Akwụkwọ nsọ
Inọs 1


Akwụkwọ nke Inọs

Isi 1

Inọs wee kpesie ekpere ike ma rite uru nsachapụ nke mmehie ya nile—olu nke Onye-nwe wee bata n’ime obi ya, na-ekwe nkwa nzọpụta maka ndị Leman—Ndị Nifaị chọrọ inwetaghachị ndị Leman—Inọs wee nwee ọn̄ụ n’ime Onye-mgbapụta ya. Ihe dịka n’afọ 420 tutu amụọ Kraịst.

1 Lee, o wee ruo na mụ, aInọs, ebe m matara nna m na b bụ nwoke ziri-ezi—n’ihi na ọ ckụziri m n’asụsụ ya, na kwa na dnzulite na ịdọ-aka na-ntị nke Onye-nwe—Ma ngọzi na-adịrị aha nke Chineke m maka ya—

2 Ma a ga m agwa gị maka aịgba-mgba nke m nwere n’iru Chineke, tutu mụ enweta bnsachapụ nke mmehie m nile.

3 Lee, a gara m ịchụ-nta anụ n’ime oke-ọhịa; ma okwu ndị ahụ nke m nụworo ugboro-ugboro ka nna m na ekwu ya gbasara ndụ-ebighi-ebi, na aọn̄ụ nke ndị nsọ nile, bmibara ala-ala n’ime obi m.

4 Ma mkpụrụ-obi m wee anwee agụụ; ma e bgburu m ikpere n’ala n’iru Onye-meworo m ma m wee tikuo ya na nnukwu cekpere na arịrịọ n’ihi mkpụrụ-obi nke m, na ogologo ụbọchị nile ka m tikuru ya; e, ma mgbe abalị bịara e welịkwara m olu m elu nke mere na o ruru elu-igwe nile.

5 Ma o nwere aolu bịaruru m, na-asị: Inọs, mmehie gị nile ka a gbagharaworo gị, ma ị ga-adị ngọzi.

6 Ma mụ, Inọs matara na Chineke enweghị ike ikwu okwu ụgha; ya mere, ikpe-ọmụma m nke mụọ ka a zafuworo.

7 Ma a sịrị m: Onye-nwe, olee otu a na-esi eme ya?

8 Ma o wee sị m: N’ihi aokwukwe gị n’ime Kraịst, onye nke ị na-aka-anụtụghị olu ya ma-ọbụ hụtụ ya mbụ. Ma ọtụtụ afọ ga-agafe tutu ọ ga egosịpụta onwe ya n’anụ arụ; ya mere, gawa, okwukwe gị bazọpụtawo gị.

9 Ugbua, o wee ruo na mgbe m nụworo okwu ndị a m wee malite inwe aọchịchọ maka ọdịmma nke ụmụnne m, ndị Nifaị; ya mere, a bwụpụtachara m obi m nile nye Chineke maka ha.

10 Ma mgbe m ka nọrịị na-agba lịka lịka n’ime mụọ, lee, olu nke Onye-nwe batara n’ime auche m ọzọ, na-asị: A ga m eleta ụmụnne gị nwoke dịka mgbalị ike ha siri dị n’idebe iwu-nsọ m nile. E bnyewo m ha ala nke a, ma ọ bụ ala dị nsọ; ma a gaghị m cabụ ya ọnụ ma ọbụghị n’ihi ime arụ; ya mere, a ga m eleta ụmụnne gị nwoke dịka otu m kwuworo; ma njehie ha nile ka m ga-ewedata na mwute n’isi nke onwe ha.

11 Ma mgbe mụ, Inọs, nụworo okwu ndị a nile, okwukwe m malitere ịbụ akwa akwụrụ n’ime Onye-nwe; ma e kpere m ekpere nye Ya site n’ọtụtụ ogologo ịgba lịka-lịka nile maka ụmụnne m, ndị Leman.

12 Ma o wee ruo na mgbe m akpeworo ekpere ma rụọ ọrụ site na mgbalị, Onye-nwe sịrị m: A ga m emere gị dịka bọchịchọ gị siri dị, n’ihi okwukwe gị.

13 Ma ugbua lee, nke a bụ ọchịchọ nke m chọrọ n’aka ya—na ọbụrụ na ọ ga-adị otu ahụ, na ndị m, ndị Nifaị, ga-adaba n’ime njehie, ma site n’ụzọ ọbụla bụrụ ndị aebibiri, ma ndị Leman agaghị abụ ndị e bibiri, na Onye-nwe Chineke ga bedokwa akụkọ-ndekọta nke ndị m, ndị Nifaị; ọbụna ọbụrụ na ọ ga-adị otua site n’ike nke aka nsọ ya, na a cga-ewepụta ya n’ụbọchị dị n’iru nye ndị Leman, na, eleghị-anya, e nwere ike dweruta ha na nzọpụta—

14 N’ihi na n’oge ugbua, ịgba lịka-lịka anyị nile bụrịị ihe aefu n’idughachi ha n’ụzọ ezi okwukwe ahụ. Ma ha n̄ụrụ iyi n’oke iwe na, ọbụrụ na ọ ga-ekwe mee, ha bga-ebibi akụkọ-ndekọta anyị nile na anyị, na kwa omenala nile nke ndị nna anyị ha.

15 Ya mere, mụ ebe m matara na Onye-nwe Chineke nwere ike aidokwa akụkọ-ndekọta anyị, e bekuru m ya akwa n’esepụghị-aka, n’ihi na ọ sịwo m: Ihe ọbụla unu ga-arịọ n’okwukwe, kwere na unu ga-anata n’aha nke Kraịst, unu ga-anata ya.

16 Ma e nwere m okwukwe, ma e bekuru m Chineke akwa ka o wee achekwaa bakụkọ-ndekọta nile ahụ; ma mụ na ya gbara ndụ na ọ cga-ewepụta ha nye ndị Leman mgbe oge nke ya ruru.

17 Ma mụ, Inọs, matara na ọ ga-adị dịka ọgbụgba-ndụ nke o meworo; ya mere obi m zururịị ike.

18 Ma Onye-nwe sịrị m: Nna gị ha achọwo kwa n’aka m ihe nke a; ma a ga-emere ha ya dịka okwukwe ha siri dị; n’ihi na okwukwe ha dịrịi ka nke gị.

19 Ma ugbua o wee ruo na mụ Inọs, gagharịrị n’etiti ndị nke Nifaị, na-ebu-amụma maka ihe nile ga-abịa, ma na-agba-ama maka ihe nile nke m nụworo ma hụkwa.

20 Ma a na m agba ama na ndị nke Nifaị chọsịrị-ike ịkpọghachi ndị Leman n’ezi-okwukwe n’ime Chineke. Ma na aọrụ anyị nile bụ ihe efu; ịkpọ-asị ha bụ ihe e kedosịrị ike, ma ihe na-edu ha bụ ajọọ ndụ nke mere na ha enwetaghị ọzụzụ, ma dị egwu, na bndị agụụ-ọbara na-agụ, jupụta cn’ife arụsị na iru-inyi; anụ n’eri ibe ha ka ha ji eme ihe oriri; na-ebi n’ime ụlọ ikwuu, ma na-akpagharị n’ime ọzara site n’iyi mkpirisi-uwe akpụkpọ-anụ n’ukwu ma isi ha bụrịị ihe a kpuchara akpucha ma ime-nka ha dị n’ime dụta ha, na n’ime mma-agha ha na onyike ha. Ma ọtụtụ n’ime ha anaghị-eri ihe ọbụla ma ọbụghị anụ ndụ; ma ha na-achọ esepụghị-aka ibibi anyị.

21 Ma o wee ruo na ndị nke Nifaị na-akọ ala, ma azụlite ụdị mkpụrụ-nke-ubi nile, na nke mkpụrụ-osisi, na igwe-nke anụmanụ nile, na igwe nke ụdị ehi di ịche ịche, na ewu nile na ewu ọhịa nile, na kwa ọtụtụ ịnyịnya-nile.

22 Ma e nwere ọtụtụ andị-amụma karịrị akarị n’etiti anyị. Ma ndị mmadụ a bụ bndị na-akpọ-ekwe-nkụ, ọ na-ara ahụ ịghọta ha.

23 Ma onweghị ihe ọbụla dị ma ọbụghị oke aịbasi mba ike, bikwusa ozi-ọma na ibu-amụma maka agha nile, na ndọrọ-ndọrọ nile na mbibi nile, na esepụghị-aka cichetara ha maka ọnwụ, na agwụ-agwụ nke mgbe ebighi-ebi, na ikpe nile na ike nke Chineke, na ihe ndị a nile—na-akpalite ha desepụghị aka ka e debe ha n’ịtụ egwu nke Onye-nwe. A sị m ọdịghị ihe ọbụla dị ma ọbụghị ihe ndị a, na nnukwu ịdị-mfe nghọta karịrị akarị nke ikwu okwu, ga-edebe ha site n’igbada ọsọ-ọsọ ruo mbibi. Ma n’ụdị a ka m na-ede gbasara ha.

24 Ma a hụrụ m ọtụtụ agha n’etiti ndị Nifaị na ndị Leman n’oge njem nke ụbọchị m nile.

25 Ma o wee ruo na a malitere m ịka-nka, ma otu narị afọ na iri asaa na iteghete agafewọrịị site n’oge nna anyị Lihaị ahapụrụ Jerusalem.

26 Ma m wee hụ na a ga m agbada ruo ili m na nso nso, ebe emejupụtaworo m n’ike nke Chineke na m ga-ekwusarịrị okwu ahụ ma buo-amụma nye ndị mmadụ a, ma kwupụta okwu ahụ dịka ezi-okwu ahụ nke dị n’ime Kraịst. Ma e kwupụtawo m ya n’ụbọchị m nile, ma e nwewo m ọn̄ụ n’ime ya karịa ndị nke ụwa.

27 Ma a na m aga na nso nso n’ebe aizu-ike m, nke bụ mụ na Onye-mgbapụta m; n’ihi na a ma m na n’ime ya a ga m ezu-ike. Ma a na m an̄ụrị-ọn̄ụ n’ụbọchị bahụ mgbe arụ m ga-eyịkwasị canwụghị-anwụ, ma ga-eguzoro n’iru ya; mgbe ahụ ka m ga-ahụ iru ya n’inwe mmasị, ma ọ ga-asị m: Bịakwute m, gị onye agọziri agọzi, o nwere ebe e doziri nye gị n’ime ọtụtụ debe obibi nke Nna m. Amen.