Akwụkwọ nsọ
Alma 4


Isi 4

Alma wee mee ọtụtụ puku ndị a gbanwere baptism—Ajọọ-omume wee bata n’ime nzukọ-nsọ ahụ, ma ọga n’iru nzukọ ahụ wee nwee mgbochi—Nifaịha ka ahọpụtara onye-isi-ikpe—Alma, dịka onye isi nchụ-aja, tinyere onwe ya n’ịgbasa ije-ozi ahụ. Ihe dịka n’afọ 86 ruo 83 tutu amụọ Kraịst.

1 Ugbua o wee ruo n’ime afọ nke isii nke ọchịchị nke ndị-ikpe na-achị ndị nke Nifaị, e nweghị ndọrọ-ndọrọ ma-ọbụ agha an’ala nke Zarahemla.

2 Mana ndị ahụ nwere mkpagbu, e, akpagburu ha nnukwu n’ihi aofufu nke ụmụnne ha nwoke, na kwa n’ihi ofufu nke igwe-anụ ha na igwe-anụmanụ ha, na kwa n’ihi ofufu nke ubi mkpụrụ-akụkụ ha nile, ndị nke a zọpịara n’okpuru ụkwụ ma nke ndị Leman bibiri.

3 Ma oke nnukwu ka mkpagbu ha nile dị nke mere na mkpụrụ-obi nile nwere ihe kpatara ha iru uju; ma ha kwere na ọ bụ ikpe nile nke Chineke e zidatakwasịrị ha n’ihi ajọọ-omume ha na ihe arụ ha nile; ya mere a kpọtere ha na ncheta nke ọrụ dịịrị ha.

4 Ma ha malitere ihiwe nzukọ-nsọ ahụ n’uju karịa; e, ma ọtụtụ ka e mere baptism n’ime mmiri nile nke Saịdọn ma e jikọtara ha na nzukọ-nsọ nke Chineke; e, e amere ha baptism site n’aka nke Alma, onye e doworo nsọ ịbụ bonye isi nchụ-aja nye ndị nzukọ-nsọ ahụ, site n’aka nke nna ya Alma.

5 Ma o wee ruo n’ime afọ nke asaa nke ọchịchị nke ndị-ikpe nile e nwere ihe dịka mkpụrụ-obi puku atọ na narị ise nke jikọtara onwe ha nye anzukọ-nsọ nke Chineke ma e mere ha baptism. Ma otu a ka afọ nke asaa nke ọchịchị nke ndị-ikpe siri kwụsị nye ndị nke Nifaị; ma e nwere udo esepụghị-aka n’oge ahụ nile.

6 Ma o wee ruo n’afọ nke asatọ nke ọchịchị nke ndị-ikpe, na ndị nke nzukọ-nsọ ahụ malitere siwanye ike na mpako, n’ihi akụ na aụba ha karịrị akarị, na bọmarịcha akwa silk ha nile, na ọmarịcha akwa linen ha agbakọrọ agbakọ, na n’ihi ọtụtụ igwe-atụrụ ha na igwe-ehi nile, na ọla-edo ha na ọla-ọcha ha, na ụdị ihe oke onụ ahịa nile dị iche iche, ndị ha nwetaworo site n’ịrụsi ọrụ ike; ma n’ihe nile ndị a ka ha buliworo onwe ha elu na mpako nke anya ha, n’ihi na ha malitere iyi uwe ndị dị ezigbo oke-ọnụ ahịa.

7 Ugbua nke a bụ ihe kpatara nnukwu nsogbu nye Alma, e, ma nye ọtụtụ ndị ahụ nke Alma adoworo nsọ ịbụ ndị nkuzi, na ndị nchụ-aja, na ndị okenye na nzukọ-nsọ ahụ; e, ọtụtụ n’ime ha nwere nnukwu mwute maka ajọọ-omume nke ha hụrụ maliteworo ịdị n’etiti ndị ha.

8 N’ihi na ha hụrụ ma lee n’oke mwute na ndị nke nzukọ-nsọ ahụ malitere inwe mbuli-elu na ampako nke anya ha, na itinye obi ha nile n’elu akụ na ụba na n’ihe efu nile nke ụwa, nke mere na ha malitere inwe nlelị, otu n’ebe ibe ya nọ, ma ha malitere isogbu ndị bna-ekweghị dịka ọchịchọ na mmasị nke onwe ha siri dị.

9 Ma otu a, n’ime afọ nke asatọ nke ọchịchị nke ndị-ikpe, a malitere inwe nnukwu andọrọ ndọrọ n’etiti ndị nzukọ-nsọ ahụ; e, enwere bntaji anya, na esem-okwu, na echiche ọjọọ, na nsogbu nile, na mpako, ọbụna nke karịrị mpako nke ndị na-abụghị nke nzụko-nsọ nke Chineke.

10 Ma otu a ka afọ nke asatọ nke ọchịchị nke ndị-ikpe siri gwuchaa; ma ajọọ-omume nke nzukọ-nsọ ahụ bụ nnukwu okwute mkpọbe ụkwụ nye ndị na-abụghị nke nzukọ-nsọ ahụ, ma otu a nzukọ-nsọ ahụ malitere ịda n’ọga n’iru ya.

11 Ma o wee ruo na mmalite nke afọ nke iteghete, Alma hụrụ ajọọ-omume nke nzukọ-nsọ ahụ, ma o hụkwara na aihe nlere-anya nke nzukọ-nsọ ahụ malitere idu ndị ahụ na-ekweghị-ekwe na-iba site n’otu mpekele mmehie baa n’ọzọ, si otu a na-eweta mbibi nke ndị ahụ.

12 E, ọ hụrụ nnukwu ahaghị n’otu n’etiti ndị ahụ, ụfọdụ na-ebuli onwe ha elu na mpako ha, na-eleda ndị ọzọ anya, na-atụgharị azụ ha n’ebe andị nọ na mkpa nọ na ndị gbaa ọtọ na bndị agụụ na-agụ, na ndị akpịrị kpọrọ nkụ, na ndị nọ n’ọrịa na mkpagbu.

13 Ugbua nke a bụ nnukwu ihe kpatara ịkwa akwa arịrị n’etiti ndị ahụ, mgbe ndị ọzọ nọ n’ewedata onwe ha ala, na-enyere ndị chọrọ enye m-aka, aka, dịka ainye ihe ha nwere nye ndị ogbenye na ndị chọrọ enye m-aka, na-enye ndị agụụ na-agụ nri, na-ata ahụhụ bmkpagbu nile di iche iche, cn’ihi Kraịst, onye ga-abịa dịka mụọ nke ibu-amụma kwuru;

14 Na-elepụ anya maka ụbọchị ahụ, ana-enwegide nsachapụ nke mmehie ha nile; ebe ha jupụtara na nnukwu bọn̄ụ n’ihi mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ-anwụ, dịka ọchịchọ na ike na nnapụta nke Jisus Kraịst site n’agbụ nile nke ọnwụ.

15 Ma ugbua o wee ruo na Alma, ebe ọ hụworo mkpagbu nile nke ndị dị umeala na-eso Chineke, na nsogbu nile nke e kpọkwasịrị n’isi ha, site n’aka ndị nke ya fọdụrụ ma ebe ọ hụrụ aahaghị n’otu ha nile, malitere inwe oke mwute; otu o sila dị, Mụọ nke Onye-nwe ahapụghị ya.

16 Ma ọ họpụtara otu onye-amamihe onye bụ otu nʼime ndị okenye nile nke nzukọ-nsọ ahụ, ma nye ya ike dịka aolu nke ndị ahụ siri dị, ka o wee nwe ike ime biwu nile dịka iwu ndị nke e nyeworọrịị siri dị, ma n’itinye ha n’ọrụ dịka ajọọ-omume na mmebi iwu nile nke ndị ahụ siri dị.

17 Ugbua aha nwoke a bụ Nifaịha, ma ya ka a họpụtara aonye-isi-ikpe, ma ọ nọdụrụ n’oche ikpe ahụ ikpe na ịchị ndị ahụ.

18 Ugbua Alma enyeghị ya ọkwa ọrụ nke ịbụ onye isi nchụ-aja na nzukọ-nsọ ahụ, mana ọ dotara ọkwa ọrụ nke onye isi nchụ-aja nye onwe ya; ma na o nyefere oche-ikpe n’aka Nifaịha.

19 Ma nke a ka o mere ka aya n’onwe ya wee gagharịa n’etiti ndị ya, ma-ọbụ n’etiti ndị nke Nifaị, ka o wee kwusaa bokwu nke Chineke nye ha, cịkpalite ha dn’icheta ọrụ ha, ma ka o nwe ike ịdọda, site n’okwu nke Chineke, mpako nile na aghụghọ na ndọrọ-ndọrọ nile nke dị n’etiti ndị ya, ebe ọ na-ahụghị ụzọ nke ọ ga-esi nwetaghachị ha ma ọbụghị n’ikwudaru ala site en’igba-ama na-enweghị ntụpọ megide ha.

20 Ma otu a na mmalite nke afọ nke iteghete nke ọchịchị nke ndị-ikpe nye ndị nke Nifaị, Alma nyepụrụ aNifaịha oche-ikpe ahụ, ma debe onwe ya nile nye bọkwa nchụ-aja dị elu nke usoro nsọ nke Chineke, nye ịgba-ama nke okwu ahụ, dịka mụọ nke mkpughe na ibu-amụma siri dị.