Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Alma, Nwa-nwoke nke Alma


Alma, Nwa-nwoke nke Alma

N’ime Akwụkwọ nke Mọmọn, onye isi ikpe mbụ na onye-amụma n’ime mba Nifaị; N’afọ nile ya gboo, ọ chọrọ ka o bibie Nzukọ-Nsọ (Mosa. 27:8–10), otu o’sila dị Mụọ-ozi putara gosi ya onwe ya na e wee gbanwee ya nye ozi-ọma (Mosa. 27:8–24; Alma 36:6–27). N’ikpe azụ ọ hapụrụ ọnọdụ ya dika onye isi-ikpe ka o nwee ike kuziere ndị mmadụ (Alma 4:11–20).

Akwụkwọ nke Alma

Akwụkwọ nọọrọ onwe ya n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn, ihe dị na ya bụ ndekọta akụkọ nile na mkpirisi nke ndị amụma Alma, nwa-nwoke nke Alma na nwa ya nwoke Hilaman. Ihe nile akọwara mere n’ime akwụkwọ ahụ fọrọ nwa ntịntị ka ọ daba n’afọ 91 ruo 52 tutu amụọ Kraịst. Akwụkwọ ahụ nwere isi nile dị iri isii-na atọ. Isi nile nke 1–4 na-akọwa nnupụ-isi nke ndị na-eso Nehọ na Amlisi megide ndị Nifaị. Agha nile nke sọchiri ya bụ ndị kachasị iweta mbibi ruo ọnọdụ ahụ na akụkọ Nifaị. Isi nile nke 5–16 nwere nkọwa mmalite njem nile izisa ozi-ọma nke Alma, tinyere okwu chukwu ya banyere Ezi onye ọzụzụ-atụrụ (Alma 5) na nkwusa ozi-ọma ya na Amiulek n’obodo ukwu Amọnaiha. Isi nile nke 17–27 nwere ndekọta nke ụmụ ndịkom nke Mosaịa na ije-ozị ha n’etiti ndị Leman. Isi nile nke 28–44 nwere ụfọdụ n’ime okwu Chukwu nke Alma kachasị mkpa. N’isi 32 Alma jiri okwu ahụ tụnyere otu mkpụrụ akụkụ; N’isi 36 ọ kọgharịrị akụkọ mgbanwe ya nye nwa ya nwoke Hilaman. Isi nile nke 39–42 dekọtara ndụmọdụ Alma nyere nwa ya nwoke Kọrịantọn onye tinyere aka na njehie nke mụọ ime ihe ọma; Okwu chukwu a dị mkpa na-akọwa ikpe ziri-ezi, ebere, mbilite n’ọnwụ na aja mgbaghara mmehie. Isi nile nke 45–63 na-akọwa agha nile ndị Nifaị lụrụ n’oge ahụ na ịpụ obi ha nile gaa mba ọzọ n’okpuru Hagot. Ụdi nnukwu ndị ndu nile dịka ọchị-agha Moronaị, Tiankọm na Lihai nyere aka ichekwa ndị Nifaị nile gaa n’ime omume nile juru afọ ha mere n’oge kwesịrị ekwesi.