Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Iwu


Iwu

Iwu-nsọ nile ma-ọbụ usoro nile nke Chineke nke ngọzi nile na ntaram ahụhụ nile nọ n’elu ntọ ala ya ma n’elu-igwe na n’elu ụwa. Ndị ahụ na-erubere iwu nile nke Chineke isi na-anata ngọzi nile e kwere na nkwa. Onye-amụma Joseph Smith kụziri na ndị mmadụ kwesikwara irube-isi, nye ugwu na kwado iwu nile nke ala ahụ (Ndep. Ok 1:12).

Iwu Moses nile bụụrụ iwu nkwadobe iji weta ndị nwoke na ndị nwanyị nye Kraịst. Ọ bụụrụ iwu, ịkpa oke nile, ndepụta usoro nile na emume-nsọ nile. Taa iwu nke Kraịst, nke mezuru iwu Moses, bụ uju nke ozi-ọma ma-ọbụ “iwu zuru oke nke ntọhapụ” (Jemes 1:25).