Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Chụọ-aja, Ịchụ-aja


Chụọ-aja, Ịchụ-aja

N’ụbọchị nile ochie, ịchụ-aja pụtara ime ka ihe ahụ ma-ọbụ onye ahụ dị nsọ. Ọ pụtaziri ugbua inyepụ ihe ma-ọbụ ịta ahụhụ nke nfunarị nke ihe nile nke ụwa n’ihi Onye-nwe na ala-eze ya. Ndị otu nile nke Nzukọ-nsọ nke Onye-nwe kwesịrị ịdị na njikere iji ihe nile chụọ-aja maka Onye-nwe. Joseph Smith kụziri na “okpukpe-chi nke na-achọghị ịchụ-aja nke ihe nile enweghị mgbe o nwere ike zuru oke iji rụpụta okwukwe dị mkpa baa na ndụ na nzọpụta” N’iji uche hụ ngọzi ebighi-ebi nile a na-enweta site n’ịchụ-aja karịrị ihe nile nke a na-enyepụ.

Mgbe a chụpụsịrị Adam na Iv site n’ime ogige-ubi Iden, Onye-nwe nyere ha iwu nke ịchụ-aja. Iwu nke a gụnyere inye onyinye nke ụmụ e buru ụzọ mụọ nke anụ-ụlọ ha nile. Ịchụ-aja nke a bụụrụ akara nke ịchụ-aja ahụ nke Ọkpara Chineke ahụ A Mụrụ Nanị Ya ga-achụ (Moses 5:4–8). Omume nke a gara n’iru ruo n’ọnwụ Jisus Kraịst nke kwụsịrị ịchụ-aja nke anụmanụ dịka emume-nsọ nke ozi-ọma (Alma 34:13–14). N’ime Nzukọ-nsọ taa ndị otu na-eso keta oke nke oriri-nsọ nke achịcha na mmiri ahụ na ncheta nke ịchụ-aja ahụ nke Jisus Kraịst. Ndị-otu nke Nzukọ-nsọ Kraịst taa ka a na-agwa ka ha chụọ-aja nke obi e tiwara etiwa na mụọ nke nchegharị (3 Nif. 9:19–22). Nke a pụtara na ha dị umeala, nwere nchegharị, na dị na njikere irubere iwu-nsọ nile nke Chineke isi.