Akwụkwọ nsọ
Alma 9


Okwu nile nke Alma, na kwa okwu nile nke Amiulek, ndị e kwupụtara nye ndị nke nọ n’ala nke Amọnaịha. Na kwa a tụbara ha n’ime ụlọ-mkpọrọ, ma a napụtara ha site n’ike ọrụ ebube nke Chineke nke dị n’ime ha, dịka akụkọ-ndekọta nke Alma siri dị.

Mejupụtara isi 9 ruo isi 14 e tinyekọtara.

Isi 9

Alma wee nye ndị Amọnaịha iwu ka ha chegharịa—Onye-nwe ga-emere ndị Leman ebere n’ụbọchị ikpe-azụ nile—Ọbụrụ na ndị Nifaị jụ ìhè ahụ, a ga-ebibi ha site na ndị Leman—Ọkpara nke Chineke ga-abia ọsọ-ọsọ—Ọ ga-agbapụta ndị chegharịrị, e mere baptism ma nwe okwukwe n’aha Ya. Ihe dịka n’afọ 82 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ọzọ, mụ, Alma, ebe enyeworo m iwu site na Chineke na m ga-akpọrọ Amiulek ma gagharịa ma kwusaa ozi-ọma ọzọ nye ndị a, ma-ọbụ ndị ahụ nọ n’obodo-ukwu nke Amọnaịha, o wee ruo ka m malitere ikwusa ozi-ọma nye ha, ha malitere ịdọso m ndọrọ ndọrọ, na-asị:

2 Onye ka Ị bụ? I chere na anyị ga-ekwere ịgba-ama nke aotu nwoke, ọbụnadị na ọ ga-ekwusara anyị ozi-ọma na ụwa ga-agabiga?

3 Ugbua ha aghọtaghị okwu nile ha na-ekwu; n’ihi na ha amataghị na ụwa ga-agabiga.

4 Ma ha sịkwara: Anyị agaghị e kwere okwu gị nile ma ọbụrụ na Ị ga-ebu amụma na nnukwu obodo-ukwu a ka a ga-ebibi an’otu ụbọchị.

5 Ugbua ha amataghị na Chineke nwere ike ịrụ ụdị ọrụ ịtụ-n’anya ndị a, n’ihi na ha bụ ndị-obi-ike na ndị na-akpọ-ekwe-nkụ.

6 Ma ha sịrị: aOnye bụ Chineke, nke na-adịghị ezite bikike ọzọ ewezuga otu onye n’etiti ndị a, n’ikwupụtara ha ezi-okwu nke ụdị nnukwu na ihe ịtụ n’anya ndị a?

7 Ma ha guzokọtara ịtụkwasị aka ha n’arụ m; mana lee, ha emeghị ya. Ma eguzoro m n’atụghị egwu ikwupụtara ha, e, agbara m ama nye ha n’atụghị egwu, na-asị:

8 Lee, O unu ndị ajọọ-mmadụ na aọgbọ njehie, olee otu unu siri chefuo omenala nke ndị nna unu; e, lee otu ọsọ-ọsọ unu siri chefuo iwu-nsọ nile nke Chineke.

9 Unu anaghị echeta na nna anyị, Lihaị, ka akpọpụtara site na Jerusalem site an’aka nke Chineke? Unu echetaghị na ha nile ka o duuru gafee ọzara ahụ?

10 Ma unu echefuwo oke ọsọ-ọsọ ugboro ole ọ napụtara ndị nna anyị ha site n’aka nile nke ndị iro anyị nile, ma chekwaa ha site n’ịbụ ndị e bibiri ebibi, ọbụna site n’aka nile nke ụmụnne ha nwoke?

11 E, ma ọbụrụ na ọbụghị maka ike ya na-enweghị atụ, na ebere ya, na ogologo-ntachị obi n’ebe anyị nọ, anyị gaara na-enweghị mgbochi abuwọrịị ndị ebepụrụ site n’iru nke ụwa ogologo oge tutu o ruo oge dị ugbua, ma n’eleghị anya etinyewọrịị anyị n’ọnọdụ nke anhụjụ-anya agwụgh-agwụ na ahụhụ.

12 Lee, ugbua asị m unu na ọ na-enye unu iwu ka unu chegharịa; ma ma ọbụghị na unu chegharịrị, enweghị ụzọ unu ga-esi keta ala-eze Chineke. Mana lee, nke a abụghị ihe nile—ọ nyewo unu iwu ka unu chegharịa, ma-ọbụ ọ ga aebibi unu kpam kpam site n’iru nke ụwa; e, ọ ga-eleta unu n’iwe ọkụ ya, ma bn’iwe ya dị egwu ọ gaghị elefu anya.

13 Lee, unu echetaghị okwu nile nke ọ gwara Lihaị, na-asị na: aỌbụrụraa na unu ga- edebe iwu-nsọ m nile, unu ga-eme nke ọma n’ala ahụ? Ma ọzọ e kwuru na: Ọbụrụraa na unu agaghị edebe iwu-nsọ m nile a ga-ebepụ unu site n’ebe Onye-nwe nọ.

14 Ugbua ọ dị m ka asị na unu ga-echeta, na ọbụrụraa na ndị Leman edebebeghị iwu-nsọ nile nke Chineke, aebepụwo ha site n’ebe Onye-nwe nọ. Ugbua anyị na-ahụ na okwu nke Chineke achọpụtawo ya n’ihe nke a, ma ebepụwo ndị Leman site n’iru ya, site na mmalite nke njehie ha nile n’ala ahụ.

15 Otu o sila dị asị m unu, na ọ ga-aka ikwe ha annagide n’ụbọchị ikpe ahụ karịa ikwe unu, ma ọbụrụ na unu nọgide n’ime mmehie nile unu, e, ma ọbụna ikwe ha nnagide n’ụwa nke a karịa ikwe unu, ma ọbụghị na unu chegharịrị.

16 N’ihi na e nwere ọtụtụ nkwa ndị e mere ka o aruo ndị Leman; n’ihi na ọbụ n’ihi bomenala nile nke ndị nna ha bụ ihe mere ha ịnọgide n’ọnọdụ camaghị ihe ha; ya mere Onye-nwe ga-emere ha ebere ma ddọtịa obibi ha n’ala ahụ ogologo.

17 Ma mgbe oge ga-eru a aga-eweta ha n’ikwere n’okwu ya, na ịmata maka emezighi emezi nke omenala nile nke ndị nna ha; ma ọtụtụ ha ka a ga-azọpụta, n’ihi na Onye-nwe ga-enwe obi ebere nye ndị nile bna-akpọkụ aha ya.

18 Mana lee, asị m unu na ọbụrụ na unu nọgide n’ajọọ-omume unu n’ụbọchị unu nile agaghị adọtị ha ogologo n’ala ahụ, n’ihi na andị Leman ka a ga-ezitekwasị unu; ma ọbụrụ na unu echegharịghị ha ga-abịa n’oge unu na-amataghị, ma a ga-eleta unu site na bmbibi kpam kpam; ma ọ ga-abụ dịka ciwe dị egwu nke Onye-nwe siri dị.

19 N’ihi na ọ gaghị ekwe na unu ga-ebi n’ime ajọọ-omume nile unu, ibibi ndị ya. Asị m unu, E-e; ọ ga-akara ya mma na ndị Leman aga-ebibi ndị ya nile a na-akpọ ndị nke Nifaị, ọbụrụ na ọ ga-ekwe mee na ha bga-adaba n’ime mmehie nile na njehie nile, mgbe ha nwetasịworo nnukwu ìhè ha otu a na mmụta ha otu a e nyere ha site n’Onye-nwe Chineke ha;

20 E, mgbe ha bụworo ndị egosịworo iru ọma dị elu otu a site n’Onye-nwe; e, mgbe egosịworo unu iru ọma karịa ndị mba ọzọ nile, ebo, asụsụ, ma-ọbụ mmadụ; mgbe ha nwetasịworo ihe nile e amere ka ha mata, dịka ọchịchọ ha nile siri dị, na okwukwe ha, na ekpere ha nile, site na nke dịworo, na nke dị, na nke ga-abịa abịa;

21 Ebe eletaworo ha site na Mụọ nke Chineke; ebe ha kparitaworo ụka ha na ndị mụọ-ozi, na ebe agwaworo ha okwu site n’olu nke Onye-nwe; ma ebe ha nwere mụọ nke ibu amụma, na mụọ nke mkpughe, na kwa ọtụtụ onyinye nile, onyinye nke ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche, na onyinye nke ikwusa ozi-ọma, na onyinye nke Mụọ Nsọ, na onyinye nke aịtụgharị okwu;

22 E, na mgbe Chineke anapụtaworo ha site n’ala nke Jerusalem, site n’aka nke Onye-nwe; ebe a zọpụtaworo ha site n’ụnwụ, na site n’ọrịa, na n’ụdị nrịa-nrịa nile dị iche iche n’ụdị ọbụla; ma ha ebe ha gbasịworo ike n’agha, ka a ghara ibibi ha; ebe a kpọpụtaworo ha site bn’ịbụ-oru ugboro ugboro, na ebe e edebeworo ha ma chekwaa ha ruo ugbua; ma ebe e meworo ka ha mee nke ọma ruo mgbe ha bara ụba n’ụdị ihe nile dị iche iche—

23 Ma ugbua lee asị m unu, na ọbụrụ na ndị a, nataworo ọtụtụ ngọzi nile site n’aka nke Onye-nwe, ga-ejehie megide ihe ahụ na ọmụma nke ha nwere, asị m unu na ọbụrụ nke a bụrụ otu ọ dị, na o bụrụ na ha ga-adaba n’ime njehie, ọ ga-aka aikwe nnagide nye ndị Leman karịa ha.

24 N’ihi na lee, ankwa nile nke Onye-nwe ka a dọtịrị nye ndị Leman, mana ha abụghị nye unu ma ọbụrụ na unu jehie; n’ihi na Onye-nwe o kwebeghị udị nkwa a ọsọ-ọsọ ma nye iwu siri ike, na ọbụrụ na unu ga-enupu isi megide ya na unu ga-abụ ndị ebibiri kpam kpam site n’iru nke ụwa?

25 Ma ugbua n’ihi nke a, ka a ghara ibibi unu, Onye-nwe ezigawo mụọ-ozi ya ileta ọtụtụ ndị ya, na-ekwupụta nye ha na ha ga-agarịrị n’iru ma tisie mkpu ike nye ndị a, na-asị: aChegharịa nụ, n’ihi na ala-eze nke elu-igwe adịwo nso;

26 Ma ọ agaghị adị ọtụtụ ụbọchị site ugbua Ọkpara nke Chineke ga-abịa n’otuto ya; ma ebube ya ga-abụ otuto nke bOnye Nna Mụrụ Nanị Ya, jupụtara cn’amara, ahata-aha, na ezi-okwu, jupụta na ndidi, debere, na ogologo-ntachi-obi, eịnụ akwa ndị nke ya ọsọ-ọsọ na ịza ekpere ha nile.

27 Ma lee, ọ na-abịa aịgbapụta ndị a bga-eme baptism baa na nchegharị, site n’okwukwe n’aha ya.

28 Ya mere, dozie nu ụzọ nke Onye-nwe, n’ihi na oge ahụ adịwo nso mgbe mmadụ nile ga-anata ọkwụkwụ-ụgwọ nke aọrụ ha nile, dịka otu ahụ ha dịworo—ọbụrụ na ha bụ ndị ezi-omume ha bga-aghọta mkpụrụ nzọpụta nke mkpụrụ-obi ha nile, dịka ike ahụ na nnapụta nke Jisus Kraịst siri dị; ma ọbụrụ na ha bụ ndị ọjọọ ha ga-anata cọmụma-ikpe nke mkpụrụ-obi ha nile, dịka ike na ịba n’oru nke ekwensu.

29 Ugbua lee, nke a bụ olu nke mụọ-ozi ahụ, na-etiku ndị ahụ.

30 Ma ugbua, aụmụnne m nwoke ndị m hụrụ n’anya, n’ihi na unu bụ ụmụnne m nwoke, ma unu kwesịrị ịbụ ndị a hụrụ n’anya, ma unu kwesịrị iwepụta ọrụ nile ndị dị mma igosị nchegharị, ebe m hụrụ na obi unu nile ka emesịworo oke ike megide okwu nke Chineke, ma ebe m hụrụ na unu bụ ndị bfuru-efu na ndị dara ada.

31 Ugbua o wee ruo na mgbe mu, Alma, kwuworo okwu ndị a nile, lee, ndị ahụ wesoro m iwe n’ihi na asịrị m ha na ha bụ ndị obi ike na ndị ana-akpọ-ekwe-nkụ.

32 Na kwa n’ihi na asịrị m ha na ha bụ ndị furu-efu na ndị dara ada ha wesoro m iwe, ma chọọ ijide m, ka ha wee tụba m n’ime ụlọ mkpọrọ.

33 Mana o wee ruo na Onye-nwe ekweghị ha na ha ga-akpọrọ m n’oge ahụ ma tụba m n’ime ụlọ mkpọrọ.

34 Ma o wee ruo na Amiulek gara ma guzoro, ma malite ikwusa ozi-ọma nye kwa ha. Ma ugbua aokwu nile nke Amiulek edeghị ha nile, otu o sila dị ụfọdụ okwu ya nile ka e dere n’ime akwụkwọ a.