Akwụkwọ nsọ
Alma 61


Isi 61

Pehoran wee gwa Moronaị maka ọgba-aghara na nnupụ-isi megide ndị ọchịchị ahụ—Ndị ọchọ-eze wee were Zarahemla ma nọọ na nkwekọrịta ha na ndị Leman—Pehoran wee rịọ maka enyem-aka ngwa-agha megide ndị nnupụ-isi ahụ nile. Ihe dịka n’afọ 62 tutu amụọ Kraịst.

1 Lee, ugbua o wee ruo na ngwa-ngwa Moronaị zipụworo akwụkwọ-ozi ya nye onye-isi ọchịchị, ọ natara akwụkwọ-ozi site n’aka aPehoran, onye-isi ọchịchị. Ma ndị a bụ okwu nile nke ọ natara:

2 Mụ, Pehoran, onye abụ m onye-isi ọchịchị nke ala nke a, na-ezigara Moronaị okwu nile ndị a, onye-isi ọchị-agha na-achị ndị-agha. Lee, asị m gị, Moronaị, anaghị m enwe ịn̄ụrị ọn̄ụ na nnukwu amkpagbu nile unu, e, ọ na ewute mkpụrụ-obi m.

3 Mana lee, o nwere ndị na-an̄ụrị ọn̄ụ na mkpagbu unu nile, e, nke mere na ha ebiliwo na nnupụ-isi megide m, na kwa ndị nke m ahụ bụ andị nwere onwe ha, e, ma ndị ahụ biliteworo dị imerime n’ọnụ-ọgụgụ karịa.

4 Ma ọ bụ ndị ahụ chọworo ịwepụ oche-ikpe ahụ site n’aka m bụ ndị kpataworo nnukwu ajọọ-omume nke a: n’ihi na ha ejiriwo nnukwu otuto n’esighị n’obi, ma ha edufuwo obi nile nke ọtụtụ mmadụ, nke ga-abụ ihe ga-akpata mkpagbu dị-egwu n’etiti anyị; ha ejịchiwo ihe-oriri anyị nile, ma ha amajawo ndị anyị nwere-onwe ha ka ha ghara ịbịakwute gị.

5 Ma lee, ha achụpụwo m n’iru ha, ma agbagawo m ala nke Gịdiọn, kpọrọ ndịkom ole m nwere ike inweta.

6 Ma lee, ezigawo m ọmụma-ọkwa gazuo akụkụ ala nke a; ma lee, ha na-gbakọta kwute anyị kwa ụbọchị, rute na ngwa-agha ha nile, na nchekwa nke mba ha na ainwere-onwe ha, na ibọ-ọbọ ihe nile e mejọrọ anyị.

7 Ma ha abịakwutewo anyị, nke mere na ndị nke biliteworo na nnupụ-isi megide anyị eguzogidere ha, e, nke mere na ha na-atụ anyị egwu ma ha agaghị anwa-anwa ịpụta ịbịa megide anyị n’ịlụ agha.

8 Ha enwetawo onwunwe nke ala ahụ, ma-ọbụ obodo-ukwu ahụ, nke Zarahemla; ha ahọpụtawo eze ga-achị ha, ma o degaworo eze nke ndị Leman akwụkwọ, n’ime nke o sonyeworo njikọta-ọnụ ya na ha; n’ime nke njikọta ahụ o kwerewo ichekwa obodo-ukwu nke Zarahemla ahụ, nchekwa nke o chere ga-enyere ndị Leman aka imeri ala ndị ahụ fọdụrụ, ma a ga-edebe ya eze na-achị ndị a mgbe a ga-emeri ha n’okpuru ndị Leman.

9 Ma ugbua, n’ime akwụkwọ-ozi gị ị kwutọwo m, mana ọ dịghị ihe o mere; iwe anaghị ewe m, kama ana m an̄ụrị-ọn̄ụ na nnukwu obi nke gị. Mụ, Pehoran, anaghị achọ ike, ma ọbụghị nanị idebe oche-ikpe m ka m wee chekwaa ihe nile ruru ha na ntọhapụ nke ndị m. Mkpụrụ-obi m na-eguzosike na ntọhapụ ahụ n’ime nke Chineke meworo ka anyị anwere onwe anyị.

10 Ma ugbua, lee, anyị ga eguzogide ajọọ-omume ọbụna ruo n’ịkwafu ọbara. Anyị agaghị akwafu ọbara nke ndị Leman ma ọbụrụ na ha ga-anọdụ n’ala nke ha.

11 Anyị agaghị akwafu ọbara nke ụmụnne anyị nwoke ma ọbụrụ na ha agaghị ebilite na nnupụ-isi ma buru mma-agha imegide anyị.

12 Anyị ga-edebe onwe anyị n’ibu-arọ nke ịbụ-oru ma ọbụrụ na ọ dị mkpa site na ikpe-ziri-ezi nke Chineke, ma-ọbụ ọbụrụ na ọ ga-enye anyị iwu ime otu ahụ.

13 Mana lee o nyeghị anyị iwu na anyị ga-edebe onwe-anyị n’okpuru ndị iro anyị, kama na anyị ga-etinye antụkwasị-obi anyị na ya, ma ọ ga-anapụta anyị.

14 Ya mere, nwanne m nwoke m hụrụ n’anya, Moronaị, ka anyị guzogide ihe ọjọọ, ma ihe ọjọọ ọbụla anyị na-enweghị ike iguzogide n’okwu anyị nile, e, ndị dị ka nnupụ-isi na nghọtahịe nile, ka anyị jiri mma-agha anyị nile aguzogide ha, ka anyị wee nwe ike debe inwe-onwe anyị, ka anyị wee nwe ike n̄ụrịa ọn̄ụ n’ime nnukwu ohere nke nzukọ-nsọ anyị, na n’ihe gbasara Onye-mgbapụta anyị na Chineke anyị.

15 Ya mere, bịakwute m ọsọ-ọsọ gị na ndịkom gị ole na ole, ma ghara ndị fọdụrụ na nchedo nke Lihaị na Tiankọm; nye ha ike idu ndị-agha n’akụkụ ala ahụ, dịka aMụọ nke Chineke siri dị, nke bụ kwa mụọ nke inwere-onwe nke dị n’ime ha.

16 Lee ezigaworo m ha ihe-oriri ole na ole, ka ha ghara ịnwụ ruo mgbe ị ga-enwe-ike bịakwute m.

17 Kpọkọta ndị-agha ọbụla unu nwere ike mgbe unu n’azọ-ije n’ebe a, ma anyị ga-aga ngwa-ngwa megide ndị nghọtahịe nile ahụ, n’ume nke Chineke anyị dịka okwukwe ahụ nke dị n’ime anyị siri dị.

18 Ma anyị ga-ewere onwunwe nke obodo-ukwu nke Zarahemla, ka anyị wee nweta nri ọzọ izigara Lihaị na Tiankọm; e, anyị ga-aga n’iru megide ha n’ume nke Onye-nwe, ma anyị ga-etinye na ngwụcha nnukwu ajọọ-omume nke a.

19 Ma ugbua, Moronaị, ana m enwe ịn̄ụrị ọn̄ụ n’ịnata akwụkwọ-ozi gị, n’ihi na e nwetụrụ m nsogbu gbasara ihe anyị kwesịrị ime, ma ọ ga-abụ ihe ziri-ezi n’ime anyị ịga megide ụmụnne anyị nwoke.

20 Mana ị sịwo, ma ọbụghị na ha chegharịrị Onye-nwe enyewo gị iwu-nsọ ka ị ga megide ha.

21 Hụ na ị agbara Lihaị na Tiankọm ume n’ime Onye-nwe; gwa ha ka ha ghara ịtụ egwu, n’ihi na Chineke ga-anapụta ha, e, na kwa ndị nile guzogidere na ntọhapụ ahụ nke Chineke jiworo mee ka ha nwere onwe ha. Ma ugbua ana m emechi akwụkwọ-ozi m nye nwanne m nwoke m hụrụ n’anya, Moronaị.