Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Hilaman, Nwa-nwoke nke Hilaman


Hilaman, Nwa-nwoke nke Hilaman

Otu onye-amụma na onye na-edobe akụkọ ndekọta n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn onye kuziere ndị Nifaị ihe. Ọ bụụrụ nwa nwa Alma nke nta na nna Nifaị onye e nyere ike n’ebe ihe nile nọ (Hil. 5–10). Tinyere nwa ya nwoke Nifaị, Hilaman dere akwụkwọ nke Hilaman.

Akwụkwọ nke Hilaman

Isi nile nke 1–2 na-akọwa nke ọma otu oge nke oke nsogbu ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Isi nile nke 3–4 dekọtara na Hilaman na Moronaiha, onye-isi ọchị-agha nke ndị agha nile nke Nifaị nweere ike n’ikpe-azụ inweta udo n’otu oge. Otu o sila dị, na-agbanyeghị nduzi nke ndị ezi mmadụ a, ndị ahụ toro na-ibawanye na-ajọọ omume. Na isi nile nke 5–6, Nifaị nyepụrụ oche ikpe dịka nna nna ya Alma mebuuru, iji kuziere ndị mmadụ ihe. N’otu oge ndị ahụ chegharịrị. Otu o sila dị n’isi nile nke 6–12, mba ndị Nifaị biara bụrụ ndị ajọọ mmadụ. Isi nile ndị ikpe-azụ, 13–16, nwere nkọwasị kacha-ịpụ-iche nke otu onye-amụma a kpọrọ Samuel onye Leman onye buru-ụzọ kwupụta ọmụmụ na ịkpọgide n’obe nke Onye nzọpụta na ihe iriba-ama nile a ga-elekwasị anya mata ihe omume ndị ahụ nile.