Akwụkwọ nsọ
Alma 14


Isi 14

Alma na Amiulek ka e tinyere n’ụlọ mkpọrọ ma tie ha otiti ihe—A kpọrọ ndị kwere ekwe na akwụkwọ-nsọ ha ọkụ—Ndị a nile e gburu n’ihi okwukwe ha nwere n’ebe Jisus nọ ka Onye-nwe nabatara n’otuto—Mgbidi nile nke ụlọ-mkpọrọ ka e tiwara ma ha daa—Alma na Amiulek ka a napụtara, ma ndị na-esogbu ha ka e gburu. Ihe dịka n’afọ 82 ruo 81 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma o wee ruo mgbe ọ bịara na ngwucha nke ịgwa ndị ahụ okwu, ọtụtụ n’ime ha kwere n’okwu ya nile, ma malite ichegharị, na nyochaa aakwụkwọ-nsọ nile ahụ.

2 Mana ndị ka n’ime ha chọsịrị ike ka ha wee bibie Alma na Amiulek; n’ihi na ha na-eweso Alma iwe, n’ihi aịdị mfe nghọta nke okwu ya nile nye Ziezrọm; ma ha sịkwara na Amiulek bagwawo ha okwu ụgha, ma kwuo okwu ọjọọ megide iwu ha na kwa megide ndị ọka-iwu ha na ndị-ikpe nile.

3 Ma ha wesokwara Alma na Amiulek iwe; ma n’ihi na ha agbawo ama dị ezigbo mfe nghọta megide ajọọ-omume ha, ha chọrọ iwepụ ha na nzuzo.

4 Mana o wee ruo na ha emeghị ya; kama ha kpọọrọ ha ma jiri agbụ siri-ike kee ha, ma kpọga ha n’iru onye-isi-ikpe nke ala ahụ.

5 Ma ndị ahụ garuru ma gbaa aka-ebe megide ha—na-agba ama na ha kwuru okwu ọjọọ megide iwu ahụ, na ndị ọka-iwu ha nile na ndị-ikpe nile nke ala ahụ, na kwa megide ndị nile ahụ nọ n’ala ahụ; na kwa gbaa ama na e nwere nanị otu Chineke, ma na ọ ga-ezite Ọkpara ya n’etiti ndị ahụ, mana ọ gaghị azọpụta ha; ma ọtụtụ ụdị ihe dị otu a ka ndị ahụ gbara ama megide Alma na Amiulek. Ugbua nke a ka e mere n’iru onye-isi-ikpe nke ala ahụ.

6 Ma o wee ruo na Ziezrọm nwere ịtụ n’anya n’okwu nile ndị e kwuworo; ma ọ matakwara gbasara ikpu-isi nke obi ha nile, nke ọ kpataworo n’etiti ndị ahụ site n’okwu ụgha ya nile; ma mkpụrụ-obi ya malitere inwe antaram-ahụhụ site na mmata nke bikpe-ọmụma nke onwe ya; e, ọ malitere inwe ịgba gburu-gburu site na mgbu nile nke ala-mụọ.

7 Ma o wee ruo na ọ malitere itiku ndị ahụ, na-asị: Lee, aikpe mara m, ma ndịkom a enweghị ntụpọ n’iru Chineke. Ma ọ malitere ịrịọrọ ha arịrịọ site n’oge ahụ gaa n’iru; mana ha kparịrị ya, na-asị: Ajọọ-mụọ o nwetawo kwa gị? Ma ha bụrụ ya ọnụ-mmiri, ma bchụpụ ya site n’etiti ha, na kwa ndị nile nke kwere n’okwu nile nke Alma na Amiulek kwuworo; ma ha chụpụrụ ha, ma ziga ndịkom ka ha tụọ ha okwute.

8 Ma ha kpọkọtara ndị nwunye ha na ụmụ ha ọnụ, ma onye ọbụla kwere ma-ọbụ akụziworo ikwere n’okwu nke Chineke ha mere ka atụba ha n’ime ọkụ, ma ha kwa wepụtara akụkọ-ndekọta ha nile nke ihe dị n’ime ya bụ akwụkwọ-nsọ nile ahụ, ma tụba ha n’ime ọkụ ahụ kwa, ka e wee kpọọ ha ọkụ ma bibie ha site n’ọkụ.

9 Ma o wee ruo na ha kpọọrọ Alma na Amiulek, ma buga ha n’ebe a na-egbu ndị kwere na Jisus Kraịst, ka ha wee lere mbibi nke ndị a na-erepịa site n’ọkụ.

10 Ma mgbe Amiulek hụrụ mgbu nile nke ndịnyom na ụmụ-ntakịrị ndị na-erepịa n’ime ọkụ ahụ, o gbukwara ya mgbu; ma ọ sịrị Alma: Olee otu anyị ga-esi lere ihe nkiri nke a dị egwụ? Ya mere ka anyị setịpụ aka anyị nile, ma jiri aike nke Chineke nke dị n’ime anyị rụọ ọrụ, ma zọpụta ha site n’ire ọkụ nile ahụ.

11 Mana Alma sịrị ya: Mụọ ahụ kwagidere m na m agaghị esetịpụrịrị aka m; n’ihi na lee Onye-nwe na-anabata ha n’elu nye onwe ya, an’otuto; ma o kwere ka ha mee ihe nke a, ma-ọbụ na ndị ahụ ga-eme ha ihe nke a, dịka isi-ike nke obi ha nile siri dị, ka bikpe ikpe nile nke ọ ga-ezitara ha n’oke iwe ya wee zi ezi; ma cọbara nke ndị dna-enweghị ụta ga-eguzoro dịka aka-ebe megide ha, e, ma tisie mkpu ike megide ha n’ụbọchị ikpe-azụ.

12 Ugbua Amiulek sịrị Alma: Lee, eleghị-anya ha ga-akpọ kwa anyị ọkụ.

13 Ma Alma sịrị: Ka ọ dịrị dịka ọchịchọ nke Onye-nwe siri dị. Mana, lee, ọrụ anyị agwubeghị; ya mere ha agaghị akpọ anyị ọkụ.

14 Ugbua o wee ruo na mgbe anụ-arụ nile nke ndị ahụ atụbaworo n’ime ọkụ repịara, na kwa akụkọ-ndekọta nile ahụ nke atụbara ya na ha, onye-isi-ikpe nke ala ahụ bịara guzoro n’iru Alma na Amiulek, dịka e kere ha agbụ; ma ọ jiri aka ya maa ha ụra na nti ha nile, ma sị ha: Mgbe unu hụsịworo ihe ndị a, unu ga-ekwusa ozi-ọma ọzọ nye ndị a, na a ga-atụba ha n’ime aọdọ ọkụ na nkume ọkụ?

15 Lee, unu ahụwo na unu enweghị ike ịzọpụta ndị ahụ a tụbaworo n’ime ọkụ ahụ; ọbụghị ma Chineke ọ zọpụtawo ha n’ihi na ha bụụrụ ndị okwukwe gị. Ma onye-ikpe ahụ kụrụ ha ọzọ na nti ha nile, ma jụọ: Gịnị ka unu na-ekwu maka onwe unu?

16 Ugbua onye-ikpe a nọ dịka usoro na okwukwe nke aNiho, onye gburu Gịdiọn.

17 Ma o wee ruo na Alma na Amiulek azaghị ya ihe ọbụla; ma ọ kụrụ ha ọzọ, ma nyefee ha ndị-ọrụ ahụ nile ka a tụba ha n’ime ụlọ-mkpọrọ.

18 Ma mgbe atụbaworo ha n’ụlọ-mkpọrọ ụbọchị atọ, ọtụtụ andị ọka-iwu wee bịa, ma ndị-ikpe, ma ndị nchụ-aja, ma ndị nkuzi, ndị bụ nke okwukwe nke Niho; ma ha batara n’ime ụlọ-mkpọrọ ịhụ ha, ma ha jụrụ ha ajụjụ maka ọtụtụ okwu nile; mana ha azaghị ha ihe ọbụla.

19 Ma o wee ruo na onye-ikpe ahụ guzoro n’iru ha, ma sị: Gịnị mere unu anaghị aza okwu nile nke ndị a? Unu amataghị na m nwere ike inyefelite unu n’ime ire-ọkụ nile ahụ? Ma ọ nyere ha iwu ka ha kwuo okwu; mana ha azaghị ihe ọbụla.

20 Ma o wee ruo na ha pụrụ ma gara ụzọ ha nile, mana bịakwa ọzọ n’echi ya; ma onye-ikpe ahụ kụkwara ha ọzọ na nti ha nile. Ma ọtụtụ bịarutekwara, ma kuo ha, na-asị: Unu ga-eguzo ọzọ ma kpee ndị a ikpe, ma kwutọọ iwu anyị? Ọbụrụ na unu nwere ụdị nnukwu ike ahụ gịnị mere unu anaghị aanapụta onwe unu?

21 Ma ọtụtụ ụdị ihe dị otu a ka ha sịrị ha, na-atakwasị ha ikikere eze, ma na-abụsa ha ọnụ-mmiri, ma na-asị: Olee otu anyị ga-adị mgbe amara anyị ikpe?

22 Ma ọtụtụ ụdị ihe ndị ahụ, e, ụdị ihe dị otu a nile dị iche iche ka ha gwara ha; Ma otu a ha kwara ha emu ruo ọtụtụ ụbọchị. Ma ha jịchiri ihe-oriri site n’ebe ha nọ ka agụụ wee gụọ ha, na mmiri ka akpịrị wee kpọọ ha nkụ; ma ha napụkwara ha uwe ha nile nke mere na ha gba-ọtọ; ma otu a ekere ha jiri ụdọ nile siri ike, ma debe ha n’otu ebe n’ime ụlọ-mkpọrọ.

23 Ma o wee ruo mgbe ha taworo ahụhụ otu a ruo ọtụtụ ụbọchị, (ma-ọbụ n’ụbọchị nke iri na abụọ, n’ọnwa nke iri, n’ime afọ nke iri nke ọchịchị nke ndị-ikpe nile nye ndị nke ndị Nifaị) na onye-isi-ikpe nye ala nke Amọnaịha ma ọtụtụ n’ime ndị nkuzi ha nile na ndị ọka-iwu nile bara n’ime n’ebe ụlọ-mkpọrọ ahụ ebe Alma na Amiulek e jiri ụdọ nile kee nọ.

24 Ma onye-isi-ikpe ahụ guzoro n’iru ha, ma kụọ ha ọzọ, ma sị ha: Ọbụrụ na unu nwere ike nke Chineke napụta onwe unu site n’agbụ ndị a, ma mgbe ahụ anyị ga- ekwere na Onye-nwe ga-ebibi ndị a dịka okwu unu nile siri dị.

25 Ma o wee ruo na ha nile gara n’iru ma kụọ ha, na-ekwu otu okwu nile ahụ, ọbụna wee ruo n’onye ikpe-azụ; ma mgbe onye ikpe-azụ gwaworo ha okwu aike nke Chineke dakwasịrị Alma na Amiulek, ma ha biliri guzoro n’ụkwụ ha.

26 Ma Alma tiri mkpu, na-asị: Ruo ole mgbe ka anyị ga-atagide ahụhụ nnukwu amkpagbu nile ndị a, O Onye-nwe? O Onye-nwe, nye anyị ume dịka okwukwe anyị nke dị n’ime Kraịst, ọbụna ruo na nnapụta. Ma ha dọbiri ụdọ nile ahụ nke e jiri kee ha; ma mgbe ndị ahụ hụrụ nke a, ha malitere ịgbafu, n’ihi egwu maka mbibi abịakwasịwo ha.

27 Ma o wee ruo na oke nnukwu ka egwu ha dị nke mere na ha dara n’ala, ma ha erughị ọnụ-ụzọ mpụta nke aụlọ-mkpọrọ ahụ; ma ala masịrị jijiji ike, ma mgbidi nile nke ụlọ-mkpọrọ ahụ ka a gbawara abụọ, nke mere na ha dara n’ala; ma onye-isi-ikpe ahụ, na ndị ọka-iwu nile, na ndị nchụ-aja nile, na ndị nkuzi nile, ndị kụworo Alma na Amiulek ihe, ka e gburu site n’ọdịda nke ahụ.

28 Ma Alma na Amiulek pụtara site n’ụlọ-mkpọrọ ahụ, ma ha emerụghị arụ; n’ihi na Onye-nwe enyewo ha ike, dịka okwukwe ha nke dị n’ime Kraịst siri dị. Ma ngwa-ngwa ha pụtara site n’ụlọ-mkpọrọ ahụ; ma aatọpụrụ ha agbụ ha nile; ma ụlọ-mkpọrọ ahụ adawo rịị n’ala, ma mkpụrụ-obi ọbụla dị n’ime mgbidi ahụ, ma ọbụghị Alma na Amiulek, ka e gburu; ma ngwa-ngwa ha bịarutere ime obodo-ukwu ahụ.

29 Ugbua ndị ahụ ebe ha nụworo nnukwu mkpọtụ bịara gbakọta ọn̄ụ n’igwe ịmata ihe kpatara ya; ma mgbe ha hụrụ Alma na Amiulek na-apụta site n’ụlọ-mkpọrọ, ma mgbidi nile dị ya adawo n’ala, oke egwu tụrụ ha, ma ha gbafuru site n’iru nke Alma na Amiulek ọbụna dịka otu ewu si na-achịrị ụmụ ya agbanarị ọdụm abụọ; ma otu a ka ha siri gbafuo site n’iru Alma na Amiulek.