Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ite mmanụ


Ite mmanụ

N’oge agba ochie nile, ndị amụma Onye-nwe na-eji mmanụ tee ndị ahụ ga-arụ ọrụ nile pụrụ iche, dịka Erọn, ma-ọbụ ndị nchụ-aja, ma-ọbụ ndị eze ndị ga-achị na Israel. N’ime Nzukọ-nsọ n’ụbọchị taa, ite mmanụ bụ ịtasa otu mkpụrụ mmanụ e doro nsọ ma-ọbụ abụọ n’isi mmadụ dịka otu mpaghara ngọzi pụrụ iche. E nwere ike ime nke a n’okpuru ikike na ike nke Ọkwa Nchụ-aja nke Melkizedek. Mgbe etesiri mmanụ, onye na-eji ikike nke ọkwa nchụ-aja ahụ nwere ike irachi otute mmanụ ahụ, ma nyekwa onye ahụ e tere mmanụ ngọzi pụrụ iche.