Akwụkwọ nsọ
Alma 45


Nkọwasị nke ndị Nifaị, na agha ha nile na nghọtahịe nile, n’ụbọchị nile nke Hilaman, dịka akụkọ-ndekọta nke Hilaman siri dị, nke o debere n’ụbọchị ya nile.

Mejupụtara isi 45 ruo isi 62 e tinyekọtara.

Isi 45

Hilaman wee kwere n’okwu nile nke Alma—Alma wee buo-amụma mbibi nke ndị Nifaị—O wee gọzie ma bụọ ala ahụ ọnụ—E nwere ike ekuliteworịị Alma elu site na Mụọ, ọbụna dịka Moses—Nghọtahịe wee na-eto na Nzukọ-nsọ ahụ. Ihe dịka n’afọ 73 tutu amụọ Kraịst.

1 Lee, ugbua o wee ruo na ndị nke Nifaị nwere ọn̄ụ karịa, n’ihi na Onye-nwe anapụtawo ha ọzọ site n’aka nile nke ndị-iro ha; ya mere ha nyere Onye-nwe Chineke ha ekele, e, ma ha aburu nnukwu ọnụ ma kpee nnukwu ekpere, ma ha fere Chineke jiri nnukwu ọn̄ụ karịrị akarị.

2 Ma o wee ruo n’afọ nke iri na iteghete nke ọchịchị nke ndị-ikpe na-achị ndị nke Nifaị, na Alma bịakwutere nwa ya nwoke Hilaman ma sị ya: Ị kwere n’okwu nile nke m gwara gị gbasara aakụkọ-ndekọta nile nke e debeworo?

3 Ma Hilaman sịrị ya: E, ekwere m.

4 Ma Alma sịrị ọzọ: Ị kwere na Jisus Kraịst, onye ga-abịa?

5 Ma ọ sịrị: E, ekwere m okwu nile nke i kwuworo.

6 Ma Alma sịrị ya ọzọ: Ị aga-edebe iwu m nile?

7 Ma ọ sịrị: E, aga m edebe iwu gị nile jiri obi m nile.

8 Mgbe ahụ Alma sịrị ya: Ngọzi na-adịrị gị; ma Onye-nwe ga-eme ka i amee nke ọma n’ala a.

9 Mana lee, e nwere m ihe ole na ole aiburu gị amụma; mana ihe m ga eburu gị n’amụma ị gaghị eme ka a mata ya, ọbụna ruo mgbe emezuworo amụma ahụ; ya mere dee okwu nile nke m ga-ekwu.

10 Ma ndị a bụ okwu ndị ahụ: Lee, a hụrụ m na otu ndị nke a, ndị Nifaị, dịka mụọ nke mkpughe nke dị n’ime m siri dị, n’ime anari afọ anọ site n’oge nke Jisus Kraịst ga-egosịpụta onwe ya, nye ha, ga-ala azụ bn’ekweghị ekwe.

11 E, ma mgbe ahụ ka ha ga-ahụ agha nile na ajọọ ọrịa nile, e, ụnwụ nile na nkwafu-ọbara, ọbụna wee ruo mgbe ndị Nifaị ana-agaghị adị kwa ọzọ—

12 E, ma nke a n’ihi na ha ga-ala azụ n’ekweghị ekwe ma daba n’ọrụ nile nke ọchịchịrị, na aọchịchọ nke anụ-arụ, na ụdị ajọọ-omume nile dị iche iche; e, a sị m gị, na n’ihi na ha ga-emehie megide nnukwu ìhè na mmụta dị otu a, e, asị m gị, na site n’ụbọchị ahụ, ọbụna ọgbọ nke anọ nile agaghị agafesị tutu nnukwu ajọọ-omume nke a ga-abịa.

13 Ma mgbe nnukwu ụbọchị ahụ ga-abịa, lee, oge ahụ na-abịa mgbe na-adịghị anya na ndị ahụ nọ ugbua, ma-ọbụ mkpụrụ-afọ nke ndị ahụ a gụnyere n’ọnụ-ọgụgụ ugbua n’etiti ndị nke Nifaị, aagaghị agụnyekwa ha ọzọ n’etiti ndị nke Nifaị.

14 Mana onye-ọbụla nke fọdụrụ, ma e bibighị ya na nnukwu ụbọchị ahụ dị egwu, a aga-agụnye ya n’etiti ndị Leman, ma ga-adị ka ha, ha nile, ma ọbụghị ole na ole ndị a ga-akpọ ndị na-eso ụzọ nke Onye-nwe; ma ha ka ndị Leman ga-achụ ọbụna bruo mgbe ha na-agaghị adị kwa ọzọ. Ma ugbua, n’ihi ajọọ-omume, amụma a ga-emezu.

15 Ma ugbua o wee ruo na mgbe Alma gwasịworo Hilaman ihe ndị a, ọ gọziri ya, na kwa ụmụ ya nwoke ndị ọzọ; ma ọ gọzịkwara ala ahụ an’ihi ndị ezi-omume.

16 Ma ọ sịrị: Otu a ka Onye-nwe Chineke kwuru—aọbụbụ-ọnụ ga-adịrị ala ahụ, e, ala nke a, dịrị mba nile, ebo, asụsụ na mmadụ, ruo mbibi, bụ ndị na-eme ajọọ-omume, mgbe ha chazuworo; ma dịka m kwuworo otu a ka ọ ga-adị; n’ihi na nke a bụ ọbụbụ-ọnụ na bngọzi nke Chineke n’elu ala ahụ, n’ihi na Onye-nwe enweghị ike iji cinye-ohere kachasị-ntakịrị lekwasị mmehie anya.

17 Ma ugbua, mgbe Alma kwuworo okwu ndị a ọ gọziri anzukọ-nsọ ahụ, e, ndị ahụ nile ga-anọgidesike n’okwukwe ahụ site n’oge ahụ gaa n’iru.

18 Ma mgbe Alma meworo nke a ọ pụrụ site n’ala nke Zarahemla, dịka ọ na-agaba n’ala nke Mulek. Ma o wee ruo na a nụghịkwa ihe gbasara ya ọzọ; ịhe gbasara ọnwụ ya ma-ọbụ olili ya anyị amaghị ihe gbasara ya.

19 Lee, nke a ka anyị matara, na ọ bụ onye ezi-omume; ma okwu a gara obodo nile na nzukọ-nsọ ahụ na ekuliri ya elu site na Mụọ, ma-ọbụ e aliri ya site n’aka nke Onye-nwe, ọbụna dịka Moses. Mana lee, akwụkwọ-nsọ nile sịrị Onye-nwe weere Moses nye onwe ya; ma anyị were ya dịka na ọ narawo kwa Alma n’ime mụọ, nye onwe ya; ya mere, n’ihi nke a ọ dịghị ihe anyị matara gbasara ọnwụ ya na olili ya.

20 Ma ugbua o wee ruo na mmalite nke afọ iri na iteghete nke ọchịchị nke ndị-ikpe na-achị ndị Nifaị, na Hilaman gagharịrị n’etiti ndị ahụ ikwusara ha okwu ahụ.

21 N’ihi na lee, n’ihi agha ha nile ha na ndị Leman na ọtụtụ ntakịrị nghọtahịe nile na nsogbu nile nke dịworo n’etiti ndị ahụ, ọ dị mkpa na a ga-ekwusa aokwu Chineke n’etiti ha, e, ma na a ga-eme nhazi na nzukọ-nsọ ahụ nile.

22 Ya mere, Hilaman na ụmụnne ya nwoke gara n’iru ihiwe nzukọ-nsọ ahụ ọzọ n’ala ahụ nile, e, n’obodo-ukwu ọbụla n’ala ahụ nile nke ndị nke Nifaị nwere. Ma o wee ruo na ha họpụtara ndị nchụ-aja nile na ndị nkuzi n’ala ahụ nile, ilekọta nzukọ-nsọ ahụ nile.

23 Ma ugbua o wee ruo na mgbe Hilaman na ụmụnne ya nwoke họpụtasịworo ndị nchụ-aja na ndị nkuzi ilekọta nzukọ-nsọ ahụ nile na anghọtahịe batara n’etiti ha, ma ha achọghị ige okwu nile nke Hilaman na ụmụnne ya nwoke;

24 Mana ha nweworo mpako, ebe ha buliri onwe ha elu n’obi ha, n’ihi nnukwu aụba ha nile karịrị akarị; ya mere ha bara ụba bn’anya nke onwe ha, ma ha achọghị ige ntị n’okwu ha nile, ịgazi ije n’iru Chineke.