Akwụkwọ nsọ
Alma 46


Isi 46

Amalakaịa wee gbaa izu-ọjọọ ịbụ eze—Moronaị wee welite ákàrà ntọhapụ ahụ—O wee kpọkọta ndị ahụ ọnụ ichekwa okpukpe-chi ha—Ndị kwere-ekwe n’ezi-okwu ka a kpọrọ ndị-otu-Kraịst—Ụfọdụ ndị nke Josef ka a ga-echekwa—Amalakaịa na ndị nghọtahịe wee gbaga ala nke Nifaị—Ndị na-agaghị akwado ụzọ nke inwere-onwe e gburu ha. Ihe dịka n’afọ 73 ruo 72 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma o wee ruo na ka ha ra na-an̄aghị ntị n’okwu nile nke Hilaman na ụmụnne ya nwoke a kpọkọtara ha ọnụ megide ụmụnne ha nwoke.

2 Ma ugbua lee, iwe were ha karịa, nke mere na ha kpebiri igbu ha.

3 Ugbua onye-ndu nke ndị ahụ iwe were megide ụmụnne ha nwoke bụ nnukwu nwoke na onye siri ike; ma aha ya bụ Amalakaịa.

4 Ma Amalakaịa chọsịrịke ịbụ eze; ma ndị ahụ iwe were chọsịkwaraike ka ọ bụrụ eze ha; ma ndị nke ka n’ọnụ-ọgụgụ n’ime ha bụụrụ andị-ikpe kara dị ala nke ala ahụ, ma ha nọọrọ na-achọ inweta ike.

5 Ma e duruwo ha rịị site n’otuto-erughị-n’obi nile nke Amalakaịa, na ọbụrụ na ha ga-akwado ya ma hiwe ya ịbụ eze ha na ya ga-eme ha ndị ọchịchị nye ndị ahụ.

6 Otu a Amalakaịa dufuru ha na nghọtahịe nile, na-agbanyeghị nkwusa ozi-ọma nke Hilaman na ụmụnne ya nwoke, e, na-agbanyeghị nnukwu nlekọta ha karịrị akarị na nzukọ-nsọ ahụ, n’ihi na ha bụ ndị isi nchụ-aja na nzukọ-nsọ ahụ.

7 Ma e nwere ọtụtụ na nzukọ-nsọ ahụ ndị kwere n’okwu otuto-erughị-n’obi nile nke Amalakaịa ahụ, ya mere ha nwere nghọtahịe ọbụna site na nzukọ-nsọ ahụ; ma otu a ka ihe-omume nile nke ndị Nifaị ahụ bụ ihe na-agaghị emezu ma dị egwu karịa, na-agbanyeghị nnukwu ammeri ha nke ha nweworo n’ebe ndị Leman nọ, na nnukwu ịn̄ụrị-ọn̄ụ ha nile nke ha nweworo n’ihi nnapụta ha site n’aka nke Onye-nwe.

8 Otu a anyị hụrụ otu ụmụ nke mmadụ si na-echefu Onye-nwe Chineke ha aọsọ-ọsọ, e, otu ha sị na-eme ajọọ-omume ọsọ-ọsọ, na ka ajọọ-onye ahụ dufuo ha.

9 E, ma anyị hụkwara nnukwu aajọọ-omume otu onye oke ajọọ-omume nwere ike ịkpata ka o were ọnọdụ n’etiti ụmụ nke mmadụ.

10 E, anyị hụrụ na Amalakaịa, n’ihi na ọ bụ onye nwere ụzọ aghụghọ na onye nwere ọtụtụ okwu otuto-erughị-n’obi, na o dufuru mkpụrụ-obi nke ọtụtụ mmadụ ime ajọọ-omume; e, na ịchọ ibibi nzukọ-nsọ nke Chineke ahụ, na ibibi ntọ-ala nke antọhapụ nke Chineke nyeworo ha, ma-ọbụ ngọzi nke Chineke zitaworo n’elu iru nke ala ahụ bn’ihi ndị ezi-omume.

11 Ma ugbua o wee ruo na mgbe Moronaị, onye bụụrụ aonye-isi-agha nke ndị-agha nile nke Nifaị, nụworọrịị maka nghọtahịe nile ndị a, o wesoro Amalakaịa iwe.

12 Ma o wee ruo na ọ dọwara uwe mkpuchi ya; ma o weere mpekele ya, ma dee n’elu ya—aNa ncheta nke Chineke anyị, okpukpe-chi anyị, na inwere-onwe anyị, na udo anyị, ndị nwunye anyị, na ụmụ anyị—ma o kekwasịrị ya na ngwụcha nke otu okporo osisi.

13 Ma o kegidesịrị epekele-mkpuchi-isi ya ike, na epekele-nchekwa-obi ya, na ihe ize-mgbọ ya nile, ma kee ngwa-ọgụ ya n’ukwu ya; ma o weere okporo-osisi ahụ, nke uwe ya ahụ ọ dowara dị na ngwụcha ya, (ma ọ kpọrọ ya àkàrá nke ntọhapụ) ma ọ kpọrọ isi n’ala, ma o kpesịrị ekpere ike nye Chineke ka ngọzi nile nke ntọhapụ dakwasị ụmụnne ya nwoke, ọbụrụraa na a ga-enwe otu ndị nke-Kraịst ga-afọdụ inwere ala ahụ—

14 N’ihi na otu a ka ndị nile kwere na Kraịst n’ezi-okwu dị, ndị bụ nke nzukọ-nsọ nke Chineke, a kpọrọ site na ndị ahụ na-abụghị nke nzukọ-nsọ ahụ.

15 Ma ndị ahụ bụ ndị nke nzukọ-nsọ ahụ kwesịrị ntụkwasị-obi; e, ndị ahụ nile bụ ndị kwere na Kraịst n’ezi-okwu wekwasịrị onwe ha, n’obi ụtọ, aaha nke Kraịst, ma-ọbụ bndị-otu Kraịst dịka a na-akpọ ha, n’ihi okwukwe ha na Kraịst onye ga-abịa.

16 Ma ya mere, n’oge a, Moronaị kpere ekpere ka ụzọ nke ndị otu-Kraịst, na inwere-onwe nke ala ahụ bụrụ ihe a kwadoro.

17 Ma o wee ruo na mgbe ọ wụpụtasịworo mkpụrụ-obi ya nye Chineke, ọ kpọrọ ala nile ahụ nke dị na ndịda nke ala aỌtọgbọrọ-n’efu ahụ, e, ma na mkpirisi, ala ahụ nile, ma n’elu-elu ma na ndịda ndịda—Ala a họpụtara, na ala nke ntọhapụ.

18 Ma ọ sịrị: N’ezie Chineke agaghị ekwe na anyị, ndị elelịrị elelị n’ihi na anyị wekwasịrị onwe anyị aha nke Kraịst, a ga-azọda ma bibie anyị, ruo mgbe anyị ga-ewekwasị ya onwe anyị site na njehie nile nke onwe anyị.

19 Ma mgbe Moronaị kwuworo okwu ndị a, ọ gagharịrị n’etiti ndị ahụ, na-efegharị akụkụ a dowara adọwa nke auwe ya n’ikuku, ka mmadụ nile wee nwe ike ịhụ ihe odide nke o dere n’elu akụkụ ebe ahụ a dọwara adọwa, ma na-eti n’olu dị elu, na-asị:

20 Lee, onye ọbụla ga-akwado akara nke a n’elu ala ahụ, ka ha pụta n’ike nke Onye-nwe, ma baa n’ime ọgbụgba-ndụ na ha ga-akwado ihe nile ruru ha, na okpukpe-chi ha, ka Onye-nwe Chineke wee gọzie ha.

21 Ma o wee ruo na mgbe Moronaị kwupụtasịworo okwu ndị a, lee, ndị ahụ bịara na-agbakọta jiri ngwa-ọgụ ha e kere n’ukwu ha nile, na-adọka uwe ha nile n’ihe aka ebe, ma-ọbụ dịka ọgbụgba-ndụ, na ha agaghị ahapụ Onye-nwe Chineke ha; ma ọbụ, n’okwu ụdị ọzọ, ọbụrụ na ha jehie iwu-nsọ nile nke Chineke, ma-ọbụ daba n’ime njehie, ma aihere mee ha iwekwasị onwe ha aha nke Kraịst, Onye-nwe ga-adọka ha ọbụna dịka ha siri dọkaa uwe ha nile.

22 Ugbua nke a bụ ọgbụgba-ndụ ahụ nke ha mere, ma ha tụpụrụ uwe ha nile n’ụkwụ Moronaị, na-asị: Anyị na Chineke anyị na-agba-ndụ, na a ga-ebibi anyị, ọbụna dịka ụmụnne anyị nwoke nọ n’ala dị n’elu-elu, ọbụrụ na anyị ga-adaba n’ime njehie; e, o nwere ike ịtụpụ anyị n’ụkwụ ndị iro anyị, ọbụna dịka anyị tụpụworo uwe anyị nile n’ụkwụ gị ka a zọgide ha ụkwụ, ma ọbụrụ na anyị ga-adaba n’ime njehie.

23 Moronaị sịrị ha: Lee, anyị bụ ndị fọdụrụ na mkpụrụ-afọ nke Jekọb; e, anyị bụ ndị fọdụrụ na amkpụrụ-afọ nke bJosef, onye nke cụmụnne ya nwoke dọwara uwe ya n’ọtụtụ mpekele; e, ma ugbua lee, ka anyị cheta idebe iwu-nsọ nile nke Chineke, ma-ọbụ ụmụnne anyị nwoke ga-adọwa uwe anyị nile ma a tụba anyị n’ụlọ-mkpọrọ, ma-ọbụ e ree anyị, ma-ọbụ e gbuo anyị.

24 E, ka anyị dokwa ntọhapụ anyị dịka ndị nke Josef afọdụrụ; e, ka anyị cheta okwu nile nke Jekọb, tutu ọnwụ ya, n’ihi na lee, ọ hụrụ na otu ụzọ nke uwe nke Josef fọdụrụ e dokwara ya ma o reghị-ere. Ma ọ sịrị—Ọbụna dịka e chekwaworo uwe nwa m nwoke, otu ahụ ka a ga-esi chekwa mkpụrụ-afọ nke nwa m nwoke bfọdụrụ site n’aka nke Chineke, ma o were ya nye onwe ya, ebe mkpụrụ-afọ nke Josef fọdụrụ ga-ala-n’iyi, ọbụna dịka ụfọdụ nke uwe ya.

25 Ugbua lee, nke a na-enye mkpụrụ-obi m mwute; otu o sila dị, mkpụrụ-obi m nwere ọn̄ụ n’ime nwa m nwoke, n’ihi otu ụzọ nke mkpụrụ-afọ ya ahụ nke a ga ewegara Chineke.

26 Ugbua lee, nke a bụ asụsụ nke Jekọb.

27 Ma ugbua onye matara ma e nwere ike mkpụrụ-afọ nke Josef nke fọdụrụ, nke ga-ala-n’iyi dịka uwe ya, bụ ndị ahụ ghọtahịere anyị? E, ma ọbụna ọ ga-abụ anyị n’onwe anyị ma ọbụrụ na anyị eguzosighị ike n’okwukwe nke Kraịst.

28 Ma ugbua o wee ruo na mgbe Moronaị kwuworo okwu ndị a ọ gawara, na kwa zipụ n’akụkụ nile nke ala ahụ ebe e nwere nghọtahie nile, ma kpọkọta ndị ahụ nile ọnụ ndị chọrọ ichekwa ntọhapụ ha, iguzo megide Amalakaịa na ndị ahụ ghọtahịeworo, ndị a na-akpọ ndị Amalakaịa.

29 Ma o wee ruo na mgbe Amalakaịa hụrụ na ndị nke Moronaị dị imerime karịa ndị nke Amalakaịa—ma ọ hụkwara na ndị ya nwere obi abụọ gbasara ikpe-ziri-ezi nke ụzọ nke ha nakwereworo—ya mere, ebe ọ na-atụ egwu na ya agaghị enweta isi-okwu ahụ, ọ kpọrọ ndị ya ndị kwere ma pụọ baa n’ala nke Nifaị.

30 Ugbua Moronaị chere na ọ dịghị mkpa na ndị Leman ga-enwekwa ume ọzọ; ya mere o chere igbabichi ndị Amalakaịa ahụ, ma-ọbụ jide ha ma kpọghachị ha azụ, ma gbuo Amalakaịa; e, n’ihi na ọ matara na ọ ga-akpasu ndị Leman iwe megide ha, ma mee ha ka ha bịa n’ọgụ megide ha; ma nke a ka ọ matara na Amalakaịa ga-eme ka o wee nweta ebum-n’obi ya nile.

31 Ya mere Moronaị chere na ọ dị mkpa na ọ ga-akpọrọ ndị-agha ya nile, ndị kpọkọtaworo onwe ha ọnụ, ma nye onwe ha ngwa-agha ma baa n’ime ọgbụgba-ndụ idebe udo ahụ—ma o wee ruo na ọ kpọrọ ndị-agha ya ma zọrọ-ije pụọ jiri ụlọ ikwuu ya nile baa n’ime ọzara, ịgbabichi ụzọ nke Amalakaịa n’ime ọzara ahụ.

32 Ma o wee ruo na o mere dịka ọchịchọ ya nile siri dị, ma zọba ije n’ime ọzara ahụ, ma gbabichie ndị-agha nile nke Amalakaịa.

33 Ma o wee ruo na Amalakaịa gbafuru ya na ntakịrị ọnụ-ọgụgụ nke ndị nwoke ya, ma ndị nke fọdụrụ e nyefere ha n’aka nke Moronaị ma a kpọghachịrị ha n’ala nke Zarahemla.

34 Ugbua, Moronaị ebe ọ bụ nwoke ndị-isi-ikpe ahọpụtara na olu nke ndị ahụ, ya mere o nwere ike dịka ọchịchọ ya siri dị ya na ndị-agha nile nke Nifaị, ihiwe na igosi ikike n’ebe ha nọ.

35 Ma o wee ruo na onye ọbụla nke ndị Amalakaịa nke na-agaghị aba n’ime ọgbụgba-ndụ ịkwado ụzọ nke inwere onwe, ka ha wee dokwaa ọchịchị ịnwere-onwe ha, o mere ka e gbuo ha; ma e nwere nanị ole na ole ndị jụrụ ọgbụgba-ndụ nke inwere-onwe ahụ.

36 Ma o wee ruo kwa, na o mere ka e kelie ákàrà nke ntọhapụ n’ulo-elu tọwa ọbụla nke dị n’ala ahụ nile, nke ndị Nifaị nwere; ma otu a Moronaị kụnyere ihe nlere-anya nke ntọhapụ n’etiti ndị Nifaị.

37 Ma ha malitere inwe udo ọzọ n’ala ahụ; ma otu a ha kwadoro udo ruo ọ fọdụrụ ntakịrị ka ọ bụrụ ngwụcha afọ iri na iteghete nke ọchịchị nke ndị-ikpe.

38 Ma Hilaman na andị isi nchụ-aja nile kwadokwara usoro dị na nzukọ-nsọ; e, ọbụna ruo ohere dị afọ anọ ka ha nwere udo na ịn̄ụrị-ọn̄ụ n’ime nzukọ-nsọ ahụ.

39 Ma o wee ruo na e nwere ọtụtụ ndị nwụrụ, ana-ekwesike na Onye-nwe Jisus Kraịst gbapụtara mkpụrụ-obi ha nile; otu a ha gapụrụ n’ụwa na-an̄ụrị.

40 Ma o nwere ụfọdụ ndị nwụrụ n’arụ ọkụ, nke n’oge ụfọdụ n’afọ na-abịa ugboro-ugboro n’ala ahụ—mana ọbụkarịghị na arụ ọkụ, n’ihi ịdị ezi-mma nke ụdị ọtụtụ aahịhịa na mgbọrọgwụ nile nke Chineke kwadoworo iji wepụ ihe na-akpata ọrịa nile, nke ndị mmadụ na-enweta site n’ụdị nke iru ụbọchị—

41 Mana e nwere ọtụtụ ndị nwụrụ site n’ime okenye; ma ndị nke nwụrụ n’ime okwukwe nke Kraịst nwere aan̄ụrị n’ime ya, dịka anyị kwesịrị iche.