Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Asiria


Asiria

Otu mba ukwu ochie, tinyere ndị iro ya Babịlọn, ha bụ ndị chịrị ọtụtụ steti ochie nile nke ndị Siria na Palestain gaa n’ime oge nile Testament Ochie. Ọbụna na ndị Asiria bụụrụ ndị ike ha pụtara ìhè site na etiti narị afọ nke Iri na abụọ ruo na mmechi narị afọ asaa tutu a mụọ Kraịst, onweghị mgbe ha nwere ike iwu ọnọdụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị kwụụrụ chịm. Ha jiri mmaja chịa ọchịchị, jiri ọkụ na mma-agha na-egwepịa ndị iro ha, na-ọbụ na-eme ka ike gwụ ha site na-ibupụ ọtụtụ igwe mmadụ ahụ gaa na mpaghara ọzọ nke mba ukwu ahụ. Ndị ha na-achị a naghị akwụsị ịbụ ndị iro ha, na n’ime oge nile nke mba ukwu ahụ ka ihe e jiri mara ya bụ nnupụ-isi na-anaghị akwụsị akwụsị. (Hụ 2 Ndez. 18–19; 2 Ihem. 32; Aịsa. 7:17–20; 10; 19; 37.)