Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Zedekaịa


Zedekaịa

N’ime Testament Ochie, eze nke ikpe-azụ nke Juda (2 Ndez. 24:17–20; 25:2–7). Zedekaịa tinyere onye-amụma Jeremaịa n’ụlọ mkpọrọ (Jer. 32:1–5), na Jeremaịa buru amụma ndọkpụ n’agha nke Zedekaịa (Jer. 34:2–8, 21). Lihaị na ezi na ụlọ ya biri na Jerusalem n’ime afọ mbụ nke ọchịchị Zedekaịa (1 Nif. 1:4). Ụmụ ndịkom nile nke Zedekaịa ewezuga otu ka e gburu; nwa ya nwoke Miulek gbapụrụ gbaga mpaghara ọdịda-anyanwụ ọkara ụwa (Jer. 52:10; Ọmnaị 1:15; Hil. 8:21).