Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ekpere


Ekpere

Mmekọrịta izi ozi nkwanye ugwu nye Chineke mgbe mmadụ na-enye ekele na rịọ arịrịọ maka ngọzị nile. Ekpere nile ka a na agwa Nna anyị nke Elu-igwe n’aha nke Jisus Kraịst. E nwere ike ikwusị okwu ekpere ike ma-ọbụ juu. Echiche nile nke otu onye nwekwara ike ibu ekpere ma ọbụrụ na e duziri ha ụzọ nye Chineke. Abụ nke onye ezi-omume nwere ike ịbụ ekpere nye Chineke (OznỌd. 25:12).

Ebum n’uche nke ekpere a bụghị ịgbanwe uche obi nke Chineke, kama ka anyị nweta maka onwe anyị na maka ndị ọzọ ngọzi nile nke Chineke na-adịworị na njikere inye, mana n’anyị garịrị arịọ maka ha iji nweta ha.

Anyị na-ekpe ekpere nye Nna ahụ n’aha Kraịst (Jọn 14:13–14; 16:23–24). Anyị na-enwe ike n’ezi-okwu ikpe ekpere n’aha Kraịst mgbe ọchịchọ anyị nile bụ ọchịchọ nile nke Kraịst (Jọn 15:7; OznỌd. 46:30). Mgbe ahụ anyị na-arịọ maka ihe nile ziri-ezi na kwe omume maka Chineke inye (3 Nif. 18:20). Ụfọdụ ekpere na-anọgide na-azaghị ha n’ihi na-ọdịghị ụzọ ọbụla ha nọchitere ọchịchọ Kraịst kama ha sitere n’ọchịchọ-nke-onwe nke mmadụ (Jemes 4:3; OznỌd. 46:9). N’ezie, ọbụrụ n’anyị arịọ Chineke maka ihe nile na-ezighị-ezi, ọ ga aghọrọ anyị ọmụma-ikpe (OznỌd. 88:65).