Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Elaịja


Elaịja

Onye-amụma Testament Ochie Onye biaghachiri n’ụbọchị ndị ikpe-azụ a inyefe ọtụghe-ụzọ nile nke ike nrachi n’elu Joseph Smith na Oliver Cowdery. N’ụbọchị ya Elaịja kwusara ozi-ọma na mpaghara ala-eze nke Ugwu Israel (1 Ndez. 17–22; 2 Ndez. 1–2). O nwere okwukwe di Ukwuu na Onye-nwe, ribara ya ama maka ọtụtụ ọrụ-ebube nile. O mere ka mmiri ghara izo afọ atọ na ọkara. O kulitere otu nwanta nwoke site n’ọnwụ na kpọdata ọkụ site n’elu-igwe (1 Ndez. 17–18). Ndị Juu ka na-eche ka Elaịja lọghachi, dịka Malakai buru amụma na ọ ga-eme (Mal. 4:5). Ọ ka bụ onye ọbịa a na-atụ anya ya n’oriri ngabiga nile nke ndị Juu, ebe ọnụ ụzọ ghe oghe, na ọnọdụ oche na-eche ya oge nile.

Onye-amụma Joseph Smith kwuru na Elaịja ji ike nrachi nke Ọkwa Nchụ-aja nke Melkizedek bụrụkwa onye-amụma nke ikpe-azụ mere nke a tutu oge nke Jisus Kraịst. Ọ pụtara ìhè n’ugwu mnwogharị tinyere Moses na nyefee ọtụghe-ụzọ nile nke ọkwa nchụ-aja n’aka Pịta, Jemes, na Jọn (Mat. 17:3). Ọ putakwara ìhè ọzọ tinyere Moses na ndị ọzọ nile na 3 Epril 1836, na Kirtland Ohio temple na nyefee ọtụghe-ụzọ nile ahụ kwa n’elu Joseph Smith na Oliver Cowdery (OznỌd. 110:13–16). Ihe ndị a bụ na njikere maka ọbịbịa ugboro abụọ nke Onye-nwe dịka e kwuru na Malakaị 4:5–6.

Ike nke Elaịja bụ ike nrachi nke ọkwa nchụ-aja nke a na-esi ekechi ma-ọbụ tọhapụ ihe nile n’elu-igwe (OznỌd. 128:8–18). Ndị odibo a họrọ ahọ nke Onye-nwe n’ụwa taa nwere ike nrachi nke a ma na-eme emume nsọ nzọpụta nile nke ozi-ọma maka ndị di ndụ na ndị nwụrụ anwụ (OznỌd. 128:8).