Akwụkwọ nsọ
Alma 56


Isi 56

Hilaman wee zigara Moronaị akwụkwọ-ozi, na-agụgharị ọnọdụ nke agha ha na ndị Leman lụrụ—Antịpụs na Hilaman wee nwee nnukwu mmeri n’ebe ndị Leman nọ—Ụmụ-okorọbịa puku abụọ nke Hilaman wee jịrị ike ọrụ-ebube lụọ-ọgụ, ma ọdịghị onye ọbụla n’ime ha e gburu. Ama-okwu 1, ihe dịka n’afọ 62 tutu amụọ Kraịst; ama-okwu 2 ruo 19, ihe dịka n’afọ 66 tutu amụọ Kraịst; na ama-okwu 20 ruo 57, ihe dịka n’afọ 65 ruo 64 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua o wee ruo na mmalite nke iri afọ atọ nke ọchịchị nke ndị-ikpe, n’ụbọchị nke abụọ n’ọnwa nke mbụ, Moronaị natara akwụkwọ-ozi site n’aka Hilaman, na-akọwa ihe nile mere ndị ahụ nọ na mpaghara ala ahụ.

2 Ma ndị a bụ okwu nile nke o dere, na-asị: Ezigbo nwanne m nwoke m hụrụ n’anya, Moronaị, ma n’ime Onye-nwe ma n’ime mkpagbu nile nke ịlụ-agha anyị; lee, nwanne m nwoke m hụrụ n’anya, enwere m ihe ole na ole m ga-agwa gị gbasara ịlụ-agha anyị n’akụkụ ala nke a.

3 Lee, apuku abụọ n’ime ụmụ-nwoke nile nke ndị nwoke ahụ ndị Amọn kpọdatara site n’ala nke Nifaị—ugbua i matawo na ndị a bụ ndị agbụrụ nke Leman, onye bụụrụ nwa-nwoke nke kachasị okenye nke nna anyị Lihaị.

4 Ugbua ọ dịghị mkpa ka m kwugharịara unu gbasara omenala nile ma-ọbụ ekweghị-ekwe ha, n’ihi na ị matara gbasara ihe nile ndị a—

5 Ya mere o zuworo m ka m gwa gị na puku ụmụ-okorọbịa abụọ ndị a ewerewo ngwa-ọgụ ha nile nke agha, ma chọọ ka m bụrụ onye-ndu ha; ma anyị abịaruwo ichekwa mba anyị.

6 Ma ugbua ị ma kwa gbasara aọgbụgba-ndụ ahụ nke ndị nna ha mere, na ha agaghị ewelite ngwa-ọgụ ha nile nke agha imegide ụmụnne ha nwoke ruo n’ịkwafu ọbara.

7 Mana n’afọ nke iri abụọ na isii, mgbe ha hụrụ ahụhụ anyị nile na mkpagbu anyị nile maka ha, ọ fọdụrụ ntakịrị ka ha amebie ọgbụgba-ndụ ahụ nke ha meworo ma welite ngwa-ọgụ ha nile nke agha n’ichekwa anyị.

8 Mana-agaghị m ekwe ha ka ha mebie ọgbụgba-ndụ nke a nke ha meworo, na-ewe ya dịka na Chineke ga-agba anyị ume, nke ga-eme na anyị agaghị ata ahụhụ ọzọ n’ihi imezu iyi ahụ nke ha n̄ụworo.

9 Mana lee, n’ebe a enwere otu ihe n’ime nke anyị nwere ike inwe nnukwu ọn̄ụ. N’ihi na lee, n’ime afọ nke iri abụọ na isii, mụ, Hilaman, zọrọ-ije n’iru nke puku ụmụ-okorọbịa abụọ ndia ruo n’obodo-ukwu nke Judia, inyere Antịpụs aka, onye ị họpụtaworo onye-ndu nke ndị ahụ nọ n’akụkụ ala ebe ahụ.

10 Ma e sonyere m puku abụọ ụmụ m nwoke, (n’ihi na ha kwesịrị ka a kpọọ ha ụmụ-nwoke) gakwuru ndị-agha nke Antịpụs, n’ime inye ume nke Antịpụs n̄ụrịrị-ọn̄ụ karịa, n’ihi na lee, ndị-agha ya ndị Leman ebelatawo ha n’ihi na ndị-agha ha egbuwo nnukwu ọnụ-ọgụgụ nke ndịkom anyị, nke mere na anyị nwere ihe mere anyị ji na-eru uju.

11 Otu o sila dị, anyị nwere ike ịkasi onwe-anyị obi n’otu ihe a, na ha anwụwo n’ichekwa mba ha na Chineke ha, e, ma ha nwere aan̄ụrị.

12 Ma ndị Leman edebewo kwa ọtụtụ ndị-mkpọrọ, ndị nke ha nile bụ ndị-isi ọchị-agha, n’ihi na ọdịghị onye ọzọ ha hapụworo ka ọ dị ndụ. Ma anyị were ya dịka ezi-okwu na ha nọ n’oge ugbua n’ala nke Nifaị; ọ dị otu a ma ọbụrụ na egbụghị ha.

13 Ma ugbua ndị a bụ obodo-ukwu nile nke ndị Leman nwetaworo onwunwe site n’ịkwafu ọbara nke ọtụtụ n’ime ndị dike anyị:

14 Ala nke Mantaị, ma-ọbụ obodo-ukwu nke Mantaị, na obodo-ukwu nke Ziezrọm, na obodo-ukwu nke Kumenaị, na obodo-ukwu nke Antịpara.

15 Ma ndị a bụ obodo-ukwu nile nke ha nwetara mgbe m biaruru obodo-ukwu nke Judia; ma achọtara m Antịpụs na ndịkom ya ka ha na-arụsị ọrụ ike jiri ume ha nile iwusi obodo-ukwu ahụ ike.

16 E, ma ike gwụrụ ha n’arụ dịka na mụọ kwa, n’ihi na ha alụwo ọgụ ka dike n’ehihie na n’abalị iji chekwaa obodo-ukwu ha nile; ma otu a ha atawo ahụhụ nnukwu nsogbu nile n’ụdị ọbụla.

17 Ma ugbua ha kpebiri imeri n’ebe a ma-ọbụ nwụọ; ya mere i inwere ike iche na ntakịrị ndị-agha nke a m kpọtara, e, ụmụ m nwoke ahụ, nyere ha nnukwu olile-anya na nnukwu ọn̄ụ.

18 Ma ugbua o wee ruo na mgbe ndị Leman hụrụ na Antịpụs anatawo ume karịrị nye ndị-agha ya, a kwagidere ha site n’iwu nile nke Amorọn ka ha ghara ịbịa megide obodo-ukwu nke Judia, ma-ọbụ megide anyị, n’ịlụ-agha.

19 Ma otu a ka anyị siri nweta iru-ọma n’aka Onye-nwe; n’ihi na ọbụrụ na ha bịakwasịrị anyị n’adịghị-ike anyị nke a eleghị anya ha gaara ebibi ntakịrị ndị-agha anyị; mana otu a ka e siri chekwaa anyị.

20 Amorọn nyere ha iwu ichekwa obodo-ukwu ndị ahụ nile nke ha wereworo. Ma otu a ka afọ nke iri abụọ na isii siri gwụchaa. Ma na mmalite nke afọ iri abụọ na asaa anyị akwadowọrịị obodo-ukwu anyị na onwe-anyị maka nchekwa.

21 Ugbua anyị chọsịrị ike ka ndị Leman bịakwasị anyị; n’ihi na anyị achọsighị ike ibuso ha agha n’ebe ha nile siri ike.

22 Ma o wee ruo na anyị debere ndị onyota-ọgba-ama n’ama gburu-gburu ebe ahụ, iche mmegharị arụ nile nke ndị Leman, ka ha ghara ịgafe anyị n’abalị ma-ọbụ n’ehihie ibuso obodo-ukwu anyị ndị ọzọ ndị nke dị n’ebe elu-elu agha.

23 N’ihi na anyị matara na n’obodo-ukwu ndị ahụ nile ha esiruchaghị ike izute ha; ya mere anyị chọsịrị-ike, ma ọbụrụ na ha ga-agafe n’akụkụ anyị, ịdakwasị ha n’azụ ha, ma otu a welite ha elu n’azụ n’otu oge ahụ ezutere ha n’iru. Anyị weere dịka ezi-okwu na anyị ga-enwe ike imeri ha; mana lee, anyị enwetaghị ihe anyị bu n’obi n’ọchịchọ anyị nke a.

24 Ha anwaghị anwa ịgafe anyị ha na ndị-agha ha nile, ọbụghị ma ha nwara anwa jiri otu ụzọ, eleghị-anya ha agaghị esirucha ike ma ha ga-ada.

25 Ọbụghị ma ha nwara-anwa ịzọ-ije gbada megide obodo-ukwu nke Zarahemla; ọbụghị ma ha nwara anwa igafe isi nke Saịdọn, gafee ruo obodo-ukwu nke Nifaịha.

26 Ma otu a, ha na ndị-agha ha nile, ha mere mkpebi ichekwa obodo-ukwu ndị ahụ nile nke ha wereworo.

27 Ma ugbua o wee ruo n’ọnwa nke abụọ nke afọ nke a, e webataara anyị ọtụtụ ihe oriri site n’aka ndị nna nile nke ụmụ m nwoke puku abụọ ahụ.

28 Na kwa e zitekwara anyị ndị nwoke puku abụọ site n’ala nke Zarahemla. Ma otu a anyị nọ na njikere anyị na ndị nwoke puku iri, na ihe oriri nile a ga-enye ha, na kwa ndị nwunye ha nile na ụmụ ha.

29 Ma ndị Leman ebe ha na-ahụ ka ndị-agha anyị na-abawanye kwa ụbọchị, ma ihe oriri nile na-abata maka nkwado anyị, ha malitere ịtụ-egwu, ma malite ịba ọgụ site n’ebe nzuzo ha, ọbụrụ na o kwere omume itinye nsọtụ na-ịnata ihe oriri anyị nile na ume.

30 Ugbua mgbe anyị hụrụ na ndị Leman malitere inwe obi-eru-ala n’akụkụ nke a, anyị chọsịrị ike iweta otu ụzọ aghụghọ n’iwere ọnọdụ n’ebe ha nọ; ya mere Antịpụs nyere iwu ka m zọrọ-ije mụ na ụmụ-ntakịrị ndị nwoke m gaa n’obodo-ukwu dị nso, dịka a ga-asị na anyị bu ihe oriri nile na-aga obodo-ukwu a dị nso.

31 Ma anyị kwesịrị ịzọ-ije gaa nso obodo-ukwu nke Antịpara, dịka a ga-asị na anyị na-aga obodo-ukwu tere anya, n’akụkụ ikpere-mmiri ahụ.

32 Ma o wee ruo na anyị zọrọ-ije na-aga, dịka a ga-asị na anyị bu ihe oriri anyị nile, ịga obodo-ukwu ahụ.

33 Ma o wee ruo na Antịpụs zọrọ-ije gaa ya na ụfọdụ ndị-agha ya, ebe ọ hapụrụ ndị fọdụrụ ichekwa obodo-ukwu ahụ. Mana ọ zọrọghị-ije gaa ruo mgbe m gawara mụ na ntakịrị ndị-agha m, ma bịaruo nso obodo-ukwu Antịpara ahụ.

34 Ma ugbua, n’obodo-ukwu nke Antịpara ahụ ka e debere ndị-agha sikarịchara ike nke ndị Leman; e, ndị kachasị n’ọnụ-ọgụgụ.

35 Ma o wee ruo na mgbe ndị onyota-ọgba-ama ha nile gwaworo ha, ha bịaruru ha na ndị-agha ha ma zọrọ-ije bịa imegide anyị.

36 Ma o wee ruo na anyị gbapụrụ n’iru ha, n’elu-elu. Ma otu a anyị dupụrụ ndị-agha kachasịrị dị ike nke ndị Leman.

37 E, ọbụna ruo ebe tere anya, nke mere na mgbe ha hụrụ ndị-agha nke Antịpụs ka ha na-achụ ha, n’ike ha, ha atụgharịghị n’aka nri ma-ọbụ n’aka ekpe, kama gaa n’iru n’ịzọ-ije ha n’ụzọ guzoro kwem n’eso anyị; ma, dịka anyị chere, ọ bụ atụmatụ ha igbu anyị tutu Antịpụs achụfee ha, ma nke a ka ndị nke anyị ghara ịgba ha gburu-gburu.

38 Ma ugbua Antịpụs ebe o hụrụ ihe-egwu dịrị anyị, mere ka ịzọ-ije nke ndị-agha ya gaa ọsọ-ọsọ. Mana lee, ọ bụ abalị; ya mere ha achụfeghị anyị, ọbụghị ma Antịpụs ọ chụfere ha; ya mere anyị bara n’ebe-ezumike n’abalị ahụ.

39 Ma o wee ruo na tutu chi-ọbụbọ nke ụtụtụ ahụ, lee, ndị Leman nọọrọ na-achụ anyị ọsọ. Ugbua anyị esiruchaghị ike ilụso ha ọgụ; e, agaghị m ekwe ka ụmụ-nwoke m ndị ntakịrị daba n’aka ha nile; ya mere anyị gara n’iru n’ịzọ-ije anyị, ma anyị weere ọzịzọ-ije anyị baa n’ime ọzara ahụ.

40 Ugbua ha anwaghị anwa ịtụgharị n’aka nri ma-ọbụ n’aka ekpe eleghị-anya a ga-agba ha gburu-gburu; ọbụghị ma m ga-atụgharị n’aka nri ma-ọbụ n’aka ekpe eleghị-anya ha ga-achụfe m, ma anyị agaghị enwe ike iguzogide ha, kama egbuo anyị, ma ha ga-agbapụ, ma otu a anyị gbapụrụ ụbọchị ahụ nile n’ime ọzara ahụ, ọbụna ruo mgbe ọchịchịrị gbara.

41 Ma o wee ruo na ọzọ, mgbe ìhè nke ụtụtụ ahụ bịara anyị hụrụ ndị Leman bịakwasịrị anyị, ma anyị gbafuru n’iru ha.

42 Mana o wee ruo na ha achụteghị anyị anya tutu ha akwụsị; ma-ọbụ n’ụtụtụ ụbọchị nke atọ n’ọnwa nke asaa.

43 Ma ugbua, ọbụrụ na Antịpụs chụfere ha anyị amaghị, mana a siri m ndịkom mụ: Lee, anyị amataghị mana ha akwụsịwo n’ihi ebum-n’obi ha na anyị ga-abịa imegide ha, ka ha nwe-ike jide anyị n’ọnya ha;

44 Ya mere gịnị ka unu kwuru, ụmụ m nwoke, unu ga-aga imegide ha n’ịlụ agha?

45 Ma ugbua asị m gị, ezigbo nwanne m nwoke Moronaị, na ọ dịbeghị mgbe ọbụla m hụrụ nnukwu amgbamume dị otu a, e-e ọbụghị n’etiti ndị Nifaị nile.

46 N’ihi na dịka m na-akpọ ha mgbe nile ụmụ m ndị nwoke (n’ihi na ha nile ka bụụrụ ụmụokorọbịa) ọbụna otu a ka ha na-asị m: Nna, lee Chineke anyị nonyeere anyị, ma ọ gaghị ekwe ka anyị daa; mgbe ahụ ka anyị gaa n’iru; anyị agaghị egbu ụmụnne anyị ndị nwoke ma ọbụrụ na ha ga-ahapụ anyị ka anyị nọọrọ onwe anyị; ya mere ka anyị gaa, adịghị ama-ama ike ha akarịa nke ndị-agha nke Antịpụs.

47 Ugbua ha alụtụbeghị agha mbụ, mana ha atụghị egwu ọnwụ; ma ha chere echiche gbasara antọhapụ nke ndị nna ha nile karịa ka ha chere gbasara ndụ ha nile; e, akụziworo ha site n’aka ndị bnne ha nile, na ọbụrụ na ha enweghị obi-abụọ, Chineke ga-anapụta ha.

48 Ma ha kwugharịrị nye m okwu nile nke ndị nne ha nile, na-asị: Anyị enweghị obi-abụọ ndị nne anyị matara ya.

49 Ma o wee ruo na alaghachịrị m mụ na puku abụọ m imegide ndị Leman a ndị chụworo anyị ọsọ. Ma ugbua lee, ndị-agha nile nke Antịpụs achụfewo ha, ma ịlụ-agha dị egwu amalitewọrịị.

50 Ndị-agha nke Antịpụs ebe ike gwụrụ ha, n’ihi ogologo ịzọ-ije ha na nwa mkpụmkpụ oge dị otu a, ọ fọdụrụ ntakịrị ka ha daba n’aka nke ndị Leman; ma ọbụrụ na m alaghachịghị mụ na puku abụọ m ha gaara enweta ebum-n’obi ha.

51 N’ihi na Antịpụs adawo site na mma agha, na ọtụtụ ndị ndu ya nile, n’ihi ike ọgwụgwụ ha, nke ihe kpatara ya bụ ịzọ-ije ọsọ-ọsọ ha—ya mere ndị nwoke nke Antipụs, ebe ọ gbara ha gharị n’ihi ọdịda nke ndị ndu ha nile, malitere inye efe n’iru ndị Leman.

52 Ma o wee ruo na ndị Leman nwetara mgbamume, ma malite ịchụ ha ọsọ; ma otu a ka ndị Leman na-achụ ha ọsọ jiri nnukwu ike mgbe Hilaman bịakwasịrị ha site n’azụ ha ya na puku abụọ ya, ma malite igbu ha karịa, nke mere na ndị-agha nile nke ndị Leman ahụ kwụsịrị ma tụgharịkwasị Hilaman.

53 Ugbua mgbe ndị nke Antịpụs hụrụ na ndị Leman alaghachịwo, ha kpọkọtara ndịkom ha ọnụ ma bịakwasịkwa ọzọ n’azụ nke ndị Leman.

54 Ma ugbua o wee ruo na anyị, ndị nke Nifaị, ndị nke Antịpụs, na mụ na puku abụọ m, gbara ndị Leman gburu-gburu, ma gbuo ha; e, nke mere na a kwagidere ha inyefe ngwa-ọgụ ha nile nke agha na kwa onwe ha dịka ndị-mkpọrọ nke agha.

55 Ma ugbua o wee ruo na mgbe ha nyefeworo anyị onwe ha, lee, a gụrụ m ụmụ-okorọbịa ahụ soro m lụọ ọgụ ọnụ, na-atu egwu na eleghị-anya enwere ọtụtụ n’ime ha e gburu.

56 Mana lee, na nnukwu ọn̄ụ m, enwebeghị aotu onye n’ime ha dara n’ala; e, ma ha alụwo-ọgụ dịka a ga-asị na ha jiri ume nke Chineke; e, ọdịghị mgbe a matara ndịkom lụworo-ọgụ jiri ụdị ume ọrụ-ebube dị otu a; ma n’ụdị ike ahụ ka ha dakwasịrị ndị Leman, na ha menyere ha egwu mberede; ma n’ihi ihe nke a ka ndị Leman jiri nyefee onwe ha dịka ndị-mkpọrọ nke agha.

57 Ma ebe ọ bụ na anyị enweghị ebe anyị ga-edebe ndị-mkpọrọ anyị, ka anyị nwe ike chekwa ha idebe ha site n’ịlaghachikwuru ndị-agha nke ndị Leman, ya mere anyị zigara ha n’ala nke Zarahemla, ma ụfọdụ ndịkom ahụ ndị Antịpụs na-egbughị, soro ha; ma ndị nke fọdụrụ a kpọọrọ m ma dokọta ha na ụmụokorọbịa andị nke Amọn m, ma zọrọ ije anyị laghachị n’obodo-ukwu nke Judia.