Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Baptism, Mee Baptism


Baptism, Mee Baptism

Site n’okwu Grik “Baptism” pụtara ịmikpu ma-ọbụ ibịanye. Baptism site na ịbianye n’ime mmiri site n’aka onye ji ikike bụ mmalite emume nsọ nke ozi-ọma. Ọ dị kwa mkpa maka ịbụ onye otu Nzukọ-nsọ nke Jisus Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a. Okwukwe na Jisus Kraịst na-ebu ya ụzọ na kwa nchegharị. Onyinye nke Mụọ Nsọ ahaghị iso ya iji zuo oke (2 Nif. 31:13–14). Baptism site na Mmiri na Mụọ dị mkpa tutu mmadụ e nwee ike ịba n’ala-eze Selestịal. Adam bụ onye mbụ e mere Baptism (Moses 6:64–65). Emekwara Jisus Baptism ka e wee mezuo ezi-omume nile na-iji zi ụzọ nye mmadụ nile (Mat. 3:13–17; 2 Nif. 31:5–12).

N’ihi na mmadụ nile n’ụwa e nweghị ohere inweta ozi-ọma mgbe ha nọ aru na-anwụ anwụ, Onye-nwe nyere ikike ime baptism nke a na-emechitere ndị nwụrụ-anwụ. Ya mere ndị na-anata ozi-ọma n’ala mụọ nwere ike itozu oke ịbata n’ime ala-eze Chineke.

Ọdị mkpa

Baptism site na-ịbịanye n’ime mmiri

Baptism maka nsachapụ mmehie nile

Ikike kwesịrị-ekwesi

Ntozu-oke nile maka baptism

Ọgbụgba-ndụ e mere site na baptism

Baptism maka ndị nwụrụ anwụ

Baptism abụghị maka ụmụ-aka a mụrụ ọhụrụ