Akwụkwọ nsọ
Alma 16


Isi 16

Ndị Leman wee bibie ndị nke Amọnaịha—Zorọm wee duru ndị Nifaị ruo na mmeri nke ndị Leman—Alma na Amiulek na ọtụtụ ndị ọzọ kwusara okwu ahụ—Ha wee kụzie na mgbe o sịworo n’ọnwụ bilie Kraịst ga-egosị ndị Nifaị onwe ya. Ihe dịka n’afọ 81 ruo 77 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma o wee ruo n’afọ nke iri na otu nke ọchịchị nke ndị-ikpe nye ndị-nke Nifaị, n’ụbọchị nke ise nke ọnwa nke abụọ, ebe enweworo nnukwu udo n’ala nke Zarahemla, ebe ana-enwebeghị agha ọbụla ma-ọbụ ndọrọ-ndọrọ ruo ụfọdụ ọnụ-ọgụgụ afọ, ọbụna wee ruo n’ụbọchị nke ise nke ọnwa nke abụọ n’ime afọ nke iri n’otu, e nwere itimkpu nke agha a nụrụ n’akụkụ ala ahụ nile.

2 N’ihi na lee, ndị-agha nile nke ndị Leman abatawọrịị n’akụkụ ọzara ahụ, n’ime oke-ala nile nke ala ahụ, ọbụna n’ime obodo-ukwu nke aAmọnaịha ahụ, ma malite igbu ndị ahụ na ibibi obodo-ukwu ahụ.

3 Ma ugbua o wee ruo, tutu ndị Nifaị enwe ike ịkpọkọta ndị-agha zuru ịchụpụ ha site n’ala ahụ, ha aebibiwọrịị ndị ahụ nọ n’obodo-ukwu nke Amọnaịha ahụ, na kwa ụfọdụ nọ gburu-gburu oke-ala nile nke Noa, ma dọkpụrụ ndị ọzọ n’agha baa n’ime ọzara ahụ.

4 Ugbua o wee ruo na ndị Nifaị chọsịrị ike inweta ndị ahụ adọkpụrụworo n’agha baa n’ime ọzara ahụ.

5 Ya mere, onye nke ahọpụtaworo ibu onye-isi ọchị-agha nye ndị-agha nile nke ndị Nifaị, (ma aha ya bụ Zorọm, ma ọ nwere ụmụ nwoke abụọ, Lihaị na Aha)—ugbua Zorọm na ụmụ nwoke ya abụọ, ebe ha matara na Alma bụ onye isi nchụ-aja nye nzukọ-nsọ ahụ, ma ebe ha nụworo na ọ nwere mụọ nke ibu amụma, ya mere ha gakwuuru ya ma chọọ site n’aka ya ịmata ma Onye-nwe ọ chọrọ ka ha gaa n’ime ọzara ahụ ịchọ ụmụnne ha nwoke, ndị nke ndị Leman dọkpụrụworo n’agha.

6 Ma o wee ruo na Alma ajụtara Onye-nwe gbasara ihe ahụ. Ma Alma laghachịrị ma sị ha: Lee, ndị Leman ga-agafe osimiri Saịdọn na ndịda-ndịda ọzara ahụ, ebe dị anya n’ofe oke-ala nile nke ala nke Mantaị ahụ. Ma lee, n’ebe ahụ ka unu ga-ezute ha, n’akụkụ ọwụwa-anyanwụ nke osimiri Saịdọn, ma n’ebe ahụ Onye-nwe ga-enyefe unu ụmụnne unu nwoke ndị ndị Leman dọkpụrụworo n’agha.

7 Ma o wee ruo na Zorọm na ụmụ nwoke ya gafere osimiri Saịdọn ahụ, kpọrọ ndị-agha ha nile, ma zọrọ ije pụọ ofe oke-ala nile nke Mantaị baa n’ime ndịda-ndịda ọzara ahụ, nke dị n’akụkụ ọwụwa-anyanwụ nke osimiri Saịdọn ahụ.

8 Ma ha bịakwasịrị ndị-agha nile nke ndị Leman, ma ndị Leman ka agbasasịrị ma chụba n’ime ọzara ahụ; ma ha kpọọrọ ụmụnne ha nwoke ndị nke ndị Leman dọkpụrụworo n’agha, ma o nweghị otu mkpụrụ-obi n’ime ha fuworo na ndị adọkpụụrụ n’agha. Ma ụmụnne ha nwoke kpọtara ha inwere ala nke aka ha nile.

9 Ma otu a afọ nke iri na otu nke ndị-ikpe gwụchara, ndị Leman ebe achụpụworo ha site n’ala ahụ, ma ndị nke Amọnaịha ka e abibiri; e, mkpụrụ-obi ọbụla nke ndị Amọnaịha bebibiri ya, na kwa nnukwu obodo-ukwu ha, nke ha sịrị na Chineke enweghị ike ibibi, n’ihi ịdị ukwuu ya.

10 Mana lee, an’otu ụbọchị a hapụrụ ya ka ọtọgbọrọ n’efu; ma ozu nile ndị ahụ ka nkịta nile na anụ-ọhịa nke ọzara ahụ dọriri.

11 Otu o sila dị, mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị arụ ha nwụrụ-anwụ ka akwakọtara n’elu iru nke ụwa, ma e kpuchịrị ha jiri ihe mkpuchi n’emighị emi. Ma ugbua oke nnukwu ka isi sitere na ya dị nke mere na ndị ahụ abanyeghị inweta ala nke Amọnaịha ahụ ruo ọtụtụ afọ. Ma a kpọrọ ya Ọtọgbọrọ n’efu nke ndị Niho; n’ihi na ha bụ ndị okwukwe nke aNiho, ndị e gburu egbu; ma ala ha nile tọgbọrọgidere n’efu.

12 Ma ndị Leman abịaghịkwa ọzọ n’ịlụ agha megide ndị Nifaị wee ruo n’afọ nke iri na anọ nke ọchịchị nke ndị-ikpe nye ndị nke Nifaị. Ma otu a ruo afọ atọ ka ndị nke Nifaị nwere udo esepụghị aka n’ala ahụ nile.

13 Ma Alma na Amiulek gagharịrị na-ekwusa nchegharị nye ndị ahụ n’ime atemple ha nile, na n’ime ebe mgbaba ha nile dị nsọ, na kwa n’ime bụlọ-nzukọ ha nile, nke a rụrụ n’ụdị usoro nke ndị Juu.

14 Ma ka ha ra bụ ndị ga-anụ okwu ha nile, ha ka ha kwusaara okwu nke Chineke, an’enweghị ile mmadụ anya n’ịrụ esepụghị-aka.

15 Ma otu a ka Alma na Amiulek siri gagharịa, na kwa ọtụtụ ndị ọzọ ndị ahọpụtaworo maka ọrụ ahụ, ikwusa okwu ahụ n’akụkụ ala ahụ nile. Ma nhiwe nke nzukọ-nsọ ahụ zuru-oke n’akụkụ ala ahụ nile, na mpaghara nile gburu-gburu, n’etiti ndị nile nke ndị Nifaị.

16 Ma aenweghị ahaghị-n’otu n’etiti ha; Onye-nwe wụpụtara Mụọ ya n’elu iru nile nke ala ahụ ịkwado bobi nile nke ụmụ nke mmadụ, ma-ọbụ idozi obi ha nile ịnabata okwu ahụ nke a ga-akụzi n’etiti ha n’oge nke ọbịbịa ya—

17 Ka ha ghara imesi obi ha ike megide okwu ahụ, ka ha ghara ịbụ ndị na-ekweghị-ekwe, ma gaba ruo mbibi, kama ka ha nwe ike nabata okwu ahụ n’ọn̄ụ, ma dịka otu angalaba ka anyakụdo ha n’ime ezi bosisi vine ahụ, ka ha nwee ike baa n’ime cizu-ike nke Onye-nwe Chineke ha.

18 Ugbua andị nchụ-aja nile ahụ ndị gagharịrị n’etiti ndị ahụ kwusara ozi-ọma megide ikwu okwu ụgha nile, na bnrafu nile, na cntaji-anya nile, na esem-okwu nile, na echiche ọjọọ, ikwu okwu ọjọọ nile, na izu ori, ịnapụ mmadụ ihe ya n’ike, ịpụnara ihe, igbu mmadụ, ịkwa-iko, na ụdị ọchịchọ nke anụ arụ nile, na-ebe na ihe ndị a nile ekwesịghị ịdị otu ahụ—

19 Ikwulite ihe nile ndị ga-abịarịrị na nso-nso; e, ikwulite aọbịbịa nke Ọkpara Chineke, ahụhụ ya nile na ọnwụ, na kwa mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ.

20 Ma ọtụtụ n’ime ndị ahụ jụtara gbasara ebe Ọkpara nke Chineke ga-abịa; ma akụziiri ha na ọ aga-egosị onwe ya nye ha mgbe o bsịworo n’ọnwụ bilie; ma nke a ka ndị ahụ nụrụ na nnukwu ọn̄ụ na obi-ụtọ.

21 Ma ugbua mgbe ehiweworo nzukọ-nsọ ahụ n’akụkụ ala ahụ nile—ebe enwetaworo ammeri ahụ emeriri ekwensu, na okwu Chineke ahụ a na-ekwusa n’ịdị ọcha ya n’ala ahụ nile, na Onye-nwe na-awụpụta ngọzi ya nile wụkwasị ndị ahụ—otu a ka afọ nke iri na anọ nke ọchịchị nke ndị-ikpe nile siri gwụchaa nye ndị nke Nifaị.