Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ụbọchị izu-ike


Ụbọchị izu-ike

Otu ụbọchị dị nsọ e dopụrụ iche kwa izu-ụka maka ezumike na ife ofufe. Mgbe Chineke kesịrị ihe nile, o zuru ike n’ụbọchị nke asaa ma nye iwu na otu ụbọchị kwa izu-ụka ga-abụ otu ụbọchị nke ezumike iji nyere ndị mmadụ aka icheta ya (Ọpụ. 20:8–11).

Tutu mbilite n’ọnwụ nke Kraịst, ndị otu nile nke Nzukọ-nsọ dobere ụbọchị ikpe-azụ nke izu-ụka dịka Ụbọchị Izu-ike, dịka ndị Juu mere. Mgbe mbilite n’ọnwụ gasịrị, ndị otu nile nke Nzukọ-nsọ ma ha bụ ndị Juu ma-ọbụ ndị Jentaịlụ, dobere ụbọchị mbụ nke izu-ụka (ụbọchị nke Onye-nwe) iji na-echeta mbilite n’ọnwụ nke Onye-nwe. Nzukọ-nsọ n’ụbọchị taa gara n’iru na-edobe otu ụbọchị kwa izu-ụka dịka otu Ụbọchị Izu-ike dị nsọ na nke a ga-efe Chineke ofufe na zuo ike site n’ọrụ nile nke ụwa.

Ụbọchị Izu-ike ahụ na e chetara ndị mmadụ maka mkpa nke ọzụzụ nke mụọ ha na ọrụ dịịrị ha irubere Chineke isi. Mgbe otu mba na-eto na akpachapụghị anya na-idobe Ụbọchị Izu-ike, akụkụ nile nke ndụ ka a na-emetụta, ma ndụ nke okpukpe-chi ya na-aghọ ihe rere ure (Neh. 13:15–18; Jer. 17:21–27).