Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ndị Hibru, Akwụkwọ-ozi e degaara


Ndị Hibru, Akwụkwọ-ozi e degaara

Otu akwụkwọ di n’ime Testament Ọhụrụ. Pọl degaara ndị Juu leta nke a bụ ndị otu Nzukọ-nsọ iji kwagide ha na mpaghara pụtara ìhè na Iwu Moses a bụrụwo ndị emezuworo n’ime Kraịst, na kwa n’iwu nke ka ịdị-elu nke ozi-ọma Kraịst, a nochiwo ya. Mgbe Pọl lọghachiri na Jerusalem na ọgwụgwụ mgbasa-ozi-ọma ya nke atọ (ihe dika afọ 60 mgbe a mụsiworo Kraịst) ọ chọtara na ọtụtụ ndị Juu bụ ndị otu ka ji aka n’iwu nke Moses (Ọlndoz. 21:20). Nke a bu ọ dịkarị nta ọ bụrụ afọ iri mgbe e mesịrị ọgbakọ ọha nke Nzukọ-nsọ na Jerusalem kpebiworo na emume-nsọ ụfọdụ nke iwu Moses adịghị kwa mkpa maka nzọpụta nke ndị jentaịlụ bụ Ndị-otu-Kraịst. Nke a mere, na-oteghị anya mgbe nke a gasịrị Pọl degaara ndị-Hibru akwụkwọ iji gosi ha site n’akwụkwọ-nsọ nke ha na site na uche zuru oke ihe mere ha agaghị na-emekwa iwu nke Moses.

Isi nile nke 1 na 2 na-akọwa na Jisus dị ukwuu karịa ndị mụọ-ozi. Isi nile nke 3–7 na-atụnyere Jisus Moses na kwa iwu Moses ma na-agba-ama na ọ dị ukwuu karia ha abụọ. Ha na-akụzi kwa na Ọkwa Nchụ-aja Melkizedek dị ukwuu karịa nke Erọn. Isi nile nke 8–9 na-akọwa nke ọma otu emume-nsọ nile nke Moses si kwadobe ndị mmadụ maka ije-ozị Kraịst na ka Kraịst si bụrụ onye-ogbugbo nke ọgbụgba-ndụ ọhụrụ ahụ (Alma 37:38–45; OznỌd. 84:21–24). Isi 10 bụ agbam-ume nke nrụsi ọrụ ike na ikwesị ntụkwasị-obi. Isi nke 11 bụ mkparịta ụka nke okwukwe. Isi nke 12 na-enye ịdọ-aka na nti nile, na ekele nile. Isi nke 13 na-akọ ọnọdụ inwe nnukwu ugwu nke ọlụlụ di na nwunye na mkpa nrube-isi dị.