Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Hezekaia


Hezekaia

Otu onye-eze ezi-omume nke mba Juda n’ime Testament Ochie. Ọ chịrị-eze iri afọ abụọ na itoolu, n’oge Aịsaịa bụụrụ onye-amụma na Juda (2 Ndez. 18–20; 2 Ihem. 29–32; Aịsa. 36–39). Aịsaịa nyeere ya aka imezi-gharị ụkpụrụ nzukọ na ọchịchị obodo. Ọ bịadara ife arụsị ma hiwe kwa ofufe temple ọzọ. A gbatịkwuru ndụ Hezekaia afọ iri na ise site n’ekpere na okwukwe (2 Ndez. 20:1–7). Isi mmalite ichi-eze ya mere nke ọma, mana nnupụ-isi ya megide eze nke Asiria (2 Ndez. 18:7) ka ihe na-eso ya bụ ugbo mbakpo n’agha abụọ site n’aka ndị Asiria: nke mbụ ka a kọwara nke ọma na Aịsaịa 10:24–32, nke abụọ na 2 Ndị-eze 18:13–19:7. Na mbakpo n’agha nke ugboro abuọ otu onye muo-ozi nke Onye-nwe zọpụtara Jerusalem (2 Ndez. 19:35).