọchị nke nleta, mgbe m ga ekpughe ihe mkpuchi iru m, ikenye oke nke ndị-ọchịchị-aka-ike n’etiti ndị iru-abụọ, ebe a ga-enwe aịta-ikikere-eze, ọ bụrụ na ha anabataghị ndị odibo m na ọgbụgba-ama nke m kpugheworo nye ha.

9 Na ọzọ, a ga m eleta ma mee ka obi ha dị nro, nke ọtụtụ ha maka ọdị-mma gị, ka ị chọta amara n’irụ ha, ka ha wee bịa na aìhè nke ezi-okwu, na ndị Jentaịlụ abia na mbuli-elu ma-ọbụ nweli-elu nke Zaịọn.

10 N’ihi ụbọchị nke nleta m na-abia ọsọ-ọsọ, n’oge aawa mgbe unu n’echeghi, na olee ebe ga-abụ ebe nchekwa nke ndị m, na ebe-mgbaba maka ndị ahụ ndị a ga-ahapụ n’ime ha?

11 Teta, O ndị-eze nke ụwa! Bịa nụ, O, bịa nụ, jiri ọla edo unu na ọla ọcha unu, na enyem-aka nke ndị m, nye, ụlọ nke ụmụ-ada nke Zaịọn.

12 Na ọzọ, n’ezie a sị m gị, ka nwa odibo m Robert B. Thompson nyere-gị aka ide ịma-ọkwa nke a, n’ihi ihe ya dị m ezi-mma, ma na ọ ga-anọgide gị;

13 Ya mere, ka o, gee nti nye ndụmọdụ gị, na a ga m agọzi ya jiri otụtụ nnukwu ngọzi nile, ka o kwesị ntụkwasị-obi na buru ezịa n’ihe nile site ugbụ a gawa, na ọ ga-adị ukwuu n’anya m abụọ.

14 Mana ka o chetakwa na aọkwa-ọrụ, ya ka m ga-achọ n’aka ya nile.

15 Na ọzọ, n’ezie a sị m gị, ngọzi dịrị nwa odibo m aHyrum Smith, n’ihi mụ Onye-nwe, hụrụ ya n’anya n’ihi bizu-oke nke obi ya, na n’ihi ọ hụrụ nke ahụ dị mma n’iru m n’anya, ka Onye-nwe kwuru.

16 Ọzọ, ka nwa odibo m John C. Bennett nyere-gị aka n’ọrụ gị nke izipu okwu m nye ndị-eze na mmadụ nile nke ụwa ma guzogide gị, ọ bụna gị nwa odibo m Joseph Smith, n’oge mgbe nke mkpagbu gị; na ụgwọ ọru ya a gaghị ada ma ọ bụrụ na ọ nara andụmọdụ.

17 Na n’ihi ịhụn’anya ya ọ ga-adị ukwuu, n’ihi ọ ga-abụ nke m ma o mee nke a, ka Onye-nwe kwụrụ. Ahụwo m ọrụ nke ọruworo, nke m nabatara ma ọ bụrụ na ọ gaa-n’iru, na a ga m e jiri ngọzi nile na ebube kpube ya okpu-eze.

18 Na ọzọ, a sị m gị na ọ bụ uche m ka nwa ọdibọ m Lyman Wight gaa-n’irụ ikwusa-ozi-ọma maka Zaịọn na mụọ nke ịdị-nwayọ, na-ekwupụta m n’irụ ụwa, na a ga m ebụli ya elu dịka na nku nile nke augo nile; na ọ ga-enweta otuto na ugwụ nye onwe ya na nye aha nke m.

19 Ka mgbe ọ ga-arụcha ọrụ ya, a ga m anabata ya nye onwe m, ọbụna dịka m mere nwa odibo m aDavid Patten, onye mụ na ya nọ ugbụ a, na kwa nwa odibo m bEdward Partridge, na kwa agadi nwa odibo m cJoseph Smith Ukwu, onye nọ ya dna Abraham n’aka nri m, na ngọzi na nsọ ka ọ di n’ihi ọ bụ nke m.

20 Na ọzọ, n’ezie a si m gị, nwa odibo m George Miller enweghi aaghụghọ, e nwere ike itụkwasị ya obi n’ihi izu-oke nke obi ya, na maka ịhụn’anya nke o nwere n’ebe ịgba-ama nke m dị mu, Onye-nwe, hụrụ ya n’anya.

21 Ya mere a sị m gị, arachie m n’isi ya ọkwa-ọrụ aotu-ndị ụkọchukwu, dịka nwa odibo m Edward Partridge, ka ọ nata ihe nile enyefechara nke ụlọ m, ka o lebara ngọzi nile nke na-abia n’isi ndị ogbenye nke ndị m anya, ka Onye-nwe kwuru. Ka onye ọbula ghara ịkpọ-nwa odibo m George asị, n’ihi ọ ga-asọpụrụ m.

22 Ka nwa odibo m George na nwa odibo m Lyman, na nwa odibo m John Snider, na ndị-ọzọ, wuo otu aụlọ nye aha nke m, ụlọ nke dịka nwa odibo m Joseph ga-egosi ha, n’ebe ọ ga-egosikwa ha.

23 Na ọ ga-abụ dịka ulọ a ga-ebi nwantakịrị oge, ụlọ ebe-ndị ọbịa nwere ike site n’ebe dị-anya bia-bịrị ebe ahụ, ya mere ka, ọ bụrụ ụlọ dị-mma, kwesịrị ka a nara ya nke ọma, ka aonye-ije ike gwụrụ chọta ahụ-ike na nchekwa mgbe ọ ga-atụle okwu nke Onye-nwe; na kwa bnkume njikọ nke a họpụtara maka Zaịọn.

24 Ụlọ nke a ga-abụ, ụlọ dị-nma obibi ma-ewuo ya n’aha m, na ọ bụrụ na onye na-achị ya nke a ga-ahọpụta nye ya a gaghị ekwe ihe mmerụ ọbụla ịbịa na ya. Ọ ga-adị nsọ ma-ọbụ Onye-nwe Chineke gị a gaghị ebi n’ebe ahụ.

25 Na ọzọ, n’ezie a sị m gị, ka ndị nsọ m nile si ebe dị-anya bịa.

26 Na zipu ndị-ozi n’aga ngwa-ngwa, e, ndị-ozi a họpụtara, na sị ha, bịanụ, jiri ọla-edo unu na ọla-ọcha, na nkume ọke-ọnụ-ahịa unu nile na ihe ọkpụ, na ndị nwere amamihe nke ihe ọkpụ nile, nke ga-abịa, nwere ike bịa, na weta ọsisi-box, na osisi-fir, na osisi-pine, ha na osisi nile dị oke-ọnụ-ahịa nke ụwa.

27 Ma jiri okporo-igwe, na ọla-kọpa, na jiri bras jiri gbam-gbam, na jiri ihe unu nile dị oke-ọnụ-ahịa ndị ọzọ nke ụwa, na wuo ọtụ aụlọ nye aha m, ka Onye Kachasị-elu bbiri ebe ahụ.

28 N’ihi e nweghị ebe achọtara n’ụwa nke ọ ga-abịa na aweghachi-ọzọ nke ahụ furu-efu nye unu, ma-ọbụ nke ahụ o wepụrụ, ọbụna uju nke ọkwa nchụ-aja.

29 N’ihi enweghị aebe e wuru maka ime baptism n’ụwa, ka ha, ndị-nsọ m, nwee ike bmee baptism maka ndị nwụrụ-anwụ—

30 Maka emume-nsọ nke a bụ nke ụlọ m, na a gaghị m anabata ewezuga n’ụbọchị nke ogbenye unu, mgbe unu n’enweghi nke iwu ụlọ n’aha m.

31 Mana e nye m unu iwụ, unu ndị nsọ m nile, ka unu awụọ ụlọ nye m, na e nye m unu oge zuru-oke iwu ụlọ nye m, na n’ọge nke a baptism unu nile a ga m anabata ha.

32 Mana lee, na mgbe ohere nke a gwụrụ, baptism maka ndị nwụrụ-anwụ unu nile a gaghị enweta nnabata site n’aka m, ma ọ bụrụ na unu emeghị ihe ndịa rụo n’ọgwụgwụ ohere ahụ, a gaghị anabata unu dịka nzukọ-nsọ unu na ndị nwụrụ-anwụ unu, ka Onye-nwe Chineke unu kwuru.

33 N’ihi n’ezie a sị m unu, na mgbe unu nwesiri oge zuru-oke iji wuo ụlọ nke m, ebe a ga-eme emume-nsọ nke baptism maka ndị nwụrụ-anwụ, nke esi maka ya hiwe ya tutu mmalite nke ntọ-ala nke ụwa a, baptism nile unu maka ndị nwụrụ-anwụ a gaghị enwe nnabata n’iru m;

34 N’ihi ebe ahụ ka aọtụghe-ụzọ nile nke ọkwa nchụ-aja dị nsọ nwere echichi, ka i nwee ike nata ugwu na otuto.

35 Ma oge nke a gasịa, baptism unu nile maka ndị nwụrụ-anwụ, nke ndị ahụ gbasasịrị na mba ndị ọzọ, a gaghị anabata ha n’iru m, ka Onye-nwe kwụrụ.

36 N’ihi e hiwere ya n’ime Zaịọn, na stek ya nile, na n’ime Jerusalem, ebe ahụ nile nke m họpụtara maka anchekwa, ga-abụ ebe nile maka baptism maka ndị nwụrụ-anwụ unu.

37 Na ọzọ, n’ezie a sị m unu, ole otu m ga-esi a nabata ansacha unu nile n’irụ m, nanị ma unu mere ya n’ime ụlọ nke unu wuru nye aha m?

38 N’ihi na, ọ bụ maka nke a ka m nyere Moses iwụ ka o wuo aụlọ-ụka Israel, ka ha buru ya na-aga n’ọzara, na ka ha wuo bụlọ n’ala ahụ ekwere ha na nkwa, ka emume-nsọ ndị ahụ bụrụ ihe ekpughere nke nọ rịị na-nzuzo tụtụ ụwa a dịrị—

39 Ya mere, n’ezie a sị m unu, na aite mmanụ unu nile, na nsacha unu nile, na bbaptism unu nile maka ndị nwụrụ-anwụ, na ọgbakọ cofufe nro dị nsọ unu nile, na ncheta unu nile maka daja unu nile site n’aka ụmụ nwoke nke Livaị, na maka mkpughe unu nile n’ebe ekachasị-nsọ ebe, unu na-anata mkpakọrịta ụka nile, na iwu edere-ede ndị unu na ikpe nile, maka mmalite nke mkpughe nile na ntọ-ala nke Zaịọn, na maka otuto, nnukwu ugwu, na onyinye dị nsọ nke ndị ya nile ka echiri echichi site na emume-nsọ nke ụlọ nsọ nke m, nke a na-enye ndị m iwu oge nile ka ha wuo nye aha nsọ m.

40 Na n’ezie a sị m unu, ka e wuo ụlọ nke a n’aha m ka m nwe ike ikpughe emume-nsọ m nile ebe ahụ nye ndị nke m.

41 N’ihi e chere m na ọdị nma aikpughe nye nzukọ-nsọ m ihe nile bezoro-ezo site tutu ntọ-ala nke ụwa, ihe nile gbasara ọgbọ cozuzu oge nile akara aka.

42 Na a ga am egosi nwa ọdibo m Joseph ihe nile gbasara ụlọ nke a, na ọkwa nchụ-aja nke ya, na ebe a ga-ewu ya.

43 Na unu ga-ewu ya n’ebe ahụ unu chere iwu ya, n’iru nke ahụ bụ ebe m họọrọ maka unu iwụ ya.

44 Ọ bụrụ na unu e jiri ume unu nile rụọ-ọrụ, a ga m edo ebe ahụ nsọ ka e doo-kwa ya ansọ.

45 Na ọbụrụ na ndị m e gee-nti n’olu m, na n’olu nke aụmụ odibo m ndị nke m họpụtara maka i duzi ndị nke m, lee, n’ezie a sị m unu, a gaghị e wepụ ha n’ọnọdụ ha.

46 Na ọbụrụ na ha e geghị-ntị n’olu m, ma-ọbụ n’olu nke ndị nwoke-ndị a ndị m họpụtara a gaghị a gọzi ha, n’ihi ha na-emerụ ala-nsọ m nile na emume-nsọ m nile, na akwụkwọ iwu-nsọ m nile, na okwu nsọ m nile nke m nyere ha.

47 Na ọ ga-eru na ọbụrụ na unu ewuo ụlọ nye aha m, ma meghị ihe nile nke m kwuru, a gaghị m emezu ain̄u-iyi nke mụ mere nye unu ma-ọbụ imezu nkwa nile nke unu na-atụ anya ya n’aka m abuo, ka Onye-nwe kwuru.

48 N’ihi an’ọnọdụ nke ngọzị, e, site n’ọrụ onwe unu weta nkọcha nile, ọnụma, iwe-ọku, ikpe nile n’elu isi onwe unu nile, site na omume nzuzu unu nile, na site n’ihe arụ unu nile, nke unu na-eme n’iru m, ka Onye-nwe kwuru.

49 N’ezie, n’ezie, a sị m unu, na mgbe m nyere otu n’ime ụmụ nke mmadụ iwu-nsọ ịrụ-ọrụ n’aha m, ma ụmụ nke mmadụ ahụ e jiri ume ha nile na ihe nile ha nwere iji rụọ ọrụ ahụ, na n’akwusịghị aịrụsi-ọrụ ha ike, na ndị iro ha bịakwutere ha ma gbochie ha ịrụ-ọrụ ahụ, lee, ọ dịrị m ihapụ bịchọ ọrụ ahụ n’aka nile nke ụmụ nwoke nke mmadụ ahụ, mana nabata onyinye ha nile.

50 Ma ajọọ-omume ahụ na njehie nke iwu-dị-nsọ m nile na iwu-nsọ nile ka m ga-eji aleta n’isi ndị ahụ gbochiri ọrụ m, ruo na bọgbọ nke atọ na nke anọ, mgbe nile ha cn’echegharịghị, na kpọọ kwa m asị, ka Onye-nwe Chineke kwuru.

51 Ya mere, n’ihi nke a, a nabatawo m onyinye nile nke ndị ahụ m nyere iwu iwulite nnukwu obodo na otu aụlọ nye aha m, na bógbè Jackson, Missouri, ma ndị iro ha egbochie ha, ka Onye-nwe Chineke unu kwuru.

52 Na a ga m akwụghachi aikpe, ọnụma, iwe-ọkụ, ịkwa-akwa, nnukwu mgbu na ita-ikikiri-eze n’isi ha nile, ruo na ọgbọ nke atọ na nke anọ mgbe nile ha n’echegharịghị, ma kpọọ m asị, ka Onye-nwe Chineke unu kwuru.

53 Na nke a ka m mere ihe atụ nye unu, maka ihe iti-aka n’obi nke unu gbasara ndị nile e nyeworo iwu ịrụ-ọrụ ma ha enwee mgbochi site n’aka nile nke ndị iro ha, na ọchịchị aka-ike, ka Onye-nwe Chineke unu kwuru.

54 N’ihi a bụ m Onye-nwe Chineke unu, na a ga m azọpụta ụmụnna unu nile ndị adịrịsị-ọcha n’obi, ndị begbuworo n’ala nke Missouri, ka Onye-nwe kwuru.

55 Na ọzọ, n’ezie a sị m unu, e nye m unu iwu ọzọ iwu aụlọ n’aha m, ọbụna n’ebe a, ka unu bgosi m na unu kwesịrị ntụkwasị-obi n’ihe nile ọbụla m nyere n’iwu, ka m wee gọzie unu, na jiri nnukwu ugwu kpube unu okpu-eze, anwụghị-anwụ, na ndụ ebighi-ebi.

56 Na ugbụ a a sị m unu, gbasara aụlọ m ebe nlekọta nke m nyeworo unu ya n’iwu nsọ maka nlekọta nke ndị ọbịa ka e wuo ya nye-aha m na ka akpọkwasị ya aha nke m, na ka nwa odibo m Joseph na ezi na ụlọ ya nwee ebe obibi n’ebe ahụ, site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.

57 N’ihi ite-mmanụ nke a ka m dotara n’isi ya, ka ngọzi ya bụrụ ihe a ga-edota kwa n’isi nke ụmụụmụ ya na-eso ya.

58 Ma dịka m gwara aAbraham gbasara agbụrụ nile nke ụwa, ọbụna otu a ka m na-ekwu nye nwa odibo m Joseph: Na gị ma na bmkpụrụ gị ka agbụrụ nile nke ụwa ga-anata ngọzi.

59 Ya mere, ka nwa odibo m Joseph na agbụrụ ya na-eso ya nwee ebe obibi n’ụlọ ahụ site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ, ruo mgbe nile na mgbe nile, ka Onye-nwe kwuru.

60 Na ka a kpọọ aha ụlọ ahụ Ụlọ Nauvoo, na ka ọ bụrụ ebe obibi dị nma maka mmadụ, na ebe izu-ike maka onye-ije ike gwụrụ, ka o wee chee echiche maka ebube nke Zaịọn, na ebube nke a, nkume njikọ ya;

61 Ka ọ wee nara kwa ndụmọdụ site n’aka ndị ahụ ndị m dotara ị bụ ka aihe ọkụkụ a ga-ama aha ha, na dịka bndị nche n’elu mgbidi ya nile.

62 Lee, n’ezie a sị m unu, ka nwa odibo m George Miller, na nwa odibo m Lyman Wight, na nwa odibo m John Snider, na nwa odibo m Peter Haws, hazie onwe ha, na họpụta otu onye n’ime ha ị bụ onye-isi nduzi nlekọta ọnụ-ọgụgụ-juru-aka maka ebum n’obi nke iwu ụlọ ahụ.

63 Na ha ga-ede akwụkwọ-iwu ebe ha ga-esi nweta aka-oke maka iwu ụlọ nke ahụ.

64 Na ha a gaghị anata ihe dị-ala karia dọla iri-ise maka otu aka-oke n’ụlọ ahụ, ma a ga-ekwe ha ịnata puku dọla iri na ise site n’aka otu onye maka aka-oke n’ụlọ ahụ.

65 Mana a gaghị ekwe ha ị nata karịa puku dọla iri na ise n’aka-oke site n’aka otu onye.

66 Na a gaghị ekwe ha ị nata ma ọdị-ala karịa dọla iri-ise maka otu aka-oke site n’aka otu nwoke ọbụla n’ụlọ ahụ.

67 Na a gaghị ekwe ha ị nabata nwoke ọbụla dịka onye nwere aka-oke n’ụlọ nke a, m’ọbụghị ma onye ahụ ga-akwụba ụgwọ ya n’aka ha mgbe ahụ ọ na-anata aka-oke ya;

68 Ma n’ịtụnyere ọnụ-ọgụgụ ego nke aka-oke ọ kwụrụ n’aka ha nile ọ ga-anata aka-oke n’ụlọ ahụ, mana ọbụrụ na o nweghị ihe ọ kwụnyere n’aka ha nile ọ gaghị anata aka-oke ọbụla n’ụlọ ahụ.

69 Na ọbụrụ na onye ọbụla a kwụọ ego n’aka ha nile ọ ga-abụ maka aka-oke n’ụlọ ahụ, maka onwe ya, na maka ọgbọ ya na-eso ya, site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ, mgbe nile ya na ndị ga-eketa ihe ya ga-eji aka-oke ahụ, ma a gaghị ere ma-ọbụ nyefee aka-oke ahụ site n’aka ha nile site na mmasị na omume nke onwe ha, ọbụrụ na unu ga-eme uche m, ka Onye-nwe Chineke unu kwuru.

70 Ma ọzọ, n’ezie a sị m unu, ọbụrụ na nwa odibo m George Miller, na nwa odibo m Lyman Wight, na nwa odibo m John Snider, na nwa odibo m Peter Haws, nata aka-oke ọbụla n’aka ha nile, n’ego nile, ma-ọbụ n’arịa ụlọ nke site na ya ha anata ihe ọ pụtara n’ego nile, ha a gaghị eji akụkụ ya ọbụla mee ebum-n’uche ọzọ, nanị n’ụlọ ahụ.

71 Ma ọbụrụ na ha etinye akụkụ nke ego ahụ ebe ọzọ, n’abụghị nanị n’ụlọ ahụ, n’enweghị nkwenye nke onye nwe aka-oke ahụ, ma n’akwughachighi ugboro anọ maka ego ahụ etinyere ebe ọzọ, nanị n’ụlọ ahụ, a ga-abụ ha ọnụ, ma a ga-achụpụ ha site n’ọkwa ọrụ ha, ka Onye-nwe Chineke kwuru, n’ihi mụ, Onye-nwe, a bụ m Chineke, na a gaghị aakwa m emu n’otu n’ime ihe ndịa nile.

72 N’ezie a sị m unu, ka nwa odibo m Joseph zụọ aka-oke n’aka ha nile maka owuwu nke ụlọ ahụ, otu dị ya mma, mana nwa odibo m Joseph a gaghị azụ karịa aka-oke puku dọla iri na ise n’ụlọ ahụ, ma-ọbụ n’ịdị-ala dọla iri-ise, ma-ọbụ onye ọbụla ọzọ, ka Onye-nwe kwuru.

73 Ma ọ dị ndị ọzọ kwa chọrọ ịma uche m gbasara ha, n’ihi ha a jụwo ya n’aka m nile.

74 Ya mere, a sị m unu gbasara nwa odibo m Vinson Knight, ọbụrụ na ọ ga-eme uche m ka o tinye aka-oke n’ụlọ ahụ maka onwe ya na n’ihi ọgbọ ya na-eso ya, site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.

75 Na ka o welite olu ya ọgọlogo-oge na-adasi-kwa-ike, n’etiti ndị mmadụ, aikpepụta ndị ogbenye na ndị nwere mkpa; na ka ọ ghara ịda ma-ọbụ ka obi ya daa mba; na a ga m banabata onyinye ya nile, n’ihi ha a gaghị adị nye m dịka onyinye nile nke Ken, n’ihi ọ ga-abụ nke m, ka Onye-nwe kwuru.

76 Ka ezi na ụlọ ya n̄ụrịa ma tụgharịa obi ha nile site na mkpagbu; n’ihi a họrọwo m ya ma tee ya mmanụ, na a ga-enye ya ugwu n’etiti ụlọ ya, n’ihi a ga m agbaghara mmehie ya nile ka Onye-nwe kwuru. Amen.

77 N’ezie a sị m unu, ka nwa odibo m Hyrum tinye aka-oke n’ụlọ ahụ otu dị ya mma maka onwe ya na ọgbọ ya na-eso ya, site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.

78 Ka nwa ọdibo m Isaac Galland tinye aka-óké n’ụlọ ahụ; n’ihi mụ, Onye-nwe, hụrụ ya n’anya maka ọrụ ahụ ọ rụworo, na a ga m agbaghara mmehie ya nile; ya mere ka echeta ya maka oke ya n’ụlọ ahụ site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.

79 Ka nwa odibo m Isaac Galland bụrụ onye a họpụtara n’etiti unu, ma bụrụ onye echiri-echichi site n’aka nwa odibo m William Marks, na ka ọ gọzie ya, ka ọ gaa ya na nwa odibo m Hyrum ịrụcha ọrụ ahụ nke nwa odibo m Joseph ga-egosị ha, na a ga-enye ha nnukwu ngọzi.

80 Ka nwa odibo m William Marks kwụọ ụgwọ aka-oke n’ụlọ ahụ otu dị ya mma, maka onwe ya na ọgbọ ya site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.

81 Ka nwa odibo m Henry G. Sherwood kwụọ ụgwọ aka-oke n’ụlọ ahụ otu dị ya mma, maka onwe ya na mkpụrụ ya na-eso, site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.

82 Ka nwa odibo m William Law kwụọ ụgwọ aka-oke n’ụlọ ahụ, maka onwe ya na mkpụrụ ya na-eso ya, site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.

83 Ọbụrụ na ọ ga-eme uche m ka ọ ghara ịkpọrọ ezi na ụlọ ya gaa n’ala nile nke ọwụwa anyanwụ, ọbụna ruo Kirtland, otu o sila dị, mụ, Onye-nwe, ga-ewulite Kirtland, mana mụ, Onye-nwe, nwere ị pịa-apịpịa nke akwadoro maka ndị nile bi n’ebe ahụ.

84 Na gbasara nwa odibo m Almon Babbit, o nwere ọtụtụ ihe n’adịghị m ezi-nma; lee, ọ chọrọ ihiwe ndụmọdụ ya n’ọnọdụ ndụmọdụ nke m hiwere, ọbụna nke Otu Ndị-isi nduzi nke Nzukọ-nsọ m; na ọ na-ehiwe nwa-ehi aọla-edo akpụrụ-akpụ maka ịkpọ isi-ala nke ndị m.

85 Ka onye ọbụla ghara aịla site n’ebe a bụ onye bịaworo ebe a na-achọ idebe iwu-nsọ nke m nile.

86 Ọbụrụ na ha biri ebe a ka ha biri nye m; na ọbụrụ na ha anwụọ ka ha nwụọ nye m; n’ihi ha aga-ezu ike site n’ọrụ ha nile ebe a, na ga amalite ọrụ ha nile.

87 Ya mere, ka nwa odibo m William tinye ntụkwasị-obi ya n’ime m, na kwụsị ịtụ ụjo gbasara ezi na ụlọ ya, maka ọrịa ahụ nke ala ahụ: Ọbụrụ na ị ahụrụ m n’anya, debe iwu-nsọ m nile, na ọrịa ahụ nke ala ahụ bga-atụgharị i wetara unu otuto.

88 Ka nwa odibo m William gaa ma maa-ọkwa ozi-ọma mgbe nile na-adigide nke m jiri oke olu na jiri nnukwu ọn̄ụ, dịka aMụọ nke m ga-akwalite ya, nye ndị nile bi na Warsaw, na nye ndị bi na Carthage, na kwa nye ndị bi na Burlington, na kwa nye ndị nile bi na Madison, ma chere na ndidi na ịrụsi-ọrụ-ike maka ntụzi-aka ndị-ọzọ n’ọgbakọ zuru ọha, ka Onye-nwe kwuru.

89 Ọbụrụ na ọ ga-eme uche m ka o site ugbu a gaa-n’iru n̄aa-ntị na ndụmọdụ nke nwa odibo m Joseph, na jiri ihe o nwere kwado aọdị-nma nke ndị ogbenye, na bipụta ntụgharị asụsụ bọhụrụ nke okwu-nsọ nke m nye ndị nile bi n’ụwa.

90 Ma ọbụrụ na ọ ga-eme nke a, a ga m aagọzi ya jiri ọtụtụ nnukwu ngọzi nile ka a ghara ichefu ya, ma-ọbụghị ma mkpụrụ ya ga-abụrụ ndị a hụrụ ebe ha bna-arịo nri.

91 Na ọzọ, n’ezie a sị m unu, ka nwa odibo m William bụrụ onye ahọpụtara, chie-echichi na tee-mmanụ, dịka onye ndụmọdụ nye nwa odibo m Joseph, n’ọnọdụ nwa odibo m Hyrum, ka nwa odibo m Hyrum were ọkwa-ọrụ nke Ọkwa Nchụ-aja na aOnye-isi-ezi na ụlọ, nke a họpụtara ya site n’aka nna ya, site na ngọzi na kwa oke ruru-onye.

92 Ka site ugbụ a gaa-n’iru ọ ga-eji ọtụghe ụzọ nile nke ngọzi nile anke onye-isi-ezi na ụlọ n’isi ndị nke m nile.

93 Ka onye ọbụla nke ọ gọziri bụrụ onye agọziri, na onye ọbụla nke ọ akọchara bụrụ onye nkọcha dịrị, na ihe ọbụla nke ọ bga-ekechi n’ụwa a ga-ekechi ya n’elu-igwe; na ihe ọbụla nke ọ ga-atọpụ n’ụwa a ga-atọpụ ya n’elu-igwe.

94 Na site n’oge a gawa, a họpụtara m ya ka ọ bụrụ onye-amụma, na onye aọhụ-ụzọ, na onye-mkpughe nye nzukọ-nsọ, dịka kwa nwa odibo m Joseph.

95 Ka ọ wee na-arụ na-njikọ-aka kwa ya na nwa odibo m Joseph, na ka ọ na-anata ndụmọdụ site n’aka nwa odibo m Joseph, onye ga-egosi ya aọtụghe ụzọ nile nke ọ ga-esita na ya rịọ ma nata na bụrụ onye ekpukwasịrị otu ngọzi ahụ, na ebube, na ugwu, na ọkwa nchụ-aja na onyinye nile nke ọkwa nchụ-aja ahụ, nke eyikwasịrị mgbe mbụ n’onye ahụ bụụrụ nwa odibo m bOliver Cowdery;

96 Ka nwa odibo m Hyrum nwe-ike ịgba-ama ihe nile nke m ga-egosi ya, ka aha ya bụrụ ihe a na-echeta n’ugwu site n’ọgbọ ruo n’ogbọ, ruo mgbe nile na mgbe nile.

97 Ka nwa odibo m William Law nata kwa ọtụghe ụzọ nile nke ọ ga-esi na ya rịọ ma nata ngọzi nile; ka ọ dị aumeala n’iru m, ka ọ nọrọ n’enweghi baghụghọ, na ọ ga-anata site na Mụọ nke m, ọbụna cOnye-nkasị-obi ahụ, nke ga-egosipụta nye ya ezi-okwu nke ihe nile, na ga-enye ya, n’oge mgbe ahụ, ihe ọ ga-ekwu.

98 Na aihe iriba-ama ndị a ga-eso ya—ọ bga-agwọ ndị ọria, ọ ga-achụpụ ajọọ mụọ nile, na a ga-anapụta ya site n’aka ndị ga-enye ya ajọọ nsi na-egbu mmadụ.

99 Na a ga-edu ya n’ụzọ nile ebe agwọ-ọjọọ nwere ansi na-agaghị ata ya na-ikiri-ụkwụ, na ọ ga-arị kwasị na n’ime bntụgharị nke uche ya nile dịka ọ nọ n’elu nku nile nke ugo.

100 Na ọ bụrụ na m ga-achọ ka ọ kpọlite ndị nwụrụ-anwụ, ka ọ ghara ijichi olu ya.

101 Ya mere, ka nwa odibo m William welie olu ya elu tie mkpu ma ghara igbochi, jiri ọn̄ụ na an̄ụri, na jiri hosanna nye ya nke nọ-ala n’oche-eze ruo mgbe nile na mgbe nile, ka Onye-nwe Chineke unu kwuru.

102 Lee, asị m unu, e nwere m mgbasa-ozi ọma na-echere nwa odibo m William, na nwa odibo m Hyrum, maka nanị ha, na ka nwa odibo m Joseph nọrọ n’ụlọ, n’ihi achọrọ ya. Nke fọdụrụ a ga m egosi unu mgbe emesịrị, ọbụna otu a. Amen.

103 Na ọzọ, n’ezie a sị m unu, ọ bụrụ na nwa odibo m aSidney ga-ejere m-ozi na bụrụ onye ndụmọdụ nye nwa odibo m Joseph, ka o bilie na bịakwa na kwụrụ n’ọkwa-ọrụ nke ọkpụkpọ ya, na nwe-umeala n’iru m.

104 Na ọ bụrụ na ọ ga-enye m onyinye kwesịrị nnabata, na nnabata nile, na nọro ya na ndị m, lee, mụ, Onye-nwe Chineke unu, ga-agwọ ya nke na ọ ga-enweta ọgwụgwọ, na ọ ga-ewelite olu ya ọzọ n’ugwu nile, na buru aonye nkwuchita-ọnụ n’iru m.

105 Ka ọ bịa na dota ezi na ụlọ ya gburu-gburu ebe ahụ nwa odibo m Joseph bi.

106 Na n’ije ya nile ka o welie olu ya dịka ụda nke opi, na dọọ ndị nile bi n’ụwa aka na-nti ka ha gbanarị oke-iwe na-abịa.

107 Na ka o nyere nwa odibo m Joseph aka, na kwa ka nwa odibo m William Law nyere nwa odibo m Joseph aka, an’ịma ọkwa dị mkpa nye ndị-eze nile nke ụwa, ọbụna dịka m kwuworo ya nye unu.

108 Ọ bụrụ na nwa odibo m Sidney ga-eme uche m, ka ọ ghara ịkpọga ezi na ụlọ ya n’ala nile nke aọwụwa anyanwụ, mana ka ọ gbanwee ebe-obibi ha, ọbụna dịka m kwuru.

109 Lee, ọ bụghị uche m na ọ ga-achọ ịchọta nchekwa na ebe-mgbaba site na obodo-ukwu nke m họpụtara nye unu, ọbụna obodo-ukwu nke aNauvoo.

110 N’ezie a sị m unu, ọbụna ugbu a, ọ bụrụ na ọ ga-an̄a nti n’olu m, ọ ga-adịrị ya mma. Ọbụna otua. Amen.

111 Na ọzọ, n’ezie a sị m unu, ka nwa odibo m Amos Davies kwụọ ụgwọ aka-oke n’aka ndị ahụ nke m họpụtara iwu ụlọ ebe obibi, ọbụna Ụlọ Nauvoo.

112 Nke a ka ọ ga-eme ma ọbụrụ na ọ ga-enwe aka-oke, na ka ọ n̄aa-ntị nye ndụmọdụ nke nwa odibo m Joseph na rụọ-ọrụ na-aka ya nile ka o nweta ntụkwasị-obi nke ndị mmadụ.

113 Na mgbe o gosipụtara onwe ya dịka onye kwesịrị ntụkwasị-obi n’ihe nile nke a ga-enyefe n’aka ya, e, ọbụna ihe ole na ole, a ga-eme ya aonye-ọchịchị n’ọtụtụ ihe;

114 Ya mere ka o aweda onwe ya ala ka enwe-ike ibuli ya elu. Ọbụna otua a. Amen.

115 Na ọzọ, n’ezie a si m unu, ọbụrụ na nwa odibo m Robert D. Foster erube-isi n’olu m, ka o wuo ụlọ maka nwa odibo m Joseph, dịka nkwekọrịta dị na etiti ya na ya siri dị, dịka ọnụ-ụzọ ahụ ga-emepere ya site n’oge ruo n’oge.

116 Na ka o chegharịa n’ihi nzuzu ya nile, na yiri aafọ-ọma dịka uwe, na kwusị ime ihe ọjọọ, na hapụ okwu ike ya nile;

117 Na kwụọ ụgwọ aka-oke n’aka ndị ọnụ-ọgụgụ-juru-aka nke Ụlọ Nauvoo maka onwe ya na kwa ọgbọ ya na-eso ya, site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ;

118 Na n̄aa-ntị na ndụmọdụ nke ndị odibo m Joseph, na Hyrum na William Law, na nye ndị ji ikike nile nke m kpọworo i do ntọ-ala nke Zaịọn, na ọ ga-adịrị ya mma ruo mgbe nile na mgbe nile. Ọbụna otu a. Amen.

119 Na ọzọ, n’ezie a sị m unu, ka ọ ghara inwe onye ga-akwụ aka-oke nye ndị ọnụ-ọgụgụ-juru-aka nke Ụlọ Nauvoo, ma-ọbụghị ma-ọbụ onye nke kwenyere n’Akwụkwọ nke Mọmọn, na mkpughe nile m nyeworo unu, ka Onye-nwe Chineke unu kwuru.

120 N’ihi ihe akarịrị ma-ọbụ dị-nta karia nke a sitere n’ihe ọjọọ, na a ga-eji i bụ-ọnụ nile soo kwa ya, ma ọbụghị ngọzi nile, ka Onye-nwe Chineke unu kwuru. Ọbụna otu a. Amen.

121 Na ọzọ, n’ezie a si m unu, ka ọnụ-ọgụgụ-juru-aka nke Ụlọ Nauvoo nwee nkwụghachi ụgwọ-ọrụ ziri-ezi n’ihi ọrụ ha nile nke ha na-arụ n’Ụlọ Nauvoo, na ka ụgwọ-ọrụ ha bụrụ dịka ha ga-ekwekọrịta n’etiti ha onwe ha, dịka gbasara ọnụ-ahịa ya.

122 Na ka onye ọbụla nke na-azụ aka-oke jigide akụkụ kwesịrị ya nke ụgwọ-ọrụ ha nile ọbụrụ na ọ dị mkpa, maka nkwado ha, ka Onye-nwe kwuru, ma ọbụghị otu a, ọrụ ha nile ka a ga-agụrụ ha dịka aka-oke n’ụlọ ahụ. Ọbụna otu a. Amen.

123 N’ezie a sị m unu, ugbụ a, e nye m unu andị-ọrụ nke Ọkwa Nchụ-aja, ka unu jide bọtụghe-ụzọ nile ebe ahụ, ọbụna Ọkwa Nchụ-aja nke bụ dịka usoro nke cMelkizedek siri dị, nke dị dịka usoro nke Ọkpara M Mụrụ Nanị ya siri dị.

124 Mbụ, e nye m unu Hyrum Smith ka ọ bụrụ aonye-isi-ezi na ụlọ nye unu, ijide nrachi nke bngọzi nile nke nzukọ-nsọ m, ọbụna Mụọ Nsọ nke cnkwa, site na nke darachikọtara unu ruo ụbọchị mgbapụta, ka unu ghara ịda n’agbanyeghị en’oge awa ọnwụnwa ga-abịakwasị unu.

125 E nye m unu nwa odibo m Joseph ka ọbụrụ onye-okenye nduzi nye nzukọ-nsọ nile, i bụrụ onye ntụgharị asụsụ, onye mkpughe, onye aọhụ-ụzọ na onye-amụma.

126 E nye m ya maka ndị ndụmọdụ nwa odibo m Sidney Rigdon na nwa odibo m William Law, ka ndị a mejupụta otu ọnụ-ọgụgụ-juru-aka na Otu Ndị-isi Nduzi Mbụ, ị nata amkpughe nile maka nzukọ-nsọ nile.

127 E nye m unu nwa odibo m aBrigham Young ka ọ bụrụ onye-isi nduzi na-elekọta Iri na Abụọ ahụ nke kansụl njegharị.

128 aIri na Abụọ nke jigidere ọtụghe-ụzọ nile nke ihiwe ikike nke ala-eze m n’elu akụkụ anọ nile nke ụwa, na mgbe nke a gasiri, bizipụ okwu nke m nye onye ọbụla.

129 Ha bụ Heber C. Kimball, Parley P. Pratt, Orson Pratt, Orson Hyde, William Smith, John Taylor, John E. Page, Wilford Woodruff, Willard Richards, George A. Smith;

130 aDavid Patten ka m bwereworo nye onwe m; lee, ọkwa nchụ-aja ya onweghị onye ga-anapụ ya, mana, n’ezie a sị m unu, enwere-ike ịhọpụta onye ọzọ n’ọkpụkpọ ahụ.

131 Na ọzọ, a sị m unu, e nye m unu otu akansụl dị elu, dịka nkume njikọ nke Zaịọn—

132 N’ịkpọ ha aha—Samuel Bent, Henry G. Sherwood, George W. Harris, Charles C. Rich, Thomas Grover, Newel Knight, David Dort, Dunbar Wilson—Seymour Brunson ka m wereworo nye onwe m, onweghị onye ga-anapụ ya ọkwa nchụ-aja ya, mana enwere-ike ịhọpụta onye-ọzọ n’ọnọdụ ya n’ọkwa nchụ-aja, ma n’ezie a sị m unu, ka nwa odibo m Aaron Johnson bụrụ onye etere mmanụ nye ọkpụkpọ nkea n’ọnọdụ ya—David Fuller, Alpheus Cutler, William Huntington.

133 Na ọzọ, e nye m unu Don C. Smith ka ọbụrụ onye-isi nduzi nke otu ọnụ-ọgụgụ-juru-aka nke ndị-isi-nchụ-aja;

134 Emume-nsọ bụ nke ehiwere n’ihi ebum-n’uche nke ntozu-oke ndị ahụ a ga-ahọpụta ndị-isi nduzi ma-ọbụ ụmụ odibo nọgidere astek dị iche-iche gbasasịrị na mba ndị ọzọ;

135 Na ha ga-aga njem kwa ma ọbụrụ na ha a chọọ, mana kama, a ga-echi ha echichi dịka ndị-isi nduzi nogidere; nke a bụ ọkwa-ọrụ nke ọkpụkpọ ha, ka Onye-nwe Chineke unu kwuru.

136 E nye m ya Amasa Lyman na Noah Packard dịka ndị ndụmọdụ, ka ha nọ n’isi nke ọnụ-ọgụgụ-juru-aka nke ndị-isi-nchụ-aja nke nzukọ-nsọ m, ka Onye-nwe kwuru.

137 Na ọzọ, a sị m unu, e nye m unu John A. Hicks, Samuel Williams, na Jesse Baker, ndị ọkwa nchu-aja ha bụ ị nọ n’isi nlekọta ọnụ-ọgụgụ-juru-aka nke andị okenye, bụ ọnụ-ọgụgụ-juru-aka nke ehiwere maka ndị ozizi nọgidere, otu o sila di, ha ga-aga njem, mana echiri ha, echichi ndị-ozizi ozi-ọma ga-anọgide nke nzukọ-nsọ m, ka Onye-nwe kwuru.

138 Na ọzọ, e nye m unu Joseph Young, Josiah Butterfield, Daniel Miles, Henry Herriman, Zera Pulsipher, Levi Hancock, James Foster, ị nọ n’isi n’elu ọnụ-ọgụgụ-juru-aka nke andị iri asaa;

139 Ọnụ-ọgụgụ-juru-aka nke ehiwere maka ndị okenye na-aga njem maka ịgba-ama nke aha m n’ụwa nile, ebe ọbụla nke ndị kansụl ngagharị dị elu na eme nje m, ndị ozi nke m, ga-ezipụ ha idozi ụzọ n’iru nke m.

140 Ihe di-iche na ọnụ-ọgụgụ-juru-aka nke a na ọnụ-ọgụgụ-juru-aka nke ndị okenye bụ na otu ga-na eje-ije mgbe nile, ma nke ọzọ ga-anọ n’isi nzukọ-nsọ nile site n’oge ruo n’oge, otu nwere ọrụ nke ị nọ n’isi site n’oge ruo n’oge, ma nke ọzọ enweghi ọrụ nke ị nọ n’isi, ka Onye-nwe Chineke unu kwuru.

141 Na ọzọ, a sị m unu, e nye m unu Vinson Knight, Samuel H. Smith, na Shadrach Roundy, ọbụrụ na ha ga-anabata ya, ị nọ n’isi aotu-ndị ụkọchukwu, ọmụma-ihe nke otu-ndị ụkọchukwu nke a ekwuru ka e nyere unu n’akwụkwọ bOzizi na Ọgbụgba ndụ nile.

142 Na ọzọ, a sị m unu, Samuel Rolfe na ndị ndụmọdụ ya maka ndị nchụ-aja, na onye-isi nduzi nke ndị nkuzi na ndị ndụmọdụ ya, na kwa onye-isi nduzi nke ndị dikọn na ndị ndụmọdụ ya, na kwa onye-isi nduzi nke stek na ndị ndụmọdụ ya.

143 Ọkwa-ọrụ ndị a akpọrọ aha ka m nyeworo unu, ma ọtụghe-ụzọ nile ha, maka enyem-aka nile na ọchịchị nile, maka ịrụ-ọrụ nke ije-ozị na aizu-oke nke ndị-nsọ m.

144 Na otu iwu-nsọ ka m na-enye unu, ka unu mejupụta ọkwa-ọrụ nile ndịa na anabata aha nile ndị ahụ m kpọpụtara, ma-ọbụ hapụ-ịnabata ha na ọgbakọ zuru ọha nke m;

145 Na ka unu kwado ọnụ-ụlọ nile maka ọkwa-ọrụ nile n’ụlọ nke m mgbe unu wuru ya n’aha m, ka Onye-nwe Chineke unu kwuru. Ọbụna otu a. Amen.