Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Gbapụta, Gbapụtara, Mgbapụta


Gbapụta, Gbapụtara, Mgbapụta

I napụta, i zụta, ma-ọbụ ịgbapụta site na-ịkwụ ụgwọ, nke dịka ime ka mmadụ nwere onwe ya site n’oru. Mgbapụta na-atụnyere aja mgbaghara mmehie nke Jisus Kraịst na nnapụta site na mmehie. Aja mgbaghara mmehie nke Jisus gbapụtara mmadụ dum site n’ọnwụ nke arụ. Site n’aja mgbaghara mmehie ya, ndị ahụ nwere okwukwe na ya na ndị na-echegharị bụ kwa ndị a gbapụtara site n’ọnwụ nke mụọ.