Akwụkwọ nsọ
Alma 48


Isi 48

Amalakaịa wee kpasuo ndị Leman imegide ndị Nifaị—Moronaị wee kwado ndị ya ichekwa ụzọ ndị nke Kraịst—Ọ na-enwe ọn̄ụ na ntọhapụ na inwere-onwe ma bụrụ nwoke dị ike nke Chineke. Ihe dịka n’afọ 72 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua o wee ruo na, ngwa-ngwa Amalakaịa nwetaworo ala-eze ahụ, ọ malilere ịkwalite obi ndị Leman nile megide ndị nke ndị Nifaị; e, ọ họpụtara ndịkom ka ha gwa ndị Leman okwu site n’ụlọ-elu tọwa ha nile, megide ndị Nifaị.

2 Ma otu a ọ kwalitere obi ha nile megide ndị Nifaị, nke mere na n’oge ngwụcha nke afọ nke iri na iteghete nke ọchịchị nke ndị-ikpe, ebe o mezuworo atụmatụ ya nile rute oge ahụ, e, ebe e meworo ya eze nye ndị Leman, ọ chọkwara ịchị eze n’ala ahụ nile, e, ma ndị ahụ nile nọ n’ala ahụ, ndị Nifaị na kwa ndị Leman.

3 Ya mere o mezuwọrịị atụmatụ ya, n’ihi na o mesịwo obi ndị Leman nile ike ma kpuo ha isi n’echiche, ma kpasuo ha iwe, nke mere na ọ kpọkọtawo ọtụtụ igwe mmadụ ịga n’ịlụ agha megide ndị Nifaị.

4 N’ihi na o kpebiri, n’ihi nnukwu ọnụ-ọgụgụ nke ndị ya, ịbịakwasị ndị Nifaị n’ike na iweta ha n’ime ịbụ-oru.

5 Ma otu a ọ họpụtara andị-isi ọchị-agha nke ndị Zorọm ebe ha bụ ndị matara maka ume ndị Nifaị karịchaa, na ebe mgbaba ha, na ebe nile kachasị na-adịghị-ike nke obodo-ukwu ha nile; ya mere ọ họpụtara ha ịbụ ndị-isi ọchị-agha nye ndị-agha ya nile.

6 Ma o wee ruo na ha weere ebe izu-ike ha, ma gaa n’iru chee-iru n’ala nke Zarahemla n’ọzara ahụ.

7 Ugbua o wee ruo na mgbe Amalakaịa nọworị otu a na-enweta ike site n’aghụghọ na nduhie, Moronaị n’aka nke ọzọ, nọworị ana-akwado echiche nile nke ndị ahụ ikwesị-ntụkwasị-obi nye Onye-nwe Chineke ha.

8 E, ọ nọ na-agba ndị-agha nile nke ndị Nifaị ume, na iwu ebe siri-ike nile, ma-ọbụ ebe mgbaba nile; na-atụlite mgbidi-aja ebe nile iji kpuchite ndị-agha ya nile, na kwa iwu mgbidi nile nke okwute iji gbachigide ha gburu-gburu obodo-ukwu ha nile, na oke nile nke ala ahụ; e, gburu-gburu nile nke ala ahụ.

9 Ma na ebe ewusịrị ike ha nile nke na-adịghị ike o debere ọnụ-ọgụgụ kachasị nke ndị nwoke; ma otu a o wusiri ala ahụ ike ma nye ha agbam-ume nke ndị Nifaị nwere.

10 Ma otu a ọ na-akwado aichekwa ntọhapụ ha, ala ha nile, ndị nwunye ha, na ụmụ ha, na udo ha, ma na ha ga-ebi ndụ nye Onye-nwe Chineke ha, ma na ha ga-enwe ike jide ihe ahụ nke ndị iro ha kpọrọ ụzọ nke ndị otu-Kraịst.

11 Ma Moronaị bụụrụ nwoke siri ike na dike; ọ bụụrụ nwoke nke nwere anghọta zuru oke; e, nwoke nke na-enweghị mmasị n’ịkwafu ọbara; otu nwoke nke mkpụrụ-obi ya nwere ọn̄ụ na ntọhapụ na inwere onwe nke mba ya, na ụmụnne ya site n’ịbụ-oru na ịgba oru;

12 E, nwoke nke obi ya jupụtara na ekele nye Chineke ya, n’ihi ọtụtụ ohere na ngọzi nile nke ọ wụkwasịrị ndị ya; nwoke nke rụsiri ọrụ ike karịa maka aọdịmma na nchekwa nke ndị ya.

13 E, ma ọ bụụrụ nwoke nke na-enweghị ịda mba n’okwukwe nke Kraịst, ma ọ an̄ụwo iyi ichekwa ndị ya, ihe nile ruru ya, na mba ya, na okpukpe-chi ya, ọbụna ruo n’itufu ọbara ya.

14 Ugbua ndị Nifaị ka a kụziiri ichekwa onwe ha megide ndị iro ha, ọbụna ruo n’ịkwafu ọbara ma ọbụrụ na ọ dị mkpa; e, ma a kuzikwaara ha ka ha aghara inwe oge ha ga-akpasu mmadụ iwe, e, na ka ha ghara inwe mgbe ọbụla ha ga-eweli mma-agha ma ọbụghị megide onye iro, ma ọbụghị iji chekwa ndụ ha.

15 Ma nke a bụụrụ okwukwe ha, na site n’ime otu ahụ Chineke ga-eme ka ha mee nke ọma n’ala ahụ, ma-ọbụ n’ikwu ya otu ọzọ, ọbụrụ na ha kwesịrị ntụkwasị-obi n’idebe iwu-nsọ nile nke Chineke na ọ ga-eme ka ha mee nke ọma n’ala ahụ; e, dọọ ha aka na ntị ịgbapụ, ma-ọbụ ijikere maka agha, dịka ihe egwu ha siri dị;

16 Na kwa, na Chineke ga-eme ka ha mata ebe ha ga-aga ichekwa onwe ha megide ndị iro ha, ma site n’ime otu ahụ, Onye-nwe ga-anapụta ha; ma nke a bụ okwukwe nke Moronaị, ma mkpụrụ-obi ya n̄ụrirị-ọn̄ụ n’ime ya; aọbụghị n’ịkwafu ọbara kama n’ime ihe ọma, n’ichekwa ndị ya, e, n’idebe iwu-nsọ nile nke Chineke, e, na iguzogide ajọọ-omume.

17 E, n’ezie, n’ezie a sị m unu, ọbụrụ na mmadụ nile a nọrọwo, ma nọọrọ, ma ga-anọgide, dịka Moronaị nọrọ, lee, ike ndị ahụ nile nke ala-mụọ a gaara eme ka ha ma jijiji ruo mgbe nile, e, aekwensu agaraghị enwe kwa ike n’ebe mkpụrụ-obi nile nke ụmụ nke mmadụ dị.

18 Lee, ọ bụ nwoke dị ka Amọn, nwa-nwoke nke Mosaịa, e, ma ọbụna ụmu-nwoke Mosaịa ndị nke ọzọ, e, na kwa Alma na ụmụ ya nwoke nile, n’ihi na ha nile bụ ndị nke Chineke.

19 Ugbua lee, Hilaman na ụmụnne ya nwoke anaghị ejere ndị ahụ ozi dị ntakịrị karịa ka Moronaị siri na-eje; n’ihi na ha kwusara okwu nke Chineke, ma ha mere ndị nile ọbụla n̄ara-ntị n’okwu ha nile baptism baa na nchegharị.

20 Ma otu a ha gagharịrị, ma ndị ahụ awedatara onwe ha ala n’ihi okwu ha nile, nke mere na ha natara biru-ọma dị elu n’aka Onye-nwe, ma otu a ha nweere onwe ha site n’agha nile na ndọrọ-ndọrọ nile n’etiti onwe ha, e, ọbụna ruo ohere nke afọ anọ.

21 Mana dịka m kwuworo, n’oge ikpe-azụ nke afọ nke iri na iteghete, e, na-agbanyeghị udo ha n’etiti onwe ha, a kwagidere ha n’enweghị mmasị ha ịlụso ụmụnne ha, ndị Leman ọgụ.

22 E, na mkpirisi, agha ha nile akwụsịghị mgbe ọbụla ruo ohere ọtụtụ afọ ha na ndị Leman, na-agbanyeghị nnukwu enweghị mmasị ha.

23 Ugbua, ha nwere anwute iburu ngwa-agha nile megide ndị Leman, n’ihi na ha enweghị mmasị n’ịkwafu ọbara; e, ma nke a abụghị ihe nile—ha nwere mwute ịbụ ihe e jiri ziga ọtụtụ n’ime ụmụnne ha pụọ n’ụwa nke a baa n’ime ụwa ebighi-ebi, na-ejikereghị izute Chineke ha.

24 Otu o sila dị, ha enweghị ike ikwere ịtọgbọ ndụ ha nile, ka e gbuo andị nwunye ha na ụmụ ha site n’obi-ọjọọ anụmanụ nke ndị ahụ bụtụrụla ụmụnne ha, e, ma ha bghọtahieworo site na nzukọ-nsọ ha, ma hapụworo ha ma gaworo ibibi ha site n’isonye ndị Leman.

25 E, ha enweghị ike ịnagide na ụmụnne ha ga-an̄ụrị ọn̄ụ n’elu ọbara nke ndị Nifaị, ọbụrụra na e nwere ndị kwesịrị idebe iwu-nsọ nile nke Chineke, n’ihi na nkwa nke Onye-nwe bụ, ọbụrụ na ha ga-edebe iwu-nsọ ya nile ha ga-eme nke ọma n’ala ahụ.