Akwụkwọ nsọ
Alma 35


Isi 35

Ikwusaa okwu ahụ wee bibie aghughọ nke ndị Zorọm—Ha wee chụpụ ndị nile gbanwere, ndị sonyere ndị nke Amọn na Jeshọn mgbe ahụ—Alma wee nọdụ na mwute n’ihi ajọọ-omume nke ndị ahụ. Ihe dịka n’afọ 74 tutu amụọ Kraịst.

1 Ugbua o wee ruo na mgbe Amiulek kwusịworo okwu ndị a nile, ha wezugara onwe ha site n’igwe mmadụ ahụ ma bịafeta n’ime ala nke Jeshọn.

2 E, ma ụmụnne ya ndị fọdụrụ, mgbe ha kwusaworo okwu ahụ nye ndị Zorọm, bịafetakwara n’ime ala nke Jeshọn.

3 Ma o wee ruo na mgbe akụkụ nke ndị kara bụrụ ndị a ma ama na ndị nke Zorọm tụgharịkọtaworo uche gbasara okwu nile ndị ekwusaworo nye ha, iwe were ha n’ihi okwu ahụ, n’ihi na o bibiri aaghụghọ ha; ya mere ha achọghị ịn̄a ntị n’okwu nile ahụ.

4 Ma ha zipụrụ ma kpọkọta ọnụ nʼakụkụ ala ahụ nile ndị mmadụ nile, ma tụgharịkọta uche ha na ha gbasara okwu nile nke e kwuworo rịị.

5 Ugbua ndị ọchịchị ha na ndị nchụ-aja ha na ndị nkuzi ha ekweghị ka ndị ahụ mata gbasara ọchịchọ ha nile; ya mere ha chọpụtara na nzuzo uche nile nke ndị ahụ.

6 Ma o wee ruo na mgbe ha chọpụtaworo uche nile nke ndị ahụ, ndị nke kwadoro okwu nile ahụ nke Alma na ụmụnne ya kwuworo a chụpụrụ ha site n’ala ahụ; ma ha dị ọtụtụ; ma ha gafetakwara n’ime ala nke Jeshọn ahụ.

7 Ma o wee ruo na Alma na ụmụnne ya nwoke kwusaara ha ozi ọma.

8 Ugbua ndị nke ndị Zorọm were iwe megide ndị nke Amọn ndị nọ na Jeshọn, ma onye-isi ọchịchị nke ndị Zorọm, ebe ọ bụ ajọọ mmadụ, zifere ozi nye ndị nke Amọn na-achọ ha ka ha chụpụ site n’ala ha ndị nile gafetara site na ha bata n’ime ala ha.

9 Ma o kupụtara n’ume ọtụtụ mmaja nile megide ha. Ma ugbua ndị nke Amọn atụghị egwu okwu ha nile; ya mere ha achụpụghị ha, kama ha nabatara ndị ogbenye nke ndị Zorọm ndị gafetakwutere ha; ma ha azụrụ ha, ma yibe ha uwe, ma nye ha ala nile maka ihe nketa ha, ma ha lekọtara ha dịka ọchịchọ ha nile siri dị.

10 Ugbua nke a palitere ndị Zorọm n’iwe megide ndị nke Amọn, ma ha malitere imekọrịta ha na ndị Leman na ịkpalite kwa ha iwe iwe megide ha.

11 Ma otu a ndị Zorọm na ndị Leman malitere ime nkwadobe nile maka agha megide ndị nke Amọn, na kwa megide ndị nke Nifaị.

12 Ma otu a ka afọ nke iri na asaa nke ọchịchị nke ndị-ikpe nile na-achị ndị nke Nifaị siri gwụchaa.

13 Ma ndị nke Amọn pụrụ site n’ala nke Jeshọn, ma gafeta n’ime ala nke Melek, ma nye ohere n’ala nke Jeshọn maka ndị-agha nile nke ndị Nifaị, ka ha wee dọọ ndọrọ-ndọrọ ha na ndị-agha nke ndị Leman na ndị-agha nile nke ndị Zorọm; ma otu a ka agha siri malite n’etiti ndị Leman na ndị Nifaị, n’ime afọ nke iri na asatọ nke ọchịchị nke ndị ikpe; ma a ga-eme ankọwasị maka agha ha nile ma emesịa.

14 Ma Alma, na Amọn, na ụmụnne ha nwoke, na kwa ụmụ nwoke abụọ nke Alma laghachiri n’ala nke Zarahemla, mgbe ha busịwororịị ngwa-ọrụ n’aka abụọ nke Chineke n’iweta aọtụtụ ndị Zorọm na nchegharị; ma ka ha ra bụ ndị e wetara na nchegharị a chụpụrụ ha site n’ala ha; mana ha nwere ala nile maka nketa ha n’ala nke Jeshọn, ma ha ebuliwo ngwa-agha nile ichekwa onwe ha, na ndị nwunye ha, na ụmụ ha, na ala ha nile.

15 Ugbua Alma, ebe o nwere mwute maka ajọọ omume nke ndị ya, e, maka agha nile, na ịkwafu ọbara nile, na ndọrọ-ndọrọ nile nke dị n’etiti ha; ma ebe o jeworo ikwupụta okwu ahụ, ma-ọbụ ezigara ya ikwupụta okwu ahụ, n’etiti ndị nile n’obodo-ukwu nile; ma ebe ọ na-ahụ na obi nile nke ndị ahụ malitere isi ike, ma na a malitere aimejọ ha n’ihi isi-ike nke okwu ahụ, obi ya nwere mwute karịrị akarị.

16 Ya mere, o mere ka a kpọkọta ụmụ ya ndị nwoke nile ọnụ, ka ya wee nye ha onye ọbụla aozi ya, na otu na otu, gbasara ihe nile metụtara ezi-omume. Ma anyị nwere nkọwasị nke iwu ya nile, nke o nyere ha dịka akụkọ-ndekọta nke ya siri dị.