Akwụkwọ nsọ
Alma 3


Isi 3

Ndị Amlịsaị kara onwe ha akara dịka ndị-amụma kwuworo—Ndị Leman ka a bụworo ọnụ n’ihi nnupụ-isi ha—Ndị mmadụ na-eweta ọbụbụ-ọnụ ha n’isi onwe ha—Ndị Nifaị wee merie ndị-agha nke ndị Leman ọzọ. Ihe dịka n’afo 87 ruo 86 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma o wee ruo na ndị Nifaị ndị a ana-egbughị site na ngwa-ọgụ nile nke agha, mgbe ha lisịworo ndị egbuworo—ugbua ọnụ-ọgụgụ ndị e gburu egbu agụtaghị ha ọnụ, n’ihi ịdị ukwuu nke ọnụ-ọgụgụ ha—mgbe ha lisịworọrịị ndị ha nwụrụ anwụ ha nile laghachịrị n’ala ha nile, na n’ụlọ ha nile, na ndị nwunye ha nile, na ụmụ ha.

2 Ugbua ọtụtụ ndịnyom na ụmụaka ka e gbuworo site na mma-agha, na kwa ọtụtụ igwe atụrụ ha na igwe ehi ha; na kwa ọtụtụ ubi mkpụrụ-akụkụ ha ka e bibiri, n’ihi na ọtụtụ igwe mmadụ zọpịara ha n’ụkwụ.

3 Ma ugbua ole ọbụla nke ndị Leman na ndị Amlịsaị dị bụ ndị e gbuworo n’elu akụkụ mmiri nke osimiri Saịdọn ka a tụbara n’ime ammiri nile nke Saịdọn; ma lee ọkpụkpụ ha nile dị n’ime omimi nile nke boke osimiri ahụ, ma ha dị ọtụtụ.

4 Ma andị Amlịsaị ka e gosịrị dịka ndị dị iche n’ebe ndị Nifaị nọ, n’ihi na ha betinyewọrịị onwe ha ihe nhụba ama jiri uhie n’egedege iru ha nile dịka n’ụdị nke ndị Leman; otu o sila dị ha akpụchabeghị isi ha nile dịka nke ndị Leman.

5 Ugbua isi nile nke ndị Leman ka akpụchasịrị; ma ha agba ọtọ, ma ọbụghị akpụkpọ-anụ nke e kere n’úkwù ha nile, na kwa uwe ize ndụ ha, nke e kere ha, na ụta ha nile, na akụ ha nile, na okwute ha nile, na ébè ha nile, na ihe ndị ọzọ.

6 Ma akpụkpọ arụ nke ndị Leman dị oji, dịka ihe nhụba ama nke e tịkwasịrị ndị nna ha, nke bụ aọbụbụ-ọnụ nye ha n’ihi njehie ha na inupu-isi megide ụmụnne ha nwoke, ndị bụ Nifaị, Jekob, na Josef, na Sam, ndị zịrị-ezi na ndị dị nsọ.

7 Ma ụmụnne ha nwoke chọrọ ibibi ha, ya mere a bụrụ ha ọnụ; ma Onye-nwe Chineke tịkwasịrị aihe nhụba ama n’arụ ha, e, n’arụ Leman na Lemuel, na kwa ụmụ nwoke nke Ịshmel, na ndịnyom nke Ịshmel.

8 Ma nke a ka e mere ka mkpụrụ-afọ ha wee dị iche site na mkpụrụ-afọ nke ụmụnne ha nwoke, ka site na nke ahụ Onye-nwe Chineke ga-echekwa ndị ya, ka ha ghara aịgwakọta ma kwere bn’omenala nile na-ezighị-ezi ndị ga-eweta mbibi ha.

9 Ma o wee ruo na onye ọbụla nke tịkọtara mkpụrụ-afọ ya na nke ndị Leman wetara otu ọbụbụ-ọnụ ahụ nye mkpụrụ-afọ ya.

10 Ya mere, onye-ọbụla nke kwere ka ndị Leman dufuo ya ka a kpọrọ n’okpuru isi ahụ, ma e nwere ihe nhụba ama e tinyere ya.

11 Ma o wee ruo na onye-ọbụla nke na-ekweghị an’omenala nke ndị Leman, kama kwere akụkọ-ndekọta ndị ahụ e dere ede ndị e wepụtara site n’ala nke Jerusalem, na kwa n’omenala nke ndị nna ha nile, nke bụ ezi-okwu, ndị kwere n’iwu-nsọ nile nke Chineke ma debe ha, ka a kpọrọ ndị Nifaị, ma-ọbụ ndị nke Nifaị, site n’oge ahụ gaa n’iru—

12 Ma ọ bụ ha bụ ndị debere akụkọ-ndekọta ndị ahụ nke bụ aezi-okwu maka ndị ha, na kwa maka ndị nke ndị Leman.

13 Ugbua anyị ga-alaghachị ọzọ n’ebe ndị Amlịsaị nọ, n’ihi na ha kwa nwere aihe nhụba ama e tinyere ha; e, ha tinyere onwe ha ihe nhụba-ama ahụ, e, ọbụna ihe nhụba-ama nke uhie n’elu egedege iru ha nile.

14 Otu a okwu nke Chineke ka e mezuru, n’ihi na ndị a bụ okwu ndị ahụ nke o kwuru nye Nifaị: Lee, ndị Leman ka m bụworo ọnụ, ma a ga m etịkwasị ihe nhụba ama n’arụ ha ka ha na mkpụrụ-afọ ha wee kewaa site na gị na mkpụrụ-afọ gị, site ugbua gaa n’iru na ruo mgbe nile, ma ọbụghị na ha chegharịrị site n’ajọọ-omume ha ma atụgharikwute m ka m wee meere ha ebere.

15 Ma ọzọ: A ga m etikwasị ihe nhụba-ama n’arụ onye ahụ nke ga-agwakọta mkpụrụ-afọ ya na nke ụmụnne gị nwoke, ka e wee bụọ kwa ha ọnụ.

16 Ma ọzọ: A ga m etịkwasị ihe nhụba-ama n’arụ onye nke na-alụso gị ọgụ na mkpụrụ-afọ gị.

17 Ma ọzọ, asị m onye ọbụla nke si n’ebe ị nọ pụọ agaghị akpọ kwa ya mkpụrụ-afọ gị ọzọ; ma a ga m agọzi gị, na onye-ọbụla a ga-akpọ mkpụrụ-afọ gị, site ugbua na ruo mgbe nile; ma ndị a bụ nkwa nile nke Onye-nwe nye Nifaị na nye mkpụrụ-afọ ya.

18 Ugbua ndị Amlịsaị amataghị na ha na-emezu okwu nile nke Chineke mgbe ha malitere itinye onwe ha ihe nhụba-ama n’egedege iru ha nile; otu o sila dị ha apụtawo na annupụ-isi pụtara ìhè megide Chineke, ya mere ọ dịịrị mkpa na ọbụbụ-ọnụ ahụ ga-adakwasị ha.

19 Ugbua ọ dị m ka asị na unu ga-ahụ na ha wetaara onwe ha ọbụbụ-ọnụ ahụ; ma ọbụna otu a ka onye ọbụla nke aa bụrụ ọnụ na-ewetara onwe ya amam-ikpe nke onwe ya.

20 Ugbua o wee ruo na ọtụtụ ụbọchị agafeghị ka a lụsịrị ọgụ nke a lụrụ n’ala nke Zarahemla, sịte n’aka ndị Leman na ndị Amlịsaị, na e nwere ndị-agha ọzọ nke ndị Leman batakwasịrị ndị nke Nifaị, an’otu ebe ahụ nke ndị-agha mbụ zutere ndị Amlịsaị.

21 Ma o wee ruo na o nwere ndị-agha e zipụrụ ịchụpụ ha site n’ala ha:

22 Ugbua Alma n’onwe ya ebe e amerụrụ ya arụ ọ galiteghị ọgụ n’oge nke a megide ndị Leman.

23 Mana o zipụlitere igwe ndị-agha megide ha; ma ha galitere ma gbuo ọtụtụ ndị Leman, ma chụpụ ndị nke fọdụrụ n’ime ha site n’oke ala nile nke ala ha.

24 Ma ha laghachịrị ọzọ ma malite ime udo n’ala ahụ, ebe ha na-enweghị kwa nsogbu ọzọ na nwa oge, ha na ndị iro ha nile.

25 Ugbua ihe ndị a nile ka e mere, e, agha nile na ndọrọ-ndọrọ nile ka a malitere ma kwụsị n’ime afọ nke ise nke ọchịchị nke ndị-ikpe.

26 Ma n’ime otu afọ ka e zigara ọtụtụ puku na iri-iri puku nke mkpụrụ-obi nile gaa ụwa ebighi-ebi, ka ha wee ghọrọ aọkwụkwụ-ụgwọ ọrụ ha nile dịka ọrụ ha nile siri dị, ma ha dị mma ma-ọbụ ma ha di njọ, ịghọrọ an̄ụrị ebighi-ebi ma-ọbụ nhuju-anya ebighi-ebi, dịka mụọ nke ha họọrọ irubere isi siri dị, ma-ọbụ ezigbo mụọ ma-ọbụ nke ọjọọ.

27 N’ihi na onye ọbụla na-anata aọkwụkwụ-ụgwọ n’aka onye ọ họọrọ birubere isi, ma nke a dịka okwu nile nke mụọ nke ibu-amụma, ya mere ka ọ dị dịka ezi-okwu ahụ. Ma otu a ka afọ nke ise nke ọchịchị ndị-ikpe siri kwụsị.