Akwụkwọ nsọ
Alma 51


Isi 51

Ndị ọchọ-eze ahụ wee chọọ imegharị iwu ma hiwe onye eze—Pehoran na ndị nwe-onwe-ha ka a kwadoro site n’olu nke ndị ahụ—Moronaị wee kwagide ndị ọchọ-eze ahụ ichekwa mba ha ma-ọbụ e gbuo ha—Amalakaịa na ndị Leman wee nweta ọtụtụ obodo-ukwu ndị e wusiri-ike—Tiankọm wee gbochie ịba-ọgụ ndị Leman ma gbuo Amalakaịa n’ụlọ-ịkwuu ya. Ihe dịka n’afọ 67 ruo 66 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua o wee ruo na mmalite nke iri-afọ abụọ na ise nke ọchịchị nke ndị-ikpe na-achị ndị nke Nifaị, ebe ha meworo ka udo dị n’etiti ndị nke Lihaị na ndị nke Moriantọn gbasara ala ha nile, ma ebe ha maliteworo afọ nke iri abụọ na ise n’udo;

2 Otu o sila dị, ha akwadoghị udo ahụ ogologo oge n’ala ahụ, n’ihi na a malitere inwe ndọrọ-ndọrọ n’etiti ndị ahụ gbasara onye-isi-ikpe Pehoran; n’ihi na lee, e nwere ụfọdụ ndị nke chọrọ na akụkụ ole na ole nke iwu ahụ ekwesịrị imeghari ha.

3 Mana lee, Pehoran achọghị imegharị ma-ọbụ kwe ka e megharịa iwu ahụ; ya mere, ọ n̄ạghị ntị n’okwu ndị zibataworo olu ha nile site n’arịrịọ ha nile gbasara imegharị iwu ahụ.

4 Ya mere, ndị ahụ chọrọ ka e megharịa iwu ahụ weere ya iwe, ma chọọ ka ọ ghara ịbụkwara ha onye-isi-ikpe n’ala ahụ; ya mere e nwere ịrụ-ụka dị ọkụ gbasara ihe ahụ, mana ọbụghị ruo n’ịkwafu ọbara.

5 Ma o wee ruo na ndị ahụ chọrọ ka achụda Pehoran site n’oche-ikpe a ka a kpọrọ ndị ọchọ-eze, n’ihi na ha chọrọ ka e megharịa iwu ahụ n’ụdị ịchụda ọchịchị inwere-onwe ma hiwe onye-eze n’ala ahụ.

6 Ma ndị ahụ chọrọ ka Pehoran nọrọ ka onye-isi-ikpe n’ala ahụ wekwasịrị onwe ha aha nke ndị nwe-onwe ha; ma otu a ka nkewa siri dị n’etiti ha, n’ihi na ndị nwere-onwe ha an̄ụwo-iyi ma-ọbụ gbara-ndụ ichekwa ihe nile ruru ha na ohere nile nke okpukpe-chi ha site n’otu ọchịchị inwere-onwe.

7 Ma o wee ruo na ihe nke a maka ndọrọ-ndọrọ ha ka e meziri site n’olu nke ndị ahụ. Ma o wee ruo na olu nke ndị ahụ bịara na nkwado nke ndị inwere-onwe ahụ, ma Pehoran jidere oche-ikpe ahụ, nke wetara nnukwu ịn̄ụrị-ọnụ n’etiti ụmụnne nke Pehoran na kwa ọtụtụ ndị nke ntọhapụ, ndị tinyekwara ndị ọchọ-eze ahụ n’idere juu, ha anwaghị anwa imegide kama o kwesịrị ka ha kwado ụzọ nke inwere-onwe.

8 Ugbua ndị ahụ kwadoro ndị ọchọ-eze nile bụ ndị a amụrụ n’ọnọdụ di elu, ma ha chọrọ ịbụ ndị eze; ma a kwadoro ha site na ndị chọrọ ike na ikike ịchị ndị ahụ.

9 Mana lee, nke a bụ oge ọgba-aghara maka udị ndọrọ-ndọrọ dị otu ahụ ịdị n’etiti ndị nke ndị Nifaị; n’ihi na lee, Amalakaịa akwalitewo kwa obi ndị nke ndị Leman nile ọzọ megide ndị nke ndị Nifaị, ma ọ nọọrọ na-akpọkọta ndị-agha nile sitere n’akụkụ nile nke ala ya, ma na-enye ha ngwa-ọgụ, ma na-akwado maka agha jiri mgbalị nile; n’ihi na ọ an̄ụwọrị iyi ịn̄ụ ọbara nke Moronaị.

10 Mana lee, anyị ga-ahụ na nkwa nke o kwere dị aghara; otu o sila dị, o jikere onwe ya na ndị-agha ya nile ịbịa n’agha megide ndị Nifaị.

11 Ugbua ndị-agha ya nile adịghị oke nnukwu dịka ha dịịrị na mbụ, n’ihi ọtụtụ puku nile ndị e gbuworo site n’aka nke ndị Nifaị; mana na-agbanyeghị nnukwu ntufu ha, Amalakaịa akpọkọtawọrịị nnukwu ndị-agha dị egwu, nke mere na egwu atụghị ya ịgbadataru ala nke Zarahemla.

12 E, ọbụna Amalakaịa n’onwe ya gbadatara, na-mgbabichi nke ndị Leman. Ma-ọbụ n’iri afọ abụọ na ise nke ọchịchị nke ndị-ikpe; ma-ọbụ n’otu oge ahụ nke ha maliteworo idozi ihe gbasara ndọrọ-ndọrọ ha nile gbasara onye-isi-ikpe Pehoran ahụ.

13 Ma o wee ruo na mgbe ndị nwoke ahụ a kpọrọ ndị ọchọ-eze nuworọrịị na ndị Leman na-agbadata n’agha megide ha, ha nwere obi-ụtọ n’obi ha nile; ma ha jụrụ iwelite ngwa-ọgụ nile, n’ihi na ha were oke iwe megide onye-isi-ikpe ahụ, na kwa ha na andị nke ntọhapụ ahụ, na ha agaghị ewelite ngwa-agha nile n’ichekwa mba ha.

14 Ma o wee ruo na mgbe Moronaị hụrụ ihe nke a, ma hụkwa na ndị Leman na-abata n’ime oke nile nke ala ahụ, o were iwe karịa n’ihi ekwe-ekwe nke ndị ahụ ya na ha rụworo ọrụ jiri oke nnukwu mgbalị iji chekwaa; e, o were iwe karịa; mkpuru-obi ya jupụtara n’iwe megide ha.

15 Ma o wee ruo na o zigara akwụkwọ arịrịọ, jiri olu nke ndị ahụ, ruo onye-ọchịchị nke ala ahụ, na-achọ ka ọ gụọ ya, ma nye ya (Moronaị) ike iji kwagide ndị nghọtahịe nile ahụ ichekwa mba ha ma-ọbụ igbu ha.

16 N’ihi na ọ bụ ihe mbụ na ihe o jiri kpọrọ ihe ịkwusị ndọrọ-ndọrọ nile na nghọtahịe nile n’etiti ndị ahụ; n’ihi na lee, nke a abụrụwọrịị ihe kpatara mbibi ha nile. Ma o wee ruo na e kwere ya dịka olu ndị ahụ siri dị.

17 Ma o wee ruo na Moronaị nyere iwu ka ndị-agha ya gaa megide ndị ọchọ-eze ahụ, ịdọdata mpako ha na ịbụ ndị ama-ama ha ma mee ka ha na ala hara, ma-ọbụ ha ga-ewelite ngwa-ọgụ ma kwado ụzọ nke ntọhapụ.

18 Ma o wee ruo na ndị-agha nile zọrọ-ije gaa imegide ha; ma ha dọdara mpako ha na ịbụ ndị ama-ama ha, nke mere na mgbe ha welitere ngwa-ọgụ ha nile nke agha ịlụ ọgụ megide ndị nke Moronaị e gbuturu ha ma mee ka ha na ala hara.

19 Ma o wee ruo na e nwere puku anọ n’ime andị nghọtahịe ahụ ndị e gbuturu site na mma-agha ahụ; ma ndị nke bụ ndị ndu ha nile ndị a na-egbụghị n’agha a kpọrọ ha tukpuo n’ụlọ mkpọrọ, n’ihi na e nweghị oge maka ikpe ha ikpe na mgbe nke a.

20 Ma ụfọdụ n’ime ndị nghọtahịe ahụ, kama ka a kụda ha n’ala site na mma-agha ahụ, nyefere onwe ha n’usoro nke ntọhapụ, ma a kwagidere ha iwelite aákàrà nke ntọhapụ n’elu ụlọ-elu tọwa ha nile, ma n’obodo-ukwu ha nile, ma welite ngwa-agha nile n’ichekwa mba ha.

21 Ma otu a Moronaị wetara ndị ọchọ-eze ahụ na ngwụcha, na enweghị kwa onye ọbụla na-aza aha nke ndị-eze; ma otu a o wetara ekwe-ekwe na mpako nke ndị ahụ na-ekwupụta na ha nwere ọbara ndị ama-ama na ngwụcha; mana e wedatara ha inwe obi umeala dịka ụmụnne ha, na ịlụ-ọgụ dịka dike maka inwere-onwe ha site n’ịbụ-oru.

22 Lee, o wee ruo na dịka aMoronaị nọ na-ewepụ agha nile na ndọrọ-ndọrọ nile n’etiti ndị nke onwe ya, na ịkwagide ha ibi n’udo na ịbụ ndị a zụrụ-azụ, na ime iwu nile ijikere maka agha megide ndị Leman, lee, ndị Leman abatawọrịị n’ala nke Moronaị, nke dị n’oke-ala nile dị n’akụkụ oke osimiri ahụ.

23 Ma o wee ruo na ndị Nifaị esighị-ike zuru-ezu n’obodo-ukwu nke Moronaị; ya mere Amalakaịa chụghachịrị ha, ebe ha gburu ọtụtụ. Ma o wee ruo na Amalakaịa were ọnwụnwe nke obodo-ukwu ahụ, e, onwunwe nke ebe nile e wusịrị-ike ha.

24 Ma ndị ahụ gbapụrụ site n’obodo-ukwu nke Moronaị ahụ bịaruru obodo-ukwu nke Nifaịha; na kwa ndị nke obodo-ukwu Lihaị ahụ kpọkọtara onwe ha ọnụ, ma mee nkwadobe nile ma nọrọ na njikere ịnabata ndị Leman n’agha.

25 Mana o wee ruo na Amalakaịa ekweghị ka ndị Leman gaa megide obodo-ukwu nke ndị Nifaịha n’agha, kama debe ha n’ala n’akụkụ oke osimiri ahụ, na-ahapụ ndị nwoke n’obodo-ukwu ọbụla ịkwado na ichekwa ya.

26 Ma otu a ọ gara n’iru, na-ewere onwunwe nke ọtụtụ obodo-ukwu, obodo-ukwu nke Nifaịha, na obodo-ukwu nke Lihaị, na obodo-ukwu nke Moriantọn, na obodo-ukwu nke Ọmna, na obodo-ukwu nke Gịd, na obodo-ukwu nke Miulek, nke ha nile dị n’oke-ala nile nke akụkụ ọwụwa-anyanwụ n’akụkụ oke osimiri ahụ.

27 Ma otu a ka ndị Leman sịworo nweta, site na aghụghọ nke Amalakaịa, ọtụtụ obodo-ukwu nile, site usuu agụtaghị-ọnụ ha nile, nke ha nile e wusịrị ha ike n’ụdị amwusi-ike nke Moronaị; nke ha nile ghọrọ ebe siri-ike nile nye ndị Leman.

28 Ma o wee ruo na ha zọrọ-ije ruo n’oke-ala nile nke ala Uju ahụ, na-achụpụ ndị Nifaị nọ n’iru ha ma na-egbu ọtụtụ.

29 Mana o wee ruo na Tiankọm zutere ha, onye agbuworo Moriantọn ma gbabichiwo ndị ya na mgbafu ya.

30 Ma o wee ruo na o gbabichịkwara Amalakaịa, ka ọ na azọ-ije na-aga ya na nnukwu ọtụtụ ndị-agha ka o wee were onwunwe ala nke Uju, na kwa ala nke dị n’elu-elu.

31 Mana lee o zutere enwetaghị-ihe-e-chere site na Tiankọm ịchụghachị ya na ndị ya azụ, n’ihi na ha bụụrụ ndị nnukwu ọlụ agha; n’ihi na nwoke Tiankọm ọbụla karịrị ndị nke Leman n’ume ha na kwa na nka ịlụ-agha, nke mere na ha ritara uru n’ebe ndị Leman nọ.

32 Ma o wee ruo na ha nyere ha nsogbu, nke mere na ha gburu ha ọbụna wee ruo mgbe ọchịchịrị gbara. Ma o wee ruo na Tiankọm na ndị ya rụnyere ụlọ-ịkwuu ha nile n’oke-ala nile nke ala Uju ahụ; ma Amalakaịa rụnyere ụlọ-ịkwuu ya nile n’oke-ala nile nke akụkụ-mmiri ahụ dị n’ikpere-mmiri, ma n’ụdị a ka e siri chụọ ha.

33 Ma o wee ruo na mgbe abalị bịaworo, Tiankọm na nwa-oru ya zupụrụ ma pụọ n’abalị, ma gaba n’ebe izu-ike nke Amalakaịa; ma lee, ụra akawo ha ike n’ihi oke ike ọgwụgwụ ha, nke ihe kpatara ya bụ ọrụ ha nile na okpom-ọkụ nke ụbọchị ahụ.

34 Ma o wee ruo na Tiankọm zupụrụ na nzụzọ baa n’ụlọ-ịkwuu nke eze ahụ, ma tinye ube-dị-mfe n’obi ya; ma ọ kpatara ọnwụ eze ahụ otu mgbe ahụ nke mere na o meteghị ụmụ-oru ya.

35 Ma ọ laghachịrị ọzọ na nzụzọ ruo n’ebe izu-ike nke ya, ma lee, ndị nwoke ya nọ n’ụra, ma o metere ha ma gwa ha ihe nile nke o meworo.

36 Ma o mere ka ndị-agha ya nile guzoro na njikere, na-eleghị anya ndị Leman etetawo ma ga-abịakwasị ha.

37 Ma otu a ka iri afọ abụọ na ise nke ọchịchị nke ndị-ikpe na-achị ndị nke Nifaị siri gwụsịa; ma otu a ka ụbọchị nile nke Amalakaịa siri gwụsịa.