Akwụkwọ nsọ
Alma 8


Isi 8

Alma wee kwusaa ozi-ọma ma mee baptism na Melek—A jụrụ ya ajụ na Amọnaịha ma ọ hapụrụ—Otu mụọ-ozi nyere ya iwu ka ọ laghachị ma tie nchegharị nye ndị ya—Amiulek nabatara ya, ma ha abụọ wee kwusaa ozi-ọma na Amọnaịha. Ihe dịka n’afọ 82 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua o wee ruo na Alma laghachịrị site an’ala nke Gịdiọn, mgbe ọ kụzichaworo ndị nke Gịdiọn ọtụtụ ihe nke a na-enweghị ike idepụta, ebe a haziworo usoro nke nzukọ-nsọ ahụ, dịka otu o meworo na mbụ n’ala nke Zarahemla, e, ọ laghachịrị n’ụlọ nke onwe ya na Zarahemla izuru onwe ya ike site n’ọrụ nile nke ọ rụworo.

2 Ma otu a ka afọ nke iteghete nke ọchịchị nke ndị-ikpe siri bịa na ngwụcha nye ndị nke Nifaị.

3 Ma o wee ruo na mmalite nke afọ nke iri nke ọchịchị nke ndị-ikpe nye ndị nke Nifaị, na Alma siri n’ebe ahụ pụọ ma were njem ya n’ofe n’ime ala nke Melek, n’ọdịda anyanwụ nke aosimiri Saịdọn, n’ọdịda anyanwụ n’oke-ala nile nke ọzara ahụ.

4 Ma ọ malitere ịkụziri ndị nọ n’ala nke Melek dịka ausoro nsọ nke Chineke siri dị, site na nke akpọworo ya; ma ọ malitere ịkụziri ndị ahụ nʼakụkụ ala nile nke Melek ahụ.

5 Ma o wee ruo na ndị ahụ bịakwutere ya site nʼakụkụ nile nke oke-ala ahụ nke dị n’akụkụ ọzara ahụ. Ma e mere ha baptism gazuo ala ahụ nile;

6 Nke mere na mgbe ọ rụsịworo ọrụ ya na Melek o siri n’ebe ahụ pụọ, ma gaa njem mkpụrụ ụbọchị atọ n’elu-elu nke ala Melek ahụ; ma ọ bịara n’obodo-ukwu nke a na-kpọ Amọnaịha.

7 Ugbua ọbụ omenala nke ndị nke Nifaị ịkpọ ala ha nile, obodo-ukwu ha nile, na ọnụmara ha nile, e, ọbụna ọnụmara nta ha nile, n’aha onye nke buru ụzọ nwere ha; ma otu a ka ọ dị n’ala nke Amọnaịha.

8 Ma o wee ruo na mgbe Alma bịaworo n’obodo-ukwu nke Amọnaịha ọ malitere ikwusa okwu nke Chineke nye ha.

9 Ugbua Setan aejidewọrị obi nile nke ndị obodo-ukwu Amọnaịha ahụ; ya mere ha enweghị ike ịn̄a ntị n’okwu nile nke Alma.

10 Otu o sila dị Alma arụrụ nnukwu ọrụ n’ime mụọ, bna-agba mgba ya na Chineke cn’ikpesi ekpere ike, na ọ ga-awụpụta Mụọ ya n’arụ ndị ahụ nọ n’obodo-ukwu ahụ; na ọ ga kwa e kwere ka o mee ha baptism baa na nchegharị.

11 Otu o sila dị, ha mesịrị obi ha nile ike, na-asị ya: Lee, anyị matara na i bụ Alma; ma anyị matara na ị bụ onye-isi nchụ-aja nye nzukọ-nsọ ahụ nke i hiweworo n’ọtụtụ akụkụ nile nke ala ahụ, dịka omenala gị siri dị; ma anyị abụghị ndị nke nzukọ-nsọ gị, ma anyị ekweghị n’ụdị omenala nzuzu nile a.

12 Ma ugbua anyị matara na n’ihi na anyị abụghị ndị nke nzukọ-nsọ gị anyị matara na i nweghị ike n’ebe anyị nọ; ma i nyepụwo oche-ikpe ahụ nye aNifaịha; ya mere ị bụghị onye-isi-ikpe nye anyị.

13 Ugbua mgbe ndị ahụ kwuworo nke a, ma guzogide okwu ya nile, ma kwaa ya emu, ma bụkwasị ya asụ, ma mee ka a chụpụ ya site n’obodo-ukwu ha, o sitere n’ebe ahụ pụọ ma were njem ya chee iru n’obodo-ukwu ahụ nke a kpọrọ Erọn.

14 Ma o wee ruo na mgbe ọ na-aga njem n’ebe ahụ, ebe e jiworo mwute nyịda ya, na-awagharị na-agafee nnukwu amkpagbu na ihe mgbu nke mkpụrụ-obi, n’ihi ajọọ-omume nke ndị ahụ ndị nọ n’obodo-ukwu nke Amọnaịha, o wee ruo mgbe e jiri otu a nyịda Alma na mwute, lee otu bmụọ-ozi nke Onye-nwe pụtakwutere ya, na-asị:

15 Ngọzi na-adịrị gị, Alma; ya mere, welite isi gị elu ma n̄ụrịa ọn̄ụ, n’ihi na inwere nnukwu ihe ga-eme ka ị n̄ụrịa ọn̄ụ; n’ihi na i nwewo okwukwe n’idebe iwu-nsọ nile nke Chineke site n’oge nke ị natara ozi mbụ gị site n’aka ya. Lee, a bụ m ya onye anyere gị ya.

16 Ma lee, e zitara m inye gị iwu na ị ga-alaghachị n’obodo-ukwu nke Amọnaịha, ma kwusaa ozi-ọma ọzọ nye ndị obodo-ukwu ahụ; e, kwusaara ha. E, gwa ha, ma ọbụghị na ha chegharịrị Onye-nwe Chineke aga-ebibi ha.

17 N’ihi na lee, ha na-amụ ihe n’oge ugbua ka ha wee bibie ntọhapụ nke ndị gị, (n’ihi na otu a ka Onye-nwe kwuru) nke dị iche n’usoro-iwu nile, na ikpe nile, na iwu-nsọ nile nke o nyeworo ndị ya.

18 Ugbua o wee ruo na mgbe Alma nataworo ozi ya site n’aka mụọ-ozi nke Onye-nwe ahụ ọ laghachịrị ọsọ-ọsọ n’ala nke Amọnaịha. Ma ọ banyere obodo-ukwu ahụ site n’ụzọ ọzọ, e, site n’ụzọ nke dị na ndịda ndịda nke obodo-ukwu nke Amọnaịha.

19 Ma dịka ọ na-abanye obodo-ukwu ahụ agụụ gụrụ ya, ma ọ wee sị otu nwoke: Ị ga-enye nwa-oru Chineke dị umeala ihe ka o rie?

20 Ma nwoke ahụ sịrị ya: Abụ m onye Nifaị, ma a matara m na ị bụ onye-amụma Chineke dị nsọ, n’ihi na ị bụ nwoke ahụ nke amụọ-ozi sịrị nʼime ọ́hụ̀: Ị ga-anabata. Ya mere, soro m gaa n’ụlọ m ma a ga m enyetụ gị site na nri m; ma a matara m na Ị ga-abụ ngọzi nye mụ na ezi na ụlọ m.

21 Ma o wee ruo na nwoke ahụ nabatara ya n’ime ụlọ ya; ma nwoke ahụ ka a na-akpọ aAmiulek; ma o wepụtara achịcha na anụ ma dozie ha n’iru Alma.

22 Ma o wee ruo na Alma riri achịcha ma afọ juru ya; ma ọ agọziri Amiulek na ezi na ụlọ ya, ma ọ nyere Chineke ekele.

23 Ma mgbe o riworo ihe ma rijuo afọ ya ọ sịrị Amiulek: Abụ m Alma, ma abụ m aonye isi nchụ-aja nye nzukọ-nsọ nke Chineke ahụ gazuo ala ahụ nile.

24 Ma lee, akpọwo m ka m kwusaa okwu nke Chineke n’etiti ndị a nile, dịka mụọ nke mkpughe na ibu amụma siri dị; ma a nọ m n’ala a ma ha enweghị ike ịnabata m, mana ha achụpụrụ m ma ọfọdụrụ ntakịrị ka m tụgharịa azụ m nye ala nke a ruo mgbe nile.

25 Mana lee, e nyewo m iwu-nsọ na m ga-atụgharị ọzọ ma buo amụma nye ndị a, e, na ịgba ama megide ha gbasara ajọọ-omume ha nile.

26 Ma ugbua, Amiulek, n’ihi na inyejuwo m afọ ma kpọbata m, i na-adị ngọzi; n’ihi na agụụ gụrụ m, n’ihi na ebuwo m ọnụ ọtụtụ ụbọchị.

27 Ma Alma nọdụrụ ọtụtụ ụbọchị ya na Amiulek tutu ọ malite ikwusara ndị ahụ ozi-ọma.

28 Ma o wee ruo na ndị ahụ bawanyere karịa n’imebiga ajọọ-omume nile oke.

29 Ma okwu ahụ bịakwutere Alma, na-asị: Gaa; ma kwa gwa nwa-oru m Amiulek, gaa n’iru ma buo-amụma nye ndị a, na-asị—Chegharịa nụ, n’ihi na otu a ka Onye-nwe kwuru, ma ọbụghị na unu achegharịrị aga m eleta ndị a n’iwe m; e, ma agaghị m ewepụ iwe m dị egwu.

30 Ma Alma gara nʼiru, na kwa Amiulek, n’etiti ndị ahụ, ikwupụta okwu nile nke Chineke nye ha; ma ha jupụtara na Mụọ Nsọ.

31 Ma ha nwere aike enyere ha, nke mere na enweghị ike itiba ha n’ụlọ ọchịchịrị ndị mkpọrọ nile; ọbụghị ma o kwere omume na onye ọbụla ga-enwe ike igbu ha; otu o sila dị ha egosịghị bike ha wee ruo mgbe ekere ha agbụ ma tụnye ha n’ime ụlọ mkpọrọ. Ugbua, nke a ka e mere ka Onye-nwe wee gosipụta ike ya n’ime ha.

32 Ma o wee ruo na ha gawara ma malite ikwusa ozi-ọma na ibu amụma nye ndị ahụ, dịka mụọ ahụ na ike nke Onye-nwe nyeworo ha siri dị.