Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Stek


Stek

Otu n’ime nhazi na usoro nchịkwa nke Nzukọ nke Jisus Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a. Ihe mejupụtara stek bụ ọtụtụ ọnụ-ọgụgụ ngalaba otu ndị ụka nile. N’ozuzu ọ na-enwe-oke-ala nile na na-ekwerịkọta na onyinyo ụlọ ikwuu a kọwara nke ọma na Aịsaịa 54:2. “Gbatịa ụdọ gị nile, na kwagidesie stek gị nile ike”. Stek nke Zaịọn ọbụla na-akwado na na-enye-aka ijilite Nzukọ-nsọ elu dịka ụzọ ahụ ụlọ ikwuu ma-ọbụ ụlọ-ofufe jiri nwee njilite elu site na stek ya nile. Stek bụ ebe mkpọkọta maka ndị fọdụrụ n’ime ndị Israel a gbasasịrị (OznỌd. 82:13–14; 101:17–21).