Akwụkwọ nsọ
Alma 7


Okwu nile nke Alma nke o kwuru nye ndị nke nọ na Gịdiọn, dịka akụkọ-ndekọta nke onwe ya siri dị.

Mejupụtara isi 7.

Isi 7

Kraịst ka a ga-amụ site na Meri—Ọ ga-atọpụ agbụ nile nke ọnwụ ma buru mmehie nile nke ndị ya—Ndị nke chegharịrị, e mee ha baptism, ma debe iwu-nsọ nile ga-enwe ndụ ebighi-ebi—Iru inyi enweghị ike iketa ala-eze nke Chineke—Ịdị umeala, okwukwe, olile-anya, na afọ-ọma ka a chọrọ. Ihe dịka n’afọ 83 tutu amụọ Kraịst.

1 Lee ụmụnne m nwoke m hụrụ n’anya, ebe m hụrụ na enyewo m ikike ịbịakwute unu, ya mere a na m agbalị aịgwa unu okwu n’asụsụ m; e, site n’ọnụ nke m, ebe m hụworo na ọ bụ nke mbụ m gwaworo unu okwu site n’okwu nile nke ọnụ m, mụ ebe edebeworo m n’otu ebe kpam kpam bn’oche-ikpe ahụ, ebe m nweworọrị nnukwu ọrụ nke mere na m enweghị ike ịbịakwute unu.

2 Ma ọbụnadị na agaraghị m enwe ike ịbịa ugbua n’oge a ma ọbụghị na oche ikpe ahụ ka e anyeworo onye ọzọ, ịchị n’ọnọdụ m; ma Onye-nwe na nnukwu obi ebere ekwerewo na m ga-abịakwute unu.

3 Ma lee, abịawo m ebe m nwere nnukwu olile-anya nile na nnukwu ọchịchọ na m ga-achọpụta na unu emewo onwe unu umeala n’ịrụ Chineke, ma na unu agawo n’iru n’ikpe ekpere maka amara ya, nke mere na m ga-achọpụta na unu enweghị ụta n’iru ya, nke mere na m ga-achọpụta na unu anọghị n’ọnọdụ amaghị nke a ga-ahọrọ dị egwu nke ụmụnne anyị nwoke nọrọ n’ime ya na Zarahemla.

4 Ma na ngọzi na-adịrị aha nke Chineke, na o nyeworo m ịmata, e, o nyewo m nnukwu ọn̄ụ ahụ karịrị akarị nke ịmata na e hiwere ha ọzọ n’ụzọ nke ezi-omume ya.

5 Ma a tụkwasịrị m obi, dịka Mụọ nke Chineke nke dị n’ime m, na m ga-enwe kwa ọn̄ụ maka unu; otu o sila dị achọghị m na ọn̄ụ m maka unu ga-abịa site na nnukwu mkpagbu na mwute nke m nwetaworo maka ụmụnne nwoke ahụ ndị nke nọ na Zarahemla, n’ihi na lee, ọn̄ụ m na-abịa maka ha mgbe ha wagharịworo gafee nnukwu mkpagbu na mwute.

6 Ma lee, a tụkwasịrị m obi na unu anọghị n’ọnọdụ nke oke nnukwu ekweghị-ekwe dịka ụmụnne unu nwoke siri nọrọ; atụkwasịrị m obi na unu ebulighị onwe unu elu na mpako nke obi unu nile; e, atụkwasịrị m obi na unu etinyebeghị obi unu nile na akụ n’ụba nile na ihe efu nile nke ụwa; e, atụkwasịrị m obi na unu anaghị ekpere aarụsị, mana unu na efe bChineke ezi-okwu ahụ dị ndụ, ma na unu na-ele anya maka nsachapụ nke mmehie unu nile, jiri okwukwe mgbe nile na-adigide, nke ga-abịa.

7 N’ihi na lee, asị m unu e nwere ọtụtụ ihe ndị ga-abịa; ma lee, o nwere otu ihe nke dị mkpa karịa ha nile—n’ihi na lee, aoge ahụ adịghị anya mgbe Onye-mgbapụta ga-adị ndụ ma ga-abịa n’etiti ndị ya.

8 Lee, asịghị m na ọ ga-abịa n’etiti anyị n’oge nke ọ ga-ebi n’ụlọ nsọ ya na-anwụ anwụ; n’ihi na lee, Mụọ ahụ asịbeghị m na otu a ka ọ ga-esi mee. Ugbua maka ihe nke a amaghị m; mana ole a ka m matara, na Onye-nwe Chineke nwere ike ime ihe nile nke bụ dịka okwu ya siri dị.

9 Mana lee, Mụọ ahụ agwawo m nke ha otu a, na-asị: Tikuo ndị a, na-asị—achegharịa nụ, ma dozie ụzọ nke Onye-nwe, ma gaa ije n’ụzọ ya nile, nke guzoro kwe m; n’ihi na lee, ala-eze nke elu-igwe dị nso, ma Ọkpara nke Chineke bna-abịa n’elu iru nke ụwa.

10 Ma lee, aMeri bga amụ ya, na Jerusalem nke dị cn’ala nke ndị nna-nna anyị ha, ebe ọ bụ dnwa agbọghọ na-amaghị nwoke, onye dị oke ọnụ-ahịa na abọ a rọpụtaworo, onye a ga ekpuchido ma etụọ ime site n’ike nke Mụọ Nsọ, ma mụta nwa nwoke, e, ọbụna Ọkpara nke Chineke.

11 Ma ọ ga-agagharị, na-ata ahụhụ mgbu nile na amkpagbu nile na ọnwụnwa nile n’ụdị ọbụla; ma nke a ka e wee mezuo okwu ahụ nke sịrị na ọ ga ebukwasị onwe ya ihe mgbu nile na ọrịa nile nke ndị ya.

12 Ma ọ ga ebukwasị onwe ya aọnwụ, ka o wee tọpụ agbụ nile nke ọnwụ nke kere ndị ya; ma ọ ga ebukwasị onwe ya adịghị ike ha nile, ka afọ ya nile wee jupụta n’ebere, dịka n’anụ arụ, ka o wee mata dịka n’anụ arụ otu ọ ga-esi bnyere ndị ya aka dịka adịghị ike ha nile siri dị.

13 Ugbua Mụọ ahụ amaara ihe nile; otu o sila dị Ọkpara Chineke na-ata ahụhụ dịka n’anụ arụ na ọ ga bebukwasị onwe ya mmehie nile nke ndị ya, ka o wee hichapụ njehie ha nile dịka ike nke nnapụta ya siri dị; ma ugbua lee, nke a bụ ama ahụ nke dị n’ime m.

14 Ugbua asị m unu na unu ga-echegharịrị, ma a amụọ unu ọzọ; n’ihi na Mụọ ahụ sịrị ọbụrụ na amụghị unu ọzọ unu enweghị ike iketa ala-eze nke elu-igwe; ya mere bịa ma ka emee unu baptism igosi nchegharị, ka e wee sachaa unu site na mmehie unu nile, ka unu wee nwe okwukwe na Nwa-atụrụ nke Chineke ahụ, onye na-ebupụ mmehie nile nke ụwa, onye bụ dike n’ịzọpụta na ịsacha site n’enweghị ezi-omume nile.

15 E, asị m unu bịa ma atụla ụjọ, ma wezuga n’akụkụ mmehie nile, nke ana-esogbu unu oge nile, nke na-ekeda unu ruo mbibi, e, bịa ma ga nụ n’iru, ma gosị Chineke unu na unu dị na njikere ichegharị site na mmehie unu nile ma baa n’ime ọgbụgba-ndụ unu na ya idebe iwu-nsọ ya nile, ma gbaara ya aka-ebe maka ya n’ụbọchị a site n’iga n’ime mmiri nile nke baptism.

16 Ma onye ọbụla nke na-eme nke a, ma na-edebe iwu-nsọ nile nke Chineke site mgbe ahụ gaa n’iru, otu onye ahụ ga-echeta na asị m ya, e, ọ ga-echeta na asịwo m ya, ọ ga-enwe ndụ-ebighi-ebi, dịka ịgba-ama nke Mụọ Nsọ, nke na-agba ama n’ime m siri dị.

17 Ma ugbua ụmụnne m nwoke m hụrụ n’anya, unu kwere ihe ndị a nile? Lee, asị m unu, e, ama m na unu kwere ha; ma ụzọ ahụ nke m matara na unu kwere ha bụ na ngosipụta nke Mụọ ahụ nke dị n’ime m. Ma ugbua n’ihi na okwukwe unu siri ike gbasara ya, e, gbasara ihe ndị nke m kwuworo, nnukwu ka ọn̄ụ m dị.

18 N’ihi na dịka m gwaworo unu site na mmalite, na m nwere nnukwu ọchịchọ na unu anọghị n’ọnọdụ amaghị nke a ga-ahọrọ dịka ụmụnne unu nwoke, ọbụna otu a achọpụtara m na ọchịchọ m emezuworịị.

19 N’ihi na ahụrụ m na unu nọ n’ụzọ nile nke ezi-omume; ahụrụ m na unu nọ n’ụzọ nke na-eduga n’ala-eze nke Chineke; e, ahụrụ m na unu na-eme aụzọ ya nile ka ha guzokwem.

20 Ahụrụ m na emewo ka unu mata ya, site n’ịgba-ama nke okwu ya, na o nweghị ike aịga ije n’ụzọ gbagọrọ agbagọ; ọbụghị ma ọ na-agbanwe site n’ihe ahụ nke o kwuworo; ọbụghị ma o nwere onyinyo nke ịtụgharị site n’aka nri ga n’aka ekpe, ma-ọbụ site n’ihe ahụ nke zịrị ezi ga n’ihe ahụ nke na-ezighị ezi; ya mere, ụzọ ya bụ otu gburu-gburu ebighi-ebi.

21 Ma ọ naghị ebi na atemple nile na-adịghị nsọ; ọbụghị ma inyi ma-ọbụ ihe ọbụla nke na-adịghị ọcha a ga-anabata ya n’ime ala-eze nke Chineke; ya mere asị m unu oge ahụ ga-abịa, e, ma ọ ga-abụ n’ụbọchị ikpe-azụ, na onye ọbụla nke bruru inyi ga-anọgide n’iru inyi ya.

22 Ma ugbua ụmụnne m nwoke m hụrụ n’anya, a gwawo m unu ihe ndị a nile ka m wee kpọte unu ruo n’inwe mmetụta nke ọrụ unu n’ebe Chineke nọ, ka unu wee gaa ije n’enweghị ụta n’iru ya, ka unu wee gaa ije dịka usoro nsọ nke Chineke siri dị; nke esịworo n’ụdị ya nabata unu.

23 Ma ugbua ọ dị m ka asị na unu ga-adị aumeala, ma nwee nrube-isi ma dị nwayọ; esighị ike mmeta; jupụta na ndidi na ogologo-ntachi-obi; na-eme ihe nile n’oke; na-agbalịsị ike n’idebe iwu-nsọ nile nke Chineke oge nile; na-arịọ ụdị ịhe ọbụla na-akpa unu, ma na nke mụọ na nke arụ; oge nile na-enyeghachị Chineke ekele maka ụdị ihe ọbụla unu natara.

24 Ma hụ na unu nwere aokwukwe, olile-anya, na afọ-ọma, ma mgbe ahụ unu ga-anọgide n’ezigbo ọrụ oge nile.

25 Ma ka Onye-nwe gọzie unu, ma debe uwe unu nile n’enweghị ntụpọ, ka e nwe ike n’ikpe-azụ ịkpọta unu ịnọdụ ala unu na Abraham, Aịsak, na Jekọb, na ndị-amụma nile dị nsọ ndị nke biworo site na mgbe ụwa malitere, na-edebe uwe unu nile n’enweghị ntụpọ ọbụna dịka uwe ha nile na aenweghị ntụpọ, n’ala-eze nke elu-igwe ghara ipụ kwa ọzọ.

26 Ma ugbua ụmụnne m nwoke m hụrụ n’anya, a gwawo m unu okwu nile ndị a dịka Mụọ ahụ nke na-agba ama n’ime m siri dị; ma mkpụrụ-obi m na-an̄ụrị ọn̄ụ karịa, n’ihi mgbalị karịrị akarị na nleba anya nke unu nyeworo okwu m.

27 Ma ugbua, ka audo nke Chineke dakwasị unu, na dakwasị ụlọ unu nile na ala unu nile, ma dakwasị igwe anụ unu na igwe anụmanụ unu, na ihe nile nke unu nwere, ndịnyom unu na ụmụ unu, dịka okwukwe unu na ọrụ ọma nile unu siri dị, site ugbua gaa n’iru na ruo mgbe nile. Ma otu a ka m kwuworo. Amen.