Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Jehova


Jehova

Aha Ọgbụgba-ndụ ahụ ma-ọbụ aha ziri-ezi nke Chineke nke Israel. Ọ rịbara-ama “A Bụ M ebighi-ebi ahụ” (Ọpụ. 3:14; Jọn 8:58). Jehova bụ Jisus Kraịst mgbe na-enwe-beghị anụ arụ na bịara n’ụwa dịka nwa-nwoke nke Meri (Mosa. 3:8; 15:1; 3 Nif. 15:1–5). Dịka ọ na-emekarị, mgbe okwu ahụ Onye-nwe pụtara na Testament Ochie, ọ pụtara Jehova.

Jehova bụ Kraịst

E mere ka ndị amụma agba ochie mata Jehova (Ọpụ. 6:3; Abr. 1:16). Onye-ozi Pọl kuziri na Kraịst bụụrụ Jehova nke Testament Ochie (Ọpụ. 17:6; 1 Ndị-Kọ 10:1–4). Nwanne nwoke nke Jared n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn hụrụ Kraịst na ndụ adị tutu enwe anụ arụ na kpọọ isi ala nye ya (Ita 3:13–15). Moronaị kpọkwara Kraịst Jehova (Moro. 10:34). Na Temple nke Kirtland, Joseph Smith na Oliver Cowdery hụrụ Jehova biliteworo n’ọnwụ (OznỌd. 110:3–4).