Akwụkwọ nsọ
Alma 40


Isi 40

Kraịst na-eweta na mmezu mbilite n’ọnwụ nke ndị mmadụ nile—Ndị ezi-omume nwụrụ anwụ ga-aga na paradaịs ma ndị ajọọ-omume n’ọchịchịrị nke ezi ichere ụbọchị nke mbilite-n’ọnwụ ha—A ga-eweghachi ihe nile na ụdị zịrị ezi na ụdị zuru-oke na Mbilite n’Ọnwụ ahụ. Ihe dịka n’afọ 74 tutu amụọ Kraịst.

1 Ugbua nwa m nwoke, nke a bụ ihe ole na ole ọzọ m ga-achọ ịgwa gị; n’ihi na ahụrụ m na echiche gị nọ na-esogbu gbasara mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ-anwụ.

2 Lee, asị m gị, na enweghị mbilite n’ọnwụ di—ma-ọbụ, aga m asị, n’okwu ọzọ, na aarụ a na-anwụ anwụ anaghị beyịkwasị anwụghị anwụ, ire ure nke a anaghị eyịkwasị ereghị-ure—cwee ruo mgbe Kraịst bịasịworo.

3 Lee, ọ na-eweta na mmezu ambilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ. Mana lee, nwa m nwoke, mbilite n’ọnwụ ahụ erubeghị. Ugbua, aga m asaghere gị otu ihe ọmimi; otu o sila dị enwere ọtụtụ bihe omimi ndị e cdebere, na ọdịghị onye matara ha ma ọbụghị Chineke n’onwe ya. Mana ana m egosị gị otu ihe nke m jisịworo ike jụta n’aka Chineke ka m wee mata—nke ahụ bụ gbasara mbilite n’ọnwụ.

4 Lee, e nwere oge a kara aka na mmadụ nile aga-apụta site na ndị nwụrụ anwụ. Ugbua mgbe oge nke a ga-abịa ọdịghị onye matara; kama Chineke matara oge ahụ nke e dobere.

5 Ugbua, ma a ga-enwe otu oge, ma-ọbụ nke augboro abụọ, ma-ọbụ nke ugboro atọ, ka ndị mmadụ ga-apụta site na ndị nwụrụ-anwụ, ọdighị ihe o mere; n’ihi na Chineke bmatara ihe nile ndị a; ma o zuworo m ịmata na otu a ka ọ dị—na enwere oge a kara aka na mmadụ nile ga-ebilite site na ndị nwụrụ anwụ.

6 Ugbua ọ dịrịrị mkpa na-enwere ohere n’etiti oge ọnwụ na oge mbilite n’ọnwụ.

7 Ma ugbua a na m ajụ ihe ga-abụ ọnọdụ amkpụrụ-obi nile nke ndị mmadụ site n’oge nke ọnwụ a ruo n’oge ahụ e dobere maka mbilite n’ọnwụ?

8 Ugbua ma enwere ihe karịrị otu oge a kara aka maka ndị mmadụ ibilite ọdịghị ihe o mere; n’ihi na mmadụ nile anaghị anwụ otu mgbe, ma nke a adịghị ihe o mere; ihe nile dịka otu ụbọchị n’ebe Chineke nọ, ma oge a na-atụrụ ya nanị ndị mmadụ.

9 Ya mere, o nwere oge a kara aka nye ndị mmadụ na ha ga-ebilite site na ndị nwụrụ-anwụ; ma e nwere oghere n’etiti oge ọnwụ ahụ na mbilite n’ọnwụ ahụ. Ma ugbua, gbasara oghere nke oge ahụ, ihe ga-abụ ọnọdụ nke mkpụrụ-obi nile nke ndị mmadụ bụ ihe ahụ nke m jisịworo ike jụọ Onye-nwe ịmata; ma nke a bụ ihe ahụ nke m matara maka ya.

10 Ma mgbe oge ahụ bịaworo mgbe mmadụ nile ga-ebilite, mgbe ahụ ka ha ga-amata na Chineke matara aoge nile nke e dobere nye ndị mmadụ.

11 Ugbua, gbasara ọnọdụ nke mkpụrụ-obi ahụ n’etiti aọnwụ na mbilite n’ọnwụ—Lee, e mewo ka m mata ya site na mụọ-ozi, na mụọ nile nke mmadụ nile, otu oge ahụ ha pụrụ site na arụ a na-anwụ anwụ, e, mụọ nile nke mmadụ nile, ma ha bụ ndị ọma ma-ọbụ ndị ọjọọ, a bna-ewela ha ụlọ nye Chineke ahụ onye nyere ha ndụ.

12 Ma mgbe ahụ ka ọ ga-eru, na mụọ nile nke ndị ahụ mere ezi-omume a ga-anabata ha n’ọnọdụ aan̄ụrị, nke a na-akpọ bparadaịs, ọnọdụ nke cezumike, ọnọdụ nke dudo, ebe ha ga ezu ike site na nsogbu ha nile na nchekasị nile, na mwute.

13 Ma mgbe ahụ ka ọ ga-eru, na mụọ nile nke ndị ajọọ-omume, e, ndị bụ ndị ọjọọ—n’ihi na lee, ha enweghị oke ma-ọbụ akụkụ nke mụọ nke Onye-nwe, n’ihi na lee, ha họọrọ ajọọ ọrụ nile karịa nke ọma; ya mere mụọ nke ekwensu bara n’ime ha, ma were onwunwe nke ụlọ ha—ma a ga-achụpụ ndị a n’ime aọchịchịrị nke ezi; a ga-enwe bịkwa akwa, na ịkwa arịrị na ịta ikikere eze, ma nke a n’ihi ajọọ-omume nke ha, ebe e duru ha ka ndị a dọkpụrụ n’agha site n’ọchịchọ nke ekwensu.

14 Ugbua nke a bụ ọnọdụ nke mkpụrụ-obi nile nke andị ajọọ-omume ahụ, e, n’ọchịchịrị, na ọnọdụ nke dị egwu, bna-atụ ụjọ na-ele anya ikpe dị egwu nke oke iwe nke Chineke ga-abịakwasị ha; otu a ha ga-anọgide cn’ọnọdụ nke a, dịka ndị ezi-omume n’ime paradaịs, wee ruo oge nke mbilite n’ọnwụ ha.

15 Ugbua, o nwere ụfọdụ ndị ghọtaworo na ọnọdụ nke an̄ụrị nke a na ọnọdụ nke ịhụjụ anya nke mkpụrụ-obi nke a, tutu mbilite n’ọnwụ ahụ, bụ mbilite n’ọnwụ nke mbụ. E, Anabatara m na e nwere ike iwere ya dịka mbilite n’ọnwụ, nkulite nke mụọ ahụ ma-ọbụ mkpụrụ-obi na nnyefe ha n’aka an̄ụrị ma-ọbụ ịhụju-anya, dịka okwu nile nke ekwuworọrịị siri dị.

16 Ma lee, ọzọ ekwuwo ya rịị, na enwere ambilite n’ọnwụ bnke mbụ, mbilite n’ọnwụ nke ndị nile nọworo, ma-ọbụ nọ, ma-ọbụ ga-anọ, gbada ruo na mbilite nke Kraịst site n’ọnwụ.

17 Ugbua anyị echeghị na mbilite n’ọnwụ nke mbụ a, nke a na-ekwu maka ya n’ụdị a, ga-abụ mbilite n’ọnwụ nke mkpụrụ-obi nile ahụ na annyefe ha n’an̄ụrị ma-ọbụ nhuju-anya. I gaghị eche na nke a bụ ihe ọ pụtara.

18 Lee, asị m gị, E-e; kama ọ pụtara njikọtagharị nke mkpụrụ-obi ya na arụ, nke ndị nile site n’ụbọchị nile nke Adam gbadata ruo na ambilite n’ọnwụ nke Kraịst.

19 Ugbua, ma mkpụrụ-obi nile na arụ nile nke ndị nile e kwuworo maka ha a ga-ejikọgharị ha nile otu mgbe, ndị ajọọ-omume na kwa ndị ezi-omume, asịghị m; ka o zuo, na asị m na ha nile ga apụta; ma-ọbụ n’ikwu ya n’ọzọ ọzọ, mbilite n’ọnwụ ha ga-abịa atutu mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ mgbe mbilite n’ọnwụ nke Kraịst gasịworo.

20 Ugbua nwa m nwoke, asịghị m na mbilite n’ọnwụ ha ga-abịa na mbilite n’ọnwụ nke Kraịst; mana lee, a na m enye ya dịka echiche m, na mkpụrụ-obi nile na arụ nile a ga-ejikọta ha, maka ndị ezi-omume, na mbilite n’ọnwụ nke Kraịst, na anrigoro ya n’ime elu-igwe.

21 Mana ma-ọbụ na mbilite n’ọnwụ ya ma-ọbụ mgbe ọ gasịrị, anaghị m ekwu; kama oke a ka m na-ekwu, na enwere aoghere n’etiti ọnwụ na mbilite n’ọnwụ nke arụ ahụ, na ọnọdụ nke mkpụrụ-obi ahụ bn’an̄ụrị ma-ọbụ na cnhuju-anya wee ruo oge a kara aka nke Chineke mgbe ndị nwụrụ-anwụ ga apụta, ma ejikọtagharịa ha, ma mkpụrụ-obi ma arụ, ma dakpọta ha iguzoro n’iru Chineke, ma ekpee ha ikpe dịka ọrụ ha nile siri dị.

22 E, nke a na-eweta mweghachi nke ihe ndị ahụ e kwuworo maka ha site n’ọnụ nke ndị-amụma nile.

23 A ga aeweghachi bmkpụrụ-obi ahụ nye carụ, na arụ nye mkpụrụ-obi; e, na ụkwụ na aka nile na njikọ ha a ga-eweghachi ha nye arụ ya; e, ọbụna otu mkpụrụ agịrị-isi nke isi ahụ agaghị efu; kama a ga-eweghachi ihe nile n’ezigbo ọnọdụ na okporo-arụ zuru oke.

24 Ma ugbua, nwa m nwoke, nke a bụ mweghachi nke e akwuworo maka ya site n’ọnụ nile nke ndị-amụma—

25 Ma mgbe ahụ ka ndị ezi-omume ga-egbukepụta n’ala-eze nke Chineke.

26 Mana lee, aọnwụ dị egwu na-abịakwasị ndị ajọọ-omume; n’ihi na ha na-anwụ n’ihe nile gbasara ihe nile nke ezi-omume; n’ihi na ha adịghị-ọcha, ma ọdịghị ihe ọbụla bna-adịghị ọcha nwere ike iketa ala-eze nke Chineke; kama a ga-achụpụ ha, ma nyefee ha n’iketa-oke site na mkpụrụ nile nke ọrụ ha nile ma-ọbụ aka-ọrụ ha nile, nke bụworọrịị ihe ọjọọ; ma ha wee n̄ụọ iko mmanya nke dị ilụ.