Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Mesaia


Mesaia

Otu ụdị okwu nke Aramaịk na Hibru nke pụtara “Onye E tere Mmanụ”. N’ime Testament Ọhụrụ Jisụs ka a kpọrọ Kraịst ahụ, nke bụ na ogbo ya na Grik ha bụ otu ihe dịka Mesaia. Ọ pụtara Onye-amụma ahụ e tere mmanụ, Onye nchụ-aja, Eze, na Onye-nnapụta onye ọbịbịa ya bụụrụ nke ndị Juu naara atụsi anya ya ike.

Ọtụtụ ndị Juu naara ele anya maka onye-nnapụta site na ike ndị Rom na nnukwu ime nke ọma nke mba ahụ karịa; nke mere na mgbe Mesaia ahụ bịara, ndị ndu na ọtụtụ ndị ọzọ jụrụ ya. Nanị ndị dị umeala na ndị nwere okwukwe bụ ndị nwere ike ịhụ n’ime Jisus onye Nazaret ezi Kraịst ahụ (Aịsa. 53; Mat. 16:16; Jọn 4:25–26).