Akwụkwọ nsọ
Alma 60


Isi 60

Moronaị wee kpesara Pehoran maka otu ndị-ọchịchị siri n’eleghara ndị-agha nile ahụ anya—Onye-nwe na-ekwe ka e gbuo ndị-ezi-omume—Ndị Nifaị ga-ejirịrị ike ha nile na ihe nile ha nwere napụta onwe ha site n’aka ndị-iro ha nile—Moronaị wee majaa ịlụso ndị-ọchịchị ọgụ ma ọbụghị na e wetaara ndị-agha ya nile enyem-aka. Ihe dịka n’afọ 62 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma o wee ruo na o dere ọzọ degara onye-ọchịchị nke ala ahụ, onye bụ Pehoran, ma ndị a bụ okwu ndị ahụ nile o dere, na-asị: Lee, e zipu m akwụkwọ-ozi m nye Pehoran, n’obodo nke Zarahemla, onye bụ aonye-isi-ikpe na onye-ọchịchị n’obodo-ukwu ahụ, na kwa nye ndị nile ndị nke a họpụtaworo ịchị na ijikwa ihe nile gbasara agha nke a.

2 N’ihi na lee, e nwere m ihe ole na ole m ga-agwa ha n’ụdị amam-ikpe; n’ihi na lee, unu n’onwe unu matara na a họpụtawo unu ịkpọkọta ndị mmadụ ọnụ, ma nye ha mma agha nile, na mma-agha-rọrọ-arọ, na ụdị ngwa-ọgụ nile n’ụdị ọbụla dị iche iche, ma zipụga ha imegide ndị Leman, n’akụkụ ọbụla ha ga-esi bata n’ala anyị.

3 Ma ugbua lee, asị m unu na mụ n’onwe m, na kwa ndịkom mụ, na kwa Hilaman na ndịkom ya, atawo nnukwu ahụhụ karịrị akarị; e, ọbụna agụụ, akpịrị-ịkpọ-nkụ, na ike-ọgwụgwụ, na mkpagbu nile n’ụdị ọbụla dị iche iche.

4 Mana lee, ọbụrụ na nke a agwụsịwo ihe nile anyị taworo ahụhụ ya anyị agaghị atamu ma-ọbụ kpesa-mkpesa.

5 Mana lee, nnukwu ka ogbugbu ahụ diworo n’etiti ndị nke anyị; e, ọtụtụ puku adawo site na mma-agha, ebe ọ gaara abụ na nsụgharị ya ma ọbụrụ na unu nyeworọrịị ndị-agha anyị ume ga-ezuru ha ma nyere ha aka. E, nnukwu ka nleghara-anya unu dị n’ebe anyị nọ.

6 Ma ugbua lee, anyị chọrọ ịmata ihe kpatara nnukwu nleghara-anya nke a karịrị akarị; e, anyị chọrọ ịmata ihe kpatara ọnọdụ echeghị-echiche unu.

7 Unu nwere ike iche na unu ga-anọdụ n’oche-eze unu nile n’ọnọdụ echeghị-echiche nke enweghị-uche, ebe ndị iro unu nile na-agbasa ọrụ nke ọnwụ gburu-gburu unu? E, ebe ha na-egbu ọtụtụ puku ụmụnne unu nwoke.

8 E, ọbụna ndị ahụ lekwasịrị unu anya maka nchekwa, e, edebewo unu n’ọnọdụ nke unu gaara enwe ike inyere ha aka, e, unu gaara enwe ike izigara ha ndị-agha, ịgba ha ume, ma gakwaara azọpụta ọtụtụ puku n’ime ha site n’ịda site na mma-agha.

9 Mana lee, nke a abụghị ihe nile—unu ejịchiwo ihe-oriri unu n’ebe ha nọ, nke mere ma ọtụtụ alụwo-ọgụ ma gbafusịa ndụ ha nile n’ọbara n’ihi nnukwu ọchịchọ nile nke ha nwere maka ọdịmma nke ndị a; e, ma nke a ka ha meworo mgbe ọfọdụrụ ntakịrị ka ha anwụọ na agụụ, n’ihi nleghara-anya unu karịrị akarị n’ebe ha nọ.

10 Ma ugbua, ụmụnne m nwoke ndị m hụrụ n’anya—n’ihi na unu kwesịrị ịbụ ndị a hụrụ n’anya; e, ma unu kwesịrị ịkpọtewọrịị onwe-unu ịgbalịsịke karịa maka ọdịmma na inwere-onwe nke ndị a; mana lee, unu elegharawo ha anya nke mere na ọbara nke ọtụtụ puku ga-abịakwasị unu n’isi n’ịbọ-ọbọ; e, n’ihi na Chineke amatawo ibe akwa ha nile, na ịta-ahụhụ ha nile—

11 Lee, unu nwere ike iche na unu ga-anọdụ n’oche-eze unu nile, ma n’ihi ịdị-mma nke Chineke karịrị akarị unu enweghị-ike ime ihe ọbụla ma ọ ga-anapụta unu? Lee, ọbụrụ na unu chere nke a unu echewo n’efu.

12 Unu achere na, n’ihi na ọtụtụ ụmụnne unu nwoke e gbuwo ha ọ bụ n’ihi ajọọ-omume ha? Asị m unu, ọbụrụ na unu chere nke a unu echewo n’efu; n’ihi na asị m unu, e nwere ọtụtụ ndị daworo na mma-agha; ma lee ọ bụ na amam-ikpe unu;

13 N’ihi na Onye-nwe na-ekwe ka e gbuo andị ezi-omume ka ikpe ziri-ezi na ikpe-ikpe ya wee bịakwasị ndị ajọọ-omume; ya mere unu ekwesịghị iche na ndị ezi-omume efuwo n’ihi na e gburu ha; kama lee, ha na-aba n’ime izu-ike nke Onye-nwe Chineke ha.

14 Ma ugbua lee, asị m unu, egwu na-atụ m karịa na ikpe nile nke Chineke ga-abịakwasị ndị a, n’ihi ume-ngwụ ha karịrị akarị, e, ọbụna ume-ngwụ nke ndị-ọchịchị anyị, na nnukwu nleghara-anya karịrị-akarị n’ebe ụmụnne ha nwoke nọ, e, n’ebe ndị ahụ e gbuworo egbu nọ.

15 N’ihi na ma ọbụghị n’ihi aajọọ-omume nke malitere na mbụ n’isi anyị, anyị gaara enwe ike iguzogide ndị-iro anyị nile nke ga-eme ka ha ghara inwe ike imeri anyị.

16 E, ma ọbụghị maka aagha nke malitere n’etiti anyị n’onwe anyị; e, ma ọbụghị maka bndị ọchọ-eze a, ndị wetara oke nnukwu ịkwafu ọbara n’etiti anyị n’onwe anyị; e, n’oge anyị na-adọ ndọrọ-ndọrọ n’etiti anyị n’onwe anyị, ọbụrụ na anyị jikọtara ume anyị dịka anyị meworo na mbụ; e, ma ọbụghị maka ọchịchọ nke ike na ikike nke ndị ọchọ-eze nwere n’ebe anyị nọ; ọbụrụ na ha kwesịrị ntụkwasị-obi n’ụzọ nke inwere-onwe anyị, ma jikọta ọnụ anyị na ha, ma gaa n’iru imegide ndị-iro anyị, karịa iwelite mma-agha ha nile imegide anyị, nke bụ ihe kpatara oke nnukwu ịkwafu-ọbara n’etiti anyị n’onwe anyị; e, ọbụrụ na anyị gara n’iru imegide ha n’ume nke Onye-nwe, anyị gaara agbasawo ndị iro anyị nile, n’ihi na a gaara emewo ya, dịka mmezu nke okwu ya siri dị.

17 Mana lee, ugbua ndị Leman na-abịakwasị anyị, na-ewere onwunwe nke ala anyị nile, ma ha ji mma-agha na-egbu ndị nke anyị, e, ndịnyom anyị na ụmụ anyị, na kwa na-adọkpụrụ ha n’agha, na-eme ha ka ha na-ata ahụhụ ụdị mkpagbu nile dị iche iche, ma nke a n’ihi nnukwu ajọọ-omume nke ndị ahụ na-achọ ike na ikike, e, ọbụna ndị ọchọ-eze ahụ.

18 Mana gịnị mere m ji na-ekwu nnukwu gbasara ihe nke a? N’ihi na anyị amataghị karịa na unu n’onwe unu na-achọ inwe ikike. Anyị amataghị karịa na unu bụ kwa ndị nrapụta nye mba unu.

19 Ma-ọbụ na unu elegharawo anyị anya n’ihi na unu nọ n’obi mba anyị ma ndị-nche gbara unu gburu-gburu, nke mere na unu ekweghị ka e zitara anyị nri, na kwa ndịkom ịgba ndị-agha anyị ume?

20 Unu echefuwo iwu-nsọ nile nke Onye-nwe Chineke unu? E, unu echefuwo ndọkpụ n’agha nke ndị nna anyị? Unu echefuwo ọtụtụ oge ndị ahụ anapụtaworo anyị site n’aka nile nke ndị-iro anyị?

21 Ma-ọbụ unu na-eche na Onye-nwe ka ga-anapụta anyị, mgbe anyị nọdụrụ n’oche-eze anyị nile ma ghara iji ihe anyị nwere nke Onye-nwe nyeworo anyị mee ihe?

22 E, unu ga-anọdụ na nkịtị ka a gbaa unu gburu-gburu jiri ọtụtụ puku nke ndị ahụ, e, na iri-iri puku, ndị nke nọdụkwara na nkịtị, mgbe e nwere ọtụtụ puku gbara gburu-gburu n’oke-ala nile nke ala ahụ ndị na-ada site na mma-agha, e, emerụrụ arụ ma na-agba ọbara?

23 Unu chere na Chineke ga-elekwasị unu anya dịka ndị ikpe na-amaghị ebe unu nọdụrụ nwayọ ma na-ele ihe ndị a nile? Lee asị m unu, E-e. Ugbua ọ dị m ka unu cheta na Chineke ekwuwo na aime iko a ga-ebu ụzọ mee ka ọ dị ọcha, ma mgbe ahụ ka a ga-eme ka azụ iko dị kwa ọcha.

24 Ma ugbua, ma ọbụghị na unu chegharịrị n’ihe nke unu meworo, ma malite ịdị uchu, ma zipụtara anyị nri na ndịkom, na kwa zigara Hilaman, ka o wee kwado akụkụ nile ndị ahụ nke mba anyị nke o wetaghachịworo, ma ka anyị nwetaghachị kwa ihe onwunwe anyị nile nke fọdụrụ n’akụkụ ebe a nile, lee ọ ga-adị mkpa na anyị kwụsịrị ndọrọ ndọrọ anyị na ndị Leman ruo mgbe anyị buworo ụzọ mee ka ime iko anyị dị ọcha, e, ọbụna nnukwu onye-isi nke ọchịchị ala anyị.

25 Ma ma-ọbụghị na unu kwere akwụkwọ-ozi m, ma pụta ma gosị m ezigbo amụọ nke inwere-onwe, ma gbalịa ịgba-ume na ịwụsị ndị-agha anyị nile ike, ma nye ha nri maka nkwado ha, lee a ga m ahapụ otu akụkụ nke inwere-onwe m iji chekwa akụkụ ala anyị ebe a, ma aga m ahapụ ume ahụ na ngọzi nile nke Chineke ka ọ dakwasị ha, nke ga-eme na ọdịghị ike ọzọ ọbụla nwere ike ịrụ-ọrụ megide ha—

26 Ma nke a n’ihi okwukwe ha karịrị-akarị, na ndidi ha n’mkpagbu ha nile—

27 Ma aga m abịakwute unu, ma ọbụrụ na o nwere onye ọbụla n’etiti unu nke nwere ọchịchọ maka inwere-onwe, e, ọbụrụ na o nwere ọbụna otu icheku ọkụ nke inwere-onwe fọdụrụ, lee aga m akpasu ọgba-aghara n’etiti unu, ọbụna ruo mgbe ndị ahụ chọworo ịpụrụ ike na ikike ga-abụ ndị ekpochapụrụ.

28 E, lee, anaghị m atụ-egwu ike unu ma-ọbụ ikike unu, kama ọ bụ aChineke m bụ onye m na-atụ egwu; ma ọ bụ dịka iwu-nsọ ya nile siri dị ka m na-ewere mma-agha m ichekwa ụzọ nke mba m, ma ọ bụ n’ihi ajọọ-omume unu ka anyị jiworo taa ahụhụ oke nnukwu ntufu.

29 Lee oge eruọla, e, oge ahụ abịaruwo ugbua, na ma ọbụghị na unu kwalitere onwe unu na nchekwa nke mba unu na ụmụ-ntakịrị unu nile, amma-agha nke ikpe-ziri-ezi koro n’ofe isi unu: e, ma ọ ga-adakwasị unu ma leta unu ọbụna ruo n’ibibi unu kpam-kpam.

30 Lee, ana m ele anya enyem-aka site n’ebe unu nọ; ma, ma ọbụghị na unu lebara-anya na mbelata mgbu anyị, lee, abịakwute m unu, ọbụna n’ala nke Zarahemla, ma jiri mma-agha tida unu, nke mere na unu enwekwaghị ike ịkwusị ọgan’iru nke ndị a dịka n’ụzọ nke inwere-onwe anyị.

31 N’ihi na lee, Onye-nwe agaghị ekwe na unu ga-ebi na-agbasi-ike n’ajọọ-omume nile ibibi ndị ezi-omume ya.

32 Lee, unu nwere-ike iche na Onye-nwe ga-edebe unu ma pụta n’ikpe-ikpe megide ndị Leman, mgbe ọ bụ omenala nke ndị nna ha bụ ihe kpatara ịkpọ-asị ha, e, ma ndị ahụ nupuworo isi site n’ebe anyị nọ emewo ya ugbọrọ abụọ ọzọ, ebe ajọọ-omume unu bụ maka ịhụ n’anya nke otuto unu na ihe efu nile nke ụwa?

33 Unu matara na unu na-ejehie iwu-nsọ nile nke Chineke, ma unu matara na unu na-azọgide ha n’okpuru ụkwụ unu. Lee, Onye-nwe sịrị m: Ọbụrụ na ndị ahụ unu họpụtaworo ịbụ ndị ọchịchị unu echegharịghị site na mmehie ha nile na ajọọ-omume ha nile, unu ga-agalite ịlụ-agha megide ha.

34 Ma ugbua lee, mụ, Moronaị, a kwagidere m, dịka ọgbụgba-ndụ ahụ siri dị nke m gbaworo idebe iwu-nsọ nile nke Chineke m; ya mere ọ ga-adị m mma ka unu na-edebe okwu nke Chineke ahụ, ma zitara m ọsọ-ọsọ ụfọdụ ihe-oriri unu nile na ndịkom unu, na kwa nye Hilaman.

35 Ma lee, ọbụrụ na unu agaghị eme nke a abịakwute m unu ọsọ-ọsọ; n’ihi na lee, Chineke agaghị ekwe ka anyị laa n’iyi n’agụụ; ya mere ọ ga-enye anyị ụfọdụ nri unu, ọbụna ma ọbụrụ na ọ ga-abụrịrị site na mma-agha. Ugbua hụ na unu mezuru okwu nke Chineke.

36 Lee, abụ m Moronaị, onye-isi ọchị-agha unu. A anaghị m achọ ike, kama ịdọda ya. A naghị m achọ nkwanye ugwu nke ndị ụwa, kama otuto nke Chineke m, na inwere-onwe na ọdịmma nke mba m. Ma otu a emechie m akwụkwọ-ozi m.