Akwụkwọ nsọ
Alma 20


Isi 20

Onye-nwe wee ziga Amọn Mịdonaị ịnapụta ụmụnne ya nwoke a tụrụ mkpọrọ—Amọn na Lamonaị zutere nna Lamonaị, onye bụ eze n’ala ahụ nile—Amọn wee manye okenye eze ahụ ka ọ kwado nhapụ ụmụnne ya nwoke ka ha nwere onwe ha. Ihe dịka n’afọ 90 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma o wee ruo na mgbe ha hiweworo otu nzukọ-nsọ n’ala ahụ, na eze Lamonaị chọrọ ka Amọn soro ya gaa n’ala nke ndị Nifaị, ka o wee gosị ya nna ya.

2 Ma olu nke Onye-nwe bịaruru Amọn na-asị: I gaghị agalite ruo ala nke ndị Nifaị, n’ihi na lee, eze ahụ ga-achọ ndụ gị; mana ị ga-aga n’ala nke Mịdonaị; n’ihi na lee, nwanne gị nwoke Erọn, na kwa Miulakaị na Ama nọ n’ụlọ mkpọrọ.

3 Ugbua o wee ruo na mgbe Amọn nụworo nke a, ọ sịrị Lamonaị: Lee, nwanne m nwoke na ụmụnne m nwoke nọ n’ụlọ-mkpọrọ na Mịdonaị, ma ka m gaa ka m wee napụta ha.

4 Ugbua Lamonaị sịrị Amọn: A matara m, an’ike nke Onye-nwe i nwere ike ime ihe nile. Mana lee, aga m esoro gị gaa n’ala nke Mịdonaị; n’ihi na eze nke ala Mịdonaị ahụ, onye aha ya bụ Antiomno, bụ enyi m; ya mere aga m a ga-ala nke Mịdonaị ahụ, ka m wee kwagide eze nke ala ahụ, ma ọ ga-akpọpụta ụmụnne gị nwoke site bn’ụlọ mkpọrọ. Ugbua Lamonaị siri ya: Onye gwara gị na ụmụnne gị nwoke nọ n’ụlọ mkpọrọ?

5 Ma Amọn sịrị ya: E-e ọdịghị onye gwaworo m, ma ọbụghị Chineke; ma ọ sịrị m—Gaa ma napụta ụmụnne gị nwoke, n’ihi na ha nọ n’ụlọ-mkpọrọ n’ala nke Mịdonaị.

6 Ugbua mgbe Lamonaị nụworo nke a o mere ka ụmụ-oru ya nile kwado aịnyịnya ya nile na ụgbọ-ala ya nile.

7 Ma ọ sịrị Amọn: Bịa, aga m esoro gị gbada n’ala nke Mịdonaị ahụ, ma n’ebe ahụ aga m arịọ eze ahụ ka o wee kpọpụta ụmụnne gị nwoke site n’ụlọ-mkpọrọ.

8 Ma o wee ruo na dịka Amọn na Lamonaị na-aga njem n’ebe ahụ, ha zutere nna nke Lamonaị, onye bụ eze an’ala ahụ nile.

9 Ma lee, nna nke Lamonaị sịrị ya: Gịnị mere ị bịaghị an’oriri na nnukwu ụbọchị ahụ mgbe m mere oriri nye ụmụ m ndị nwoke nile, na nye ndị m?

10 Ma ọ sịkwara: Ole ebe ka Ị na-aga gị na onye Nifaị a, onye bụ otu n’ime ụmụ nke aonye okwu ụgha?

11 Ma o wee ruo na Lamonaị kwugharịrị ya ebe ọ na-aga, n’ihi na ọ tụrụ egwu ịkpasu ya iwe.

12 Ma ọ gwakwara ya ihe nile kpatara o jiri nọdụ n’ime ala-eze nke ya, nke mere na ya agakwurughị nna ya n’oriri ahụ nke ọ kwadoworo.

13 Ma ugbua mgbe Lamonaị kwugharịworo ihe ndị a nile nye ya, lee, n’ịtụ n’anya ya, nna ya wesoro ya iwe, ma sị: Lamonaị, i na-aga ịnapụta ndị nke Nifaị a, ndị bụ ụmụ onye okwu-ụgha. Lee, o zuru ndị nna anyị ori; ma ugbua ụmụ ya abịawo kwa n’etiti anyị ka ha wee, site n’aghụghọ na okwu ụgha ha nile, ghọgbuo anyị, ka ha wee zunarị kwa anyị ihe anyị nwere.

14 Ugbua nna nke Lamonaị nyere ya iwu ka o wee gbuo Amọn jiri mma agha ahụ. Ma o nyekwara ya iwu ka ọ ghara ịga n’ala nke Mịdonaị ahụ, mana ọ ga-esoro ya laghachị n’ala nke aỊshmel.

15 Mana Lamonaị sịrị ya: Agaghị m egbu Amọn, ọbụghị ma m ga-alaghachị n’ala nke Ịshmel, mana a ga m a ga n’ala nke Mịdonaị ka m wee hapụ ụmụnne nwoke nke Amọn, n’ihi na a matara m na ha bụ ndị ezi-omume na ndị-amụma dị nsọ nile nke ezi Chineke ahụ.

16 Ugbua mgbe nna ya nụworo okwu nile ndị a, o wesoro ya iwe, ma ọ mịrị mma agha ya ka o wee tịda ya n’ala.

17 Mana Amọn guzogidere ma sị ya: Lee, i gaghị egbu nwa gị nwoke; otu o sila dị, ọ aka mma na ọ ga-ada karịa gị, n’ihi na lee, o bchegharịwo site na mmehie ya nile; mana ọbụrụ na ị ga-ada n’oge ugbua, n’iwe gị, mkpụrụ-obi gị agaghị enwe nzọpụta.

18 Ma ọzọ, ọ dị mkpa na ị ga-enwe ndidi; n’ihi na ọbụrụ na ị aga-egbu nwa gị nwoke, ebe ọ bụ nwoke na-enweghị ụta, ọbara ya ga-eti mkpu site n’ala ruo Onye-nwe Chineke ya, ka ịbọ ọbọ bịakwasị gị; ma eleghị anya ị ga-atụfụ bmkpụrụ-obi gị.

19 Ugbua mgbe Amọn gwaworo ya okwu nile ndị a, ọ zara ya, na-asị: A matara m na ọbụrụ na m ga-egbu nwa m nwoke, na m ga-akwafu ọbara onye na-enweghị ụta; n’ihi na ọ bụ gị bụ onye chọworo ibibi ya.

20 Ma o setịpụrụ aka ya igbu Amọn. Mana Amọn nagidere ọkụkụ ihe ya nile, ma kwa kụda aka ya nke mere na o nweghị ike iji ya mee ihe.

21 Ugbua mgbe eze ahụ hụrụ na Amọn nwere ike igbu ya, ọ malitere ịrịọ Amọn ka o nwe ike debe ndụ ya.

22 Mana Amọn welitere mma agha ya, ma sị ya: Lee, aga m eti gị ihe ma ọbụghị na ị ga-ekwenye m na a ga-akpọpụta ụmụnne m nwoke site n’ụlọ mkpọrọ.

23 Ugbua eze ahụ, ebe ọ na-atụ egwu na ya nwere ike ịtụfu ndụ ya, sịrị: Ọbụrụ na ị ga-edebe m aga m ekwe nyere gị ihe ọbụla i ga-arịọ, ọbụna ruo na ọkara nke ala-eze ahụ.

24 Ugbua mgbe Amọn hụrụ na ya emesowo ichie-eze ahụ dịka o siri chọọ, ọ sịrị ya: Ọbụrụ na ị ga-ekwenyere m na a ga-akpọpụta ụmụnne m nwoke site n’ụlọ mkpọrọ, na kwa na Lamonaị ga-ejide ala-eze ya, ma na ị gaghị eweso ya iwe, mana kwenye na ọ ga-eme dịka ọchịchọ nke onwe ya siri dị an’ihe ọbụla o chere, mgbe ahụ aga m edebe gị; ma ọbụghị otu ahụ aga m etịda gị n’ala.

25 Ugbua mgbe Amọn kwuru okwu ndị a nile, eze ahụ malitere ịn̄ụrị ọn̄ụ n’ihi ndụ ya.

26 Ma mgbe ọ hụrụ na Amọn enweghị ọchịchọ igbu ya, ma mgbe ọ hụkwara nnukwu ịhụ-n’anya o nwere n’ebe nwa ya nwoke Lamonaị nọ, ọ tụrụ ya n’anya karịa, ma ọ sị: N’ihi na nke a bụ ihe nile ị chọworo, ka m wee hapụ ụmụnne gị nwoke, ma kwere na nwa m nwoke Lamonaị ga-ejide ala-eze ya, lee, aga m ekwenyere gị na nwa m nwoke ga-ejide ala-eze ya site ugbua ma ruo mgbe nile; ma a gaghị m achịkwa ya ọzọ—

27 Ma agakwa m ekwenyere gị na ụmụnne gị nwoke a ga-akpọpụta ha site n’ụlọ-mkpọrọ, ma gị na ụmụnne gị nwoke ga-abịakwute m, n’ala-eze m; n’ihi na a ga m achọsike ịhụ gị. N’ihi na eze ahụ nwere nnukwu ịtụ n’anya n’okwu nile nke o kwuworo, na kwa n’okwu nile nke nwa ya nwoke, Lamonaị kwuworo, ya mere ọ achọsịrị ike ịmụta ha.

28 Ma o wee ruo na Amọn na Lamonaị gara n’iru na njem ha chee iru n’ala nke Mịdonaị. Ma Lamonaị nwetara nnabata mmasị n’anya nke eze ala ahụ; ya mere ụmụnne nwoke nke Amọn ka akpọpụtara site n’ụlọ-mkpọrọ.

29 Ma mgbe Amọn zutere ha o nwere mwute karịa; n’ihi na lee ha gba-ọtọ, ma akpụkpọ-arụ ha chighasịrị karịa n’ihi iji eriri nile siri ike kee ha. Na ha ediwo kwa agụụ, akpịrị-ịkpọ-nkụ, na ụdị mkpagbu nile dị iche iche; otu o sila dị ha nwere andidi n’ịta ahụhụ ha nile.

30 Ma, dịka o siri mee, ọ bụụrụ akara-aka ha ịdabawọrịị n’aka nile nke ndị kara nwee obi ike na ndị na-akpọ-ekwe-nkụ karịa; ya mere ha enweghị ike ịn̄a-ntị n’okwu ha nile, ma ha akpọpụtawo ha, ma ha akụwo ha ihe, ma chụghariwo ha site n’ụlọ ruo n’ụlọ, na site n’ebe ruo n’ebe, ọbụna wee ruo mgbe ha rutere n’ala nke Mịdonaị; ma n’ebe ahụ a kpọọrọ ha ma tụba ha n’ụlọ-mkpọrọ, ma kee ha audo nile siri ike, ma debe ha n’ụlọ-mkpọrọ ruo ọtụtụ ụbọchị, ma anapụtara ha site n’aka Lamonaị na Amọn.